Ndịisi agha Isreal aṅụọla iyi ịwakpo mba Iran na nzaghachị ogbunigwe ọ tụrụ ha

Ọgbakọ ndịisi agha mba Isreal

Ebe foto si, ISRAELI GOVERNMENT PRESS OFFICE (GPO) / HANDOUT

Ndị ndu mba Isreal dịka ha enweela mkpebi na ha ga-awakpo mba Iran maka ịtụ mba ha ọtụtụ ogbunigwe.

Mgbe ọ gara njem nleta n’ogige ndịagha ụgbọelu ha dị na Nevatim bụ ebe ogbunigwe Iran metụtara, onyeisi ndịagha mba Isreal bụ Herzi Halevi, gwara ndịagha ụgbọelu na ha ga-awakpo Iran na nzaghachị ọtụtụ ogbunigwe a tụrụ ha.

Ihe chere ndị kọmitii agha a aka n’ihu bụ ịchọ ụzọ ha ga-eji mee mwakpo ahụ ka ọ ghara ibutekwu ọgbaghara na mpaghara ahụ.

Cheta mba Iran tụrụ ogbunigwe na mba Isreal iji megwara n’ogbunigwe a tụrụ n’ụlọọrụ nnọchiteanya ha dị n’obodo Damascus, nke Syria bụ nke ha na-ebo ya Isreal, ma kwuo na ha achọghị ihe ga-ebute ọgbaghara ọzọ.

Ndị ndu mbaụwa kwupụtara ụjọ ha na nkwarịkọta mgbọ nwereike ịdapụta n’etiti ndị iro abụọ a ma ama kamgbe bụ nke ga-eme ka ọgbaghara malitere na Gaza na-amụbawanye.

Ndịisi mbaụwa akwadoghi ka Isreal wakpoo mba Iran

Ọgbakọ otu United Nations maka esemokwu dị n'etiti Isreal na Iran

Ebe foto si, EPA

Kọmitii na-ahụ maka agha na mba Isreal bụ nke Praịm minista ha bụ Benjamin Netanyahu kpọkobara ekpebibeghi ma Isreal ọ ga-ebuso mba Iran agha maka mwakpo a wakporo ha.

Kọmitii a kpọrọ ‘war cabinet’ nwere ọgbakọ ihe ruru awa atọ na Sọnde. Akụkọ kwuru na ọtụtụ n’ime ha kwenyere ka ebuso Iran agha mana ha nwere nkewa n’oge a ga-eme nke a nakwa etu ha ga-eji mee ya bụ mwakpo.

Ndịagha mba Isreal na-atụle usoro ha ga-eji mme mwakpo ndị a megide mba Iran.

Mana mba Amerịka ekwuola na ha achọghị ka ọgbaghara dị na mpaghara ahụ kawanye njọ ma kwuo na ha agaghị akwado mba Isreal n’ibuso Iran agha.

Ihe gbapụtara ihe n'ọgbakọ nchekwa otu United Nations

Ndịisi otu United Nations nwere ọgbakọ nchekwa bụ nke Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden haziri n'ịtanetị, maka esemokwu dị n’etiti Iran na Isreal.

Ihe ndị gbapụtara ihe ha kwuru gụnyere:

  • Onye nnọchiteanya mba Isreal n’ọgbakọ UN bụ Gilad Erdan gwara ndị otu ahụ ka “a machie mba Iran n’ụzọ ọbụla na-egbughi oge
  • Onye nnọchiteanya mba Iran bụ Amir Saeid Iravani kwuru na ogbunigwe ha tụrụ mba Isreal dị mkpa ma kwesị ekwesị.
  • O kwukwara na mba ha achọghị agha ọbụla na mpaghara Middle East maọbụ ibuso mba Amerịka agha mana ha agaghị agba nkịtị ma ọ bụrụ Amerịka tinyere Isreal aka n’ibuso ha agha.
  • Mana osote onye na-anọchiteanya mba Amerịka bụ Robert Wood kwuru na ụta ga-adịrị mba Iran ma ha lụsoo Amerịka ọgụ maọbụ gaa n’ihu ibuso mba Isreal agha.
  • Onyeisi otu United Nations bụ Antonio Guterres dọrọ aka na ntị megide ọgbaghara ịdapụta na mpaghara ahụ site na mba Isreal ibuso Iran agha ma sị na mpaghara ahụ adịla mbụ nọrọ n’ọnọdụ ọjọọ.

Gịnị mere na Damascus nke butere Iran jiri tụọ mba Isreal ogbunigwe?

Aha onyonyo, Israel-Iran: Sirens ring through Jerusalem as objects shot down from sky

Mba Iran malitere ịtụ ogbunigwe na mba Isreal na Satọde 13 Eprel 2024 ka tụrụ ụdịrị ogbunigwe a kpọrọ rọketị nakwa ‘drone’ na-atụ.

Nke a si n’ozi otu agha Iran a kpọrọ ‘Revolutionary Guard of Iran (IRGC)’ bụ ndị kwuru na “anyị atụọla ogbunigwe na mpaghara Isreal dị iche iche.”

Ha kwuru na ihe mere ha ji atụ ogbunigwe a bụ maka mmegwara ihe mba Isreal mere site n’ịwakpo ụlọ nnọchiteanya mba Iran dị n'obodo Damaskọs mba Syria n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprel.

Mwakpo ahụ butere ogbugbu ndịagha Iran gụnyere ndị ọchịagha abụọ na nakwa ụmụafọ Syria isii.

Kamgbe ahụ, mba Iran dọrọ aka na ntị ma ṅụọ iyi na ‘mba Isreal ga-anụrịrị ụtọ ihe ọjọọ a ha mere’

Ozi mba Iran kwuru na mwakpo a ha mere na mgbede Satọde bụ na nzaghachị ‘mpụ dị egwu nke mba Isreal mere nke gụnyere nke ụbọchị mbụ nke ọnwa Eprelụ.

