Ndị Ekwulobia jupụtara n'oke ọṅụ oge onyeisi ụlọọrụ Jezco Oil bụ Chief Joseph Ezeokafor lọtara n’ụlọ ya

Aha onyonyo, Oke ọṅụ jupụtara oge onyeisi ụlọọrụ Jezco Oil lọtara n’ụlọ ya n'Ekwulobia
Ndị Ekwulobia jupụtara n'oke ọṅụ oge onyeisi ụlọọrụ Jezco Oil bụ Chief Joseph Ezeokafor lọtara n'ụlọ ya
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onye oji ego achụnta ego na Naịjirịa a ma ama bụ Chief Joseph Ezeokafor ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Jezco Group na-emepụta mmanụ ụgbọala na Naịjirịa esila n'aka ndị ojiegbe tọọrọ ya wee lọta n'ụlọ ya dị n'Ekwulobịa, n'Anambra steeti.

N'ihe onyonyo anyị hụrụ na-efegharị n'ịntanetị ka ọtụtụ ndị obodo, ndị enyi, ndị ụka katọliki na ndị hụrụ ya n'anya gbakọrọ n'ụlọ ya iji mee emume nnabata na ịsị ya nnọọ.

N'oge a na-eme ofufu n'ụlọ ya iji nye Chineke ekele maka ntọhapụ na nlọgahchite ya n'udo, ka Bishọp nke ụka katọliki nke Ekwulọbịa daịọsis bụ Cardinal Peter Ebere Okpaleke na ụkọchukwu na-ahụ maka St Joseph cathedral Ekwulobia kelere Chineke n'isi Chief Ezeokafor.

Ọtụtụ ndị mmadụ nyekwara Chineke ekele ebe Chief Ezeokafor jiri ohere ahụ kelee Chineke maka ịkpọghachite ya n'ụlọ n'udo dịka o kwukwara na njem ahụ adịghị mfe, mana Chineke ka otuto niile dịrị.

Ọ kọwara ndị mmadụ ihe o jiri anya ya ahụ n'aka ndị ojiegbe ahụ ma kwuo na ọ bụ ndị uweojii bịara ebe ndị ojiegbe ahụ dobere ya wee kpọlata ya.

Cheta na ọ bụ n'ụbọchị n'ụtụtụ Satọde abalị iri na ise nke ọnwa Ọgọst, 2026 ka ndị uweojii Naịjirịa kwuru a tọhapụrụ Chief Ezeokafor bụ onye ndị ojiegbe tọọrọ na Tuzde abalị anọ nke ọnwa Ọgọst 2026.

Ndị ojiegbe atọhapụla Chief Joseph Ezeokafor

Foto Chief Ezeokafor

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor atọhapụla ya na otu onye nwaanyị ụkọchukwu ahụ a tọọrọ ya na ya n'ụbọchị Tuzde 4 Ọgọst 2026.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na a tọhapụrụ Chief Ezeokafor n'ụtụtụ Satọde 15 Ọgọst, 2026 ma kwuo na ndị uweojii na-eme nnyocha iji chọpụta usoro e ji tọhapụ Chief Ezeokafor nakwa ozi ndị ọzọ dị mkpa banyere ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ya.

Ikenga kwuru na kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Nnanna Oji nyere iwu ma kwuo na ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha, ndị ọrụ Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC), Agunechemba nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-eme nnyocha iji chọpụta ma nwụchie ndị ojiegbe ahụ tọọrọ Chief Ezeokafor.

Nna m enweghị ụdịrị ego ndị mmadụ na-eche na o nwere - Blessing Ezeokafor

Foto Blessing Ezeokafor na nna ya bụ Chief Joseph Ezeokafor

Ebe foto si, Blessing Ezeokafor/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Nwa nwaanyị Chief Joseph Ezeokafor apụtala gbaa ama na nna ya enweghị ụdịrị ego ahụ ndị mmadụ na-eche na o nwere.

