Gịnị bụ ‘Dome’ a na-echekwa ihu eluigwe mba Isreal megide ogbunigwe?

Ebe foto si, Getty Images
Igwe na-echekwa ihu eluigwe mba Isreal a kpọrọ ‘dome’ nyeere mba a aka n’igbochi ọtụtụ ogbunigwe otu Hamas tụrụ ha site na Gaza na mbido ọgụ ha na ndị agha nnupuisi mba Palestine n’ọnwa Ọktoba.
Mana ogbochughi ụfọdụ ogbunigwe ndị a bụ ndị dara n’ụfọdụ ebe ndị mepere emepe.
Gịnị bụ Dome na etu o si arụ ọrụ?
Iron Dome bụ igwe nchekwa ihu eluigwe nke e mere iji gbochie ogbunigwe ndị si ebe dị nso na-abịa, ọ na-arụ ọrụ na-agbanyeghi ọnọdụ ihu eluigwe ọbụla.
Ọ na-eji akụrụngwa radar enyochapụta ogbunigwe rọketị, o nwereike ịchọpụta ndị nwereike ịda n’ebe ndị mepere emepe na ndị nwereike ịda n’ebe ndị mmadụ anọghị.
E kwuru na igwe a nwere batịrị iri nọ n’ebe dị iche iche na mba Isreal, otu n’ime ha nwere ihe a kpọrọ ‘launchers’ atọ maọbụ anọ. Otu n’ime ‘launcher’ ndị a nwere ogbunigwe anọ.

A na-agbapụ ogbunigwe ọnụ abụọ nke ga-egbochu ihe ọbụla dịka ogbunigwe na-achọ ịbata na mba a.
Ụlọọrụ a kpọro Centre for Strategic and International Studies tụrụ arọ na otu batịrị ogbunigwe ndị a na-efu ọnụego $100m (£82m) iji rụpụta.
Mana a sị na o zuru ọnụego ahụ maka na ọ na-agbapụ naanị mgbe ọ hụtara ogbunigwe chọrọ ịda na mba ahụ.
Onye rụrụ ‘Iron Dome’ na mgbe ọ malitere ịrụ ọrụ?
A rụrụ Iron Dome n’afọ 2006 mgbe mba Isreal na otu Hezbollah nọ na Lebanon nke mba Iran na-akwado nwere nsogbu.
Hezbollah tụbatara ọtụtụ ogbunigwe n’ime mba Isreal bụ nke gburu ọtụtụ mmadụ ma mabie ọtụtụ ihe.
Ka otu afọ gachara, mba Isreal kwupụtara na ụlọọrụ nchekwa ha bụ Rafael Advanced Defense Systems ga-arụpụta igwe nchekwa ọhụrụ. Mba Amerịka nyere ego dị $200m (£164m) na nrụpụta igwe ahụ.
E ji igwe lụọ ọgụ mbụ n’afọ 2011, mgbe ọ kụsara ogbunigwe a tụrụ na mpaghara Ndịda obodo Beersheba site na Gaza Strip, bụ nke ndị otu Hamas kpachiri kamgbe afọ 2007.
N’afọ 2019, mba Amerịka kwuru na ha ga-azụ ma nwalee Iron Dome iji wulite igwe nchekwa ha a kpọrọ ‘Patriot’.
Patriot na-ejikwa usoro ahụ arụ ọrụ kama ọ na-eji ya egbochi ogbunigwe si n’ụgbọelu agha, ogbunigwe na-efesi ike nakwa ogbunigwe ballistic na-abụghị naanị nke si n’ebe dị nso.
Iron Dome ọ na-arụ ọrụ etu ọfụma?
N’afọ 2012, Isreal kwuru na Iron Dome gbochiri pasenti 84 nke rọketị ndị Hamas tụrụ nke si na Gaza, na ọ zara oku ugboro 573 ma gbatuo ogbunigwe ugboro 421.
Mana n’afọ 2013, onye ọkachamara n’okwu nchekwa na Massachusetts Institute of Technology bụ Ọkammụta Theodore Postol kwuru n’eziokwu na Iron Dome nwereike ọ bụrụ naanị pasentị 10 ka o gbochurula, ikekwa na o nweghi ihe nke ọ kuturula.

Ebe foto si, Getty
N’afọ 2021, ndịagha mba Isreal kwuru na Iron Dome mere ọfụma n’ogogo 90 pasenti igbochi ogbunigwe 3000 nke otu Hamas tụrụ ha site na Gaza Strip.
Na mbido agha na-ada n’etiti ha ugbua, Hamas kwuru na ha tụrụ ogbunigwe ruru 5,000, na-agbanyeghi na mba Isreal kwuru na o nwereike ọ bụrụ naanị ọkara ọnụọgụgụ ahụ ka ha tụrụ.
Ndịagha mba Isreal kwuru na ha gbochiri ogbunigwe 153 n’ime ndị a Hamas tụrụ ebe ndị ọzọ dara n’ebe ndị mmadụ anọghị nakwa n’ime Gaza Strip n’onwe ya.
Mana enweela ọtụtụ mmerụ ahụ nakwa ọnwụ ndị mmadụ site n’ogbunigwe a tụrụ na ndịda Isreal nakwa Tel Aviv dịka ụlọ ntaakụkọ Isreal si kwuo.
Akụkọ ndị ọzọ banyere Isreal
Follow live: Latest updates
History behind the story: The Israel-Palestinian conflict
From Israel: Community frozen as Hamas atrocities emerge
From Gaza: BBC reporter flees Israel bomb warning