Ogbunigwe mba Iran

Ebe foto si, EPA

Ihe Isreal kwuru maka mwakpo ahụ

Yoav Gallant, minista nchekwa na mba Isreal

Ebe foto si, Getty Images

Ndịagha Israel kwuru na ha gbochiri ọtụtụ ogbunigwe mba Iran gbara nke mere na ha agbaghị n'ebe ha tụrụ anya.

Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Izrel bụ Yoav Gallant kwuru na e nwere obere mmebi n'ihi mwakpo ahụ. Ọ kwuru na ha na-agbasa ozi ka onye ọbụla dị njikere.

Praịm minista mba Israel bụ Benjamin Netanyahụ kwuru na soshal midia na ha ga-enwe mmeri, ebe Onyeisiala bụ Isaac Herzog toro ndịagha mba ha maka mbọ ha gbara igbochi ọtụtụ ogbunigwe ahụ.

Mbuso agha a bụ nke mbụ Iran na-ebuso Isreal nke gụnyere ihe karịrị ogbunigwe na ngwa agha ruru 300.

Ihe ndịisi mbaụwa kwuru na mwakpo ahụ

Joe Biden, onyeisiala mba Amerịka

Ebe foto si, Reuters

Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden katọrọ ogbunigwe ahụ mba Iran tụrụ na mba Isreal ma kwuo na ndịagha Amerịka nyere aka gbatuo ọtụtụ n'ime ha.

O kwuru na ndịagha Amerịka dị mbụ buru ngwa ọgụ ha gaa na mpaghara ahụ tupu Iran amalite ịtụ ogbunigwe.

Joe Biden kwukwara na ọ ga-akpọkọta nzukọ ndịisi mbaụwa a kpọrọ G7 n'ụbọchị Sọnde ka ha nwee ike "leba anya ụzọ a ga-eji azaghachị Iran na mwakpo a na-erijughi afọ ha mere."

N'otu aka ahụ Praịm minista mba Briten Rishi Sunak katọkwara "mwakpo ahụ" mna kwuo na "o nwereike ịkpalite ọgbaghara na mmebi mpaghara ahụ".

Ọ gara n'ihu kwuo na mba Briten ga-akwado nchekwa Israel na nke ndị mmekọ mpaghara ha niile, gụnyere Jordan na Iraq. O kọwaara na ha na-arụ ọrụ iji mee ka eweghachị udo ma kwụsi ikwafu ọbara.

Antonio Guterres, onysisi otu United Nations

Ebe foto si, EPA

Praịm minista Canada bụ Justin Trudeau kwuru na obodo ya kagburu ajọ mwakpo ahụ. Ọ sịrị na mwakpo ahụ ga-eweta ahụhụ na mpaghara ahụ. O mere ka a mata na Canada kwụsịrị ike inye Israel nkwado.

Mịnịsta mba France na-ahụ maka mba mmekọrịta mba ndị ọzo bụ Stephane Sejourne ekwuola na France “na-akatọ mwakpo nke Iran mere megide Israel”. O kwuru na mwakpo ahụ nwereike ibute nnukwu ọgụ ndịagha.

N'aka nke ọzọ onyeisi otu United Nations bụ Antonio Guterres katọrọ mwakpo ahụ Iran wakporo Israel. Ọ rịọrọ ka onye ọbụla jide onwe ya aka ka e gbochie nnukwu ọgbaghara mwakpo a nwereike ibute.

O kwuru na dị ka ọ dị ugbua, na mpaghara ahụ achọghị ọgụ ọbụla.

Nchịkọta ihe mere na Damaskọs butere mwakpo ahụ.

Maapụ gosiri etu ihe si mee na Damascus

Iran doro aka na ntị na ọ ga-ebuso mba Israel agha iji megwara n'ogbunigwe Israel tụrụ n'ụlọọrụ nnọchitanya mba ha dị Damaskọs isiobodo Syria na mbido ọnwa a.

Lee etu mwakpo ahụ siri malite:

  • Ndị ọrụ nchekwa Syria kwuru na ha hụrụ ụgbọelu ogbunigwe Israel ka ọ na efegharị n'ogige ndị ụlọọrụ nnọchiteanya Iran, nke dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Mezzeh nke Damaskọs.
  • Ndịagha ụgbọelu mba Syria gbaturu ụfọdụ ogbunigwe ha tụrụ, mana ndị ụfọdụ mebiri ụlọ ndị mmadụ wee gbuo ma merụọ ọtụtụ ahụ.
  • Ogbunigwe ahụ gburu mmadụ asaa n'ime ndị ọrụ nchekwa Islamic Revolution Guard Corps (IRGC), gụnyere ndị ọchịagha Mohammad Reza Zahedi na Mohammad Hadi Haji-Rahimi.
  • Israel ekweteghị ma ọ bụ gọnarị na ha tụrụ ogbunigwe ahụ.
  • Mana Israel kwuru na ọ bụ eziokwu na ha tụrụ ọtụtụ ogbunigwe na mpaghara ahụ n'oge gara aga, mgbe ndịagha Syria na ndịagha Iran na-enwe mmekọ.
  • A na-akọ na akụrụngwa ọgụ Israel abawanyela kemgbe agha ahụ malitere na Gaza n'ọnwa Ọktoba afọ 2023, na nzaghachi nye mwakpo ndị Hezbollah n'okeala ugwu Israel.
  • Minista na-ahụ maka mmekọrịta Syria na mba ndị ọzọ bụ Faisal Mekdad kwuru na ọ katọrọ mwakpo gburu ọtụtụ ndị aka ha dị ọcha”