Blessing Ezeokafor gwara BBC Igbo na kemgbe ndị ojiegbe tọọrọ nna ya n'ụbọchị Tuzde 4 Ọgọst, 2026, ezinaụlọ ha nọ n'oke ihe mgbu ma kwuo na ọtụtụ mmadụ na-eche na nna ya nwere nnukwu ego amaghị nke bụ eziokwu.

"Nke bụ eziokwu bụ na nna m na ezinaụlọ anyị enweghị ụdịrị nnukwu ego ndị mmadụ na-eche na anyị nwere, ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara nke a." ka Blessing Ezokafor gwara BBC Igbo.

Okwu Blessing na-abịa dịka akụkọ malitere ifesa na ndị ojiegbe tọọrọ nna ya bụ Chief Joseph Ezeokafor gwara ezinanụlọ ha ka ha kwụọ otu ijeri naịra na nde narị ise (1.5bn) tupu ha atọhapụ ya.

Blessing kwara arịrị kwuo na ezinaụlọ ha enewghị ego ahụ.

"Nna m bụ onye ji ego achụ ego nwere obi umeala. Nna m abụghị onye mpako, ọ bụ onye na-ebi ndụ obi umeala mana ụdịrị ndụ nakwa ngosi nwanne m nwoke Joseph Ezeokafor Jr a maara dịka Jowizaza na-ebi ma na-egosi na soshal midia, emeela ka ọtụtụ mmadụ malite ịhụta nna m nakwa ezinaụlọ anyị dịka ndị nwere ijeri kwuru ijeri ego n'ọbaego, mana nke bụ eziokwu bụ na anyị enweghị ụdịrị ego a ndị mmadụ na-eche na anyị nwere."

"Achọrọ m iji ohere a mee ka ọhanaeze mara na ezinaụlọ Ezeokafor enweghị nde narị naịra asaa (N700m) ka ọ fọdụzie otu ijeri naịra na nde narị ise (1.5bn) a ndị ojiegbe gwara anyị ka anyị kwụọ," ka Blessing kwuru.

Ọ gwara anyị na ndị ntọrị ahụ bu ụzọ gwa ezinaụlọ ha ka ha kwụọ nde narị naịra asaa (N700m) mana ha mechara bulie ego ahụ.

"Oge ndị ojiegbe ahụ tọọrọ nna m kpọrọ ezinaụlọ m, ha gwara anyị ka anyị kwụọ nde narị naịra asaa (N700m) nwanne m nwoke (Jowizaza) kwetara, mana ndị ojiegbe ahụ mechara bulie ya ka ọ bụrụ otu ijeri naịra na nde narị ise (1.5bn), mana anyị enweghị ego ahụ."

Blessing kwuru na, "Ọtụtụ mmadụ na-eche na nna m nwere ijeri kwuru ijeri naịra n'ọbaego ụlọakụ ya, amaghị na nna m dịka onye ji ego achụ ego, bụ ụlọakụ ka o bitere ego o ji azụ ahịa, ezinaụlọ anyị enweghị ego a ndị ojiegbe na-ekwu ka anyị kwụọ ha."

Blessing gara n'ihu rịọ ndị ojiegbe ahụ tọọrọ nna ya ka ha mere ya ebere ma tọhapụ ya ma kwuo na nna ya bụ Chief Ezeokafor nwere ọrịa ọbara mgbali elu bekee kpọrọ High Blood pressure.

"Nna m na-arịa ọrịa High BP. Ana m arịọ ndị ojiegbe tọọrọ nna m ka ha biko meere ya ebere ma tọhapụ ya."

Ihe anyị ma maka ntọrị ndị ojiegbe tọọrọ Sir Joseph Ezeokafor

Foto SirJoseph Ezeokafor

Ebe foto si, jennyoxx23/Instagram

Kemgbe akụkọ banyere ntọrị a sị na ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor pụtara ihe, ọtụtụ mmadụ amalitela ịjụ ajụjụ banyere etu njiji a si mee.

