Agha Izrel na Ịran: Anyị nọ n'ọsọ oge niile - Nwaafọ Naịjirịa bi n'Izrel

Etu ọnọdụ si dịrị ugbua na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel
Nkọwa foto, Etu ọnọdụ si dịrị ugbua na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa bi na mba Izrel ekwuola na ndụ ha nọ ihe ekwu dịka agha dapụtara n'etiti mba ahụ na Ịran na ngwụcha izuụka.

Kemgbe ụbọchị Fraide, Izrel na Amerịka jikọrọ aka tụọ ogbunigwe gburu onye ndụ Iran bụ Ayatollah Khamenei, Iran na Izrel jizi mgbọ na ogbunigwe eme onwe ha tụmsara.

Ọgbaghara ahụ dapụtara emetụtala njem ụgbọelu, dịka e mechiri ụfọdụ ọdọụgbọelu, ọrịrị mmanụ mmanụ agbịdị,ma butekwa ngagharịiwe n'ụfọdụ obodo dịka Naijiria na Pakistan ma tinye ịtụ uche nye ndị Afrịka biga na mba ndị o metụtara.

Nwaanyị ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na kemgbe ụbọchị atọ gara aga, ọ bụ na bọnka ka ya na di ya, ndị Naịjirịa, ndị Izrel na ndị mba ọzọ na-ehi ụra.

"Anyị bidoro ịgba ọsọ maka ogbunigwe a na-atụ n'Izrel n'ụtụtụ ụbọchị 27 Febụwarị. Anyị nwetara ozi gbatagbata kwuru ka anyị dị nkwadobe maka ihe chọrọ ime".

"Ha gwakwara anyị oge anyị ga-eji ruo na bọnka ebe nchekwa dị. Otu nkeji na ụma ka e nyere anyị iji ruo ebe ahụ. Ọ na-abụ anyị nụ ụda opi gbatagbata, onye ọbụla ewere ọsọ gbagaa na bọnka ahụ. Ị garuo ebe ahụ, ị nọrọ ala maọbụ dinara".

"Ị ga-anọzi ebe ahụ na-anụ ụda ihe na-eme. Ọ bụrụ na ha mechaa, anyị ga-anụ ụda ọzọ ga-agwa anyị ka anyị pụta, na ihe niile adịla mma. Mgbe ụfọdụ ị baa n'ụlọ ka i mee ihe ụfọdụ dịka isi nri, ụda gbatagbata ahụ ebidokwa ọzọ," ka nwaanyị ahụ gwara anyị.

O kwuru na ọnọdụ a na-enye ha nsogbu, ma na-emekwa ka ha ghara ime ihe ndị ha kwesịrị ime.

"Anyị anaghị esinwu nri, anyị anaghị erinwu nri, o nweghị ebe anyị na-aga. Ị banye n'ụgbọala bọọsụ, ụda ahụ ebido, anyị agbapụkwa," ka o kwuru.

Etu ọnọdụ si dịrị ugbua na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel

Nwaanyị ahụ kọwara na ya nọ na mpaghara Bennie Bracks dị n'Izrel, mana ka ọ dị ugbua, onye niile nọ n'ụlọ maka na a dọrọ aka na ntị sị onye agakwala ọrụ.

O mere ka anyị mara na okporoụzọ niile dị ka ebe a gbara ọsọ maka na onye niile nọ n'ime ụlọ.

Dịka o siri kwuo, ọnọdụ a na-ewute ya, maka na o nweghị onye ma ihe ọ ga-eme.

"Anyị na-ele anya iji mara ma ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya ka anyị malite ibi ndụ dịka o kwesịrị," ka nwaanyị ahụ gbakwunyere.

Gịnị ka gọọmenti Naịjirịa na-eme?

Akwụkwọ ozi Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa dị na mba Kuwait nakwa Bahrain wepụtara n'ụbọchị 1 Maachị 2026

Ebe foto si, @DOlusegun/X

Nkọwa foto, Akwụkwọ ozi Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa dị na mba Kuwait nakwa Bahrain wepụtara n'ụbọchị 1 Maachị 2026

Ụlọnnọchiteanya Naịjirịa dị na mba Kuwait nakwa Bahrain enyela ụmụafọ Naịjirịa ndị bi n'ebe ahụ ndụmọdụ ka ha gaa n'ihu mụrụ anya, rube isi na ntuziaka nchekwa niile nke gọọmenti mba ha nọ na ya ma dere duu oge niile.

Nke a dị n'otu akwụkwọ ozi Ụlọnnọchiteanya ahụ wepụtara n'ụbọchị 1 Maachị 2026, nke onye enyemaka pụrụiche nye Onyeisiala Tinubu n'ihe gbasara soshal midịa bụ Dada Olusegun kesara n'akara X ya.

Ozi ahụ gbara ndị Naịjirịa niile bi na Kuwait nakwa Bahrain ume ka ha na-ege ntị n'akụkọ ndị na-eme na mba ahụ mgbe dum.

Ụlọnnọchiteanya ahụ kwuru na ha asaala anya mmiri iji mara ihe niile na-eme, dịkwa ka ha na-akpọtụrụ ndị ndu obodo dị iche iche.

Ka o sina dị, ozi ahụ kwuru na Ụlọnnọchiteanya ahụ ekepụtala akara WhatsApp iji hụ na ha na mmadụ niile na-akparịta ụka oge dum.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị Satọde 28 February, 2026 ka ụlọọrụ mgbasaozi mba Ịran kwupụtara na onyendu kachasị n'Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei anwụọla na mwakpo mba Amerịka na Izrel wakporo Ịran.

Ọnọdụ a emeela ka e nwee nkwarịta mgbọ n'etiti mba Izrel na Ịran, dịka ụfọdụ ndị Naịjirịa bi na mba ndị ahụ na-egosi ụjọ gbasara ya.