Ndị Gọvanọ chọọ ịchụ ndị omekome ọsọ, ha ma ihe ha kwesịrị ime - Sullivan Chime

Aha onyonyo, Ndị Gọvanọ chọọ ịchụ ndị omekome ọsọ, ha ma ihe ha kwesịrị ime - Sullivan Chime
    • Onye dere ya, Michael Ngene, Ebere Ekeopara, Gift Ufuoma na Donald Wogu
    • Ebeg o si, BBC Lagos
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ime afọ ole na ole gara aga, ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa kụrụ afọ n'ala.

Kwa izuụka ọbụla, a na-anụ akụkọ ogbugbu, ntọrị, mwakpo na ọtụtụ mpụ ndị ọzọ dị iche iche mere na mpaghara ahụ.

N'agbenyeghị ọtụtụ mbọ ndị nọ n'ọchịchị na-agba iji weta ezi nchekwa na mpaghara ahụ, ọ dịka mbọ ha anaghị amịta mkpụrụ ọbụla.

Sullivan Chime bụbu Gọvanọ Enugwu steeti kọwara usoro dị iche iche e nwereike isi chụọ ajọ ọnọdụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na steeti niile dị n'ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.
Nkọwa foto, Sullivan Chime bụbu Gọvanọ Enugwu steeti kọwara usoro dị iche iche e nwereike isi chụọ ajọ ọnọdụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na steeti niile dị n'ọnwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Na mkparịtaụka Sullivan Chime bụbu Gọvanọ Enugwu steeti na BBC News Igbo nwere, ọ kọwara usoro dị iche iche e nwereike isi chụọ ajọ ọnọdụ nchekwa ọsọ ụkwụ eru ala na steeti niile dị n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

O nyekwara ndị Gọvanọ ise dị n'ọwụwa anyanwụ ndụmọdụ ma kwuo ihe bụ uche ya banyere oku ụfọdụ na-akpọ maka ntọhapụ Nnamdi Kanu nakwa oku a na-akpọ ka a kpọlata Simon Ekpa a nwụchiri na mba Finland ma kpee ya ikpe na Naịjirịa.