Chief Joseph Ezeokafor bụ onyeisi ụlọọrụ Jezco Group bụ ụlọọrụ na-emepụta mmanụ ụgbọala dị iche iche.

Otu onye ya na ezinaụlọ Ezeokafor na-enwe ezi mmekọ na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor n'ụbọchị Tuzde 4 Ọgọst, 2026.

"Ndị ojiegbe bịara n'ogige ekpere dị n'Ifite Awka dị n'Anambra steeti ma tọrọ ya dịka ọ gara ebe ahụ iji sonye n'ekpere pụrụiche a na-eme oge ọ kụrụ elekere abụọ nke n'ụtụtụ Tuzde 4 Ọgọst, 2026," ka ọ gwara anyị.

"Kemgbe ndị ojiegbe ahụ tọọrọ ya, ha akpọbeghị ndị ezinaụlọ Ezeokafor maọbụ onye ọbụla banyere ọnọdụ nna ha maọbụ kwuo ihe ha chọrọ".

Ọ gara n'ihu kwuo na ịhụnanya Chief Ezeokafor nwere n'ebe Chineke nọ mere o ji nyere aka rụọ ọtụtụ ọrụ gụnyere okporoụzọ, ụlọ nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n'ogige ekpere ahụ.

Banyere akụkọ n'efegharị na ọ bụ oge Chief Ezeokafor gara ịhụ nwaanyị ka ndị ojiegbe tọọrọ, nwaamadị ahụ kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị abụghị eziokwu.

"Chief Ezeokafor bụ onye nwere obi umeala dịka onye ụka Katọlik ma kwenye na o kwesghị ịkpọrọ ndị ọrụ nchekwa ya na-aga n'ogige ekpere ahụ, ọ bụ nke mere ndị ojiegbe ahụ ji nwee ohere ịtọrọ ya", ka o kwuru.

Ka ọ dị ugbua, ụbọchị Tuzde 11 Ọgọst, 2026 emeela ya otu izuụka ndị ojiegbe tọọrọ Chief Joseph Ezeokafor.

Onye bụ Chief Joseph Ezeokafor?

Foto Chief Ezokafor yi uwe ọcha ma nọrọ n'ihu ụgbọala ya

Ebe foto si, jennyoxx23/Instagram

  • A mụrụ Chief Sir Joseph Ezeokafor n'ụbọchị Wenezde 30 Eprel, 1952 n'obodo Ekwulobia dị n'okpuruọchịchị Aguata, Anambra steeti.
  • Ọ bụ onye ji ego achụ ego a ma ama n'Anambra steeti nakwa na Naịjirịa gbaa gburugburu.
  • Chief Ezeokafor hiwere ụlọọrụ Jezco Oil n'afọ 1980.
  • N'afọ 1988, ụlọọrụ ahụ bụụrụ nke na-emepụta ma na-ere mmanụ ụgbọala dị iche iche na Naịjirịa.
  • Ọ gara n'ihu hiwekwa ụlọọrụ na-emepụta rọba na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
  • Ọ lụrụ Ada Ezeokafor onye mụtara ya ụmụaka asaa, ụmụnwoke abụọ na ụmụnwaanyị ise nke gụnyere Joseph Ezeokafor Jr. onye a maara dịka Jowizaza.
  • Ọ bụ onye na-enyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka n'obodo ma na-arụkwa ọtụtụ ọrụ dị iche iche gụnyere ịgbapu mmiri, inye agụmakwụkwọ n'efu, nleta ahụike nakwa ihe ndị ọzọ n'obodo ya nakwa n'Anambra steeti.
  • E chiri ya echichi 'Nwachinaemelu Ekwuluobia' n'ihi ezi ọrụ ọ na-arụ n'obodo ya nakwa ọtụtụ ndị ọ na-enyere aka
Foto Chief Ezeokafor, nwunye ya, nwa ya nwoke Jowizaza nakwa nwa ya nwaanyị Ifeoma Charity Ezeokafor n'otu mmemme ha gara

Ebe foto si, jennyoxx23/Instagram