Enweghị uru ọbụla APGA baara Anambra Steeti kamgbe ha banyere ọchịchị - Nicholas Ukachukwu
Nicholas Chukwujekwu Ukachukwu ji aha All Progressives Congress azọ ọkwa Gọvanọ Aambra Steeti na ntuliaka a ga-eme na Nọvemba 8, 2025, ekwuola na oge eruola mgbe pati ọzọ ga-enwere ọkwa ọchịchị n'Anambra steeti maka na enweghị uru ọbụla pati All Progressives Grand Alliance (APGA) baara steeti ahụ.
Ukachukwu kwuru nke a na mkparịtaụka ya BBC Igbo nwere, dịka ụbọchị ntuliaka a na-abịa nso.
N'okwu ya 'Akụkọ na-ekwu na APGA bụ nke ndị Anambra abụghị eziokwu maka na APGA enwghị uru ọ baara ndị Anambra kemgbe ha batara n'ọchịchị n'afọ 2006".
"Ọchịchị Soludo enweghị uru ndị Anambra na-erite na ya, ọ bụ nke mere m ji azọ ọkwa iji weta ezi ọchịchị, ezi mmepe, nchekwa nakwa ọganihu ndị Anambra niile", ka o kwuru
Banyere ajọ ọnọdụ nchekwa na ndị omekome na-akpa mkpamkpa na steeti ahụ, Ukachukwu kwuru na ọ ga-achụ ndị omekome a ọsọ ụkwụ eruala ma ọ bụrụ na o nweta mmeri na ntuliaka.
Ukachukwu kwuru na okwu gbasara ndị ntọrị, ndị ojiegbe ezu ga-abụ okwu gara aga n'Anambra Steeti.


Ebe foto si, Nicholas Ukachukwu/Facebook




