Ihe ọhụrụ na-eme na mba Finland gbasara Simon Ekpa

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa /x

Nkọwa foto, Simon Ekpa
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Kemgbe akụkọ pụtara maka nnwuchi a nwuchiri Simon Ekpa na mmadụ anọ ndị ọzọ na mba Fịnland, akụkọ ọhụrụ dị icheiche na-apụta ọzọ.

Akụkọ dị ugbua bụ gbasara otu ndọrọndọrọ ọchịchị Simon Ekpa na mba Finland nakwa ‘ụlọọrụ ya’ dịka onye a sị na ọ bụ ‘ọkaiwu’ nakwa ihe ndị ọzọ.

Ndi otu ndọrọndọrọ ọchịchị Simon Ekpa na Finland bụ National Coalition Party (NCP) kwuru na Ekpa enweghi ọkwa ọ na-azọ na ntuliaka mba ahụ a ga-eme n’afọ 2025.

Cheta na ndị uweojii na Fịnland nwuchiri Ekpa n’izuụka gara aga maka ebubo iyi ọha egwu.

Ekpa kpọrọ onwe ya Praịm Mịnịsta Biafra Republic Gorvernment in Exile (BRGIE) bụ otu si na Indigenous People of Biafra (IPOB) kewapu onwe ha.

Na agbanyeghi na Ekpa gọrọ sị na aka ya dị ọcha n’ebubo iyi ọha egwu, ụlọikpe dị na Fịnland zigara ya na mmadụ anọ ndị ọzọ ụlọnga.

Ugbua Ekpa bụ onye na-anochita anya otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ NCP na Public Transport Board dị na Lahti bụ ebe o bi.

Mana Timo Elo bụ odeakwụkwọ NCP gwara ndị ntaakụkọ na mba ahụ sị na Ekpa esoghi azọ ọkwa na mba ahụ.

Elo ekweghi ekwu okwu maka Simon Ekpa, mana ọ sị na “onye a na-enyo enyo na ọ mere mpụ, ọ pụtaghị na a ga-achụpụ ya na otu ndọrọndọrọ ọchịchị”.

Onyeisi n’otu NCP bụ Pirjo Mäljä kwuru na ya agaghị etinye ọnụ n’okwu ahụ ruo mgbe ụlọikpe na ndị uweojii mechara nnyocha gbasara ya.

Lee ka Nnamdi Kanu si mee Simon Ekpa onye a maamaa

Nnamdi Kanu na ndị ọzọ
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị niile na-eso ka Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenouse People Of Biafra (IPOB) ndị gọọmenti Naijirịa machiri si azọ maka nnwereonwe Biafra ga-ama na Simon Ekpa so na ndị nọ na Soshal midịa na-ekwu maka nnwereonwe Biafra. Mana ihe ndị a niile gbanwere n’abali Julaị 8, 2021.

Ọ bụ ụbọchị ndị Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Alloy Ejimakor na Ifeanyi Ejiofor mere ka a mata na Simon Ekpa ga-ebido na agbasa ozi n’igwe redio Biafra ruo oge Nnamdi Kanu ga-apụta n’aka ndị Department of Security Service (DSS) bụ ndị jidere ya.

Igwe redio Biafra bụ ebe mgbasaozi Biafra nke Nnamdi Kanu ji ezi ozi ikewapụta ndị ọwụwa anyawu Nịajirịa ka ha bụrụ Biafra.

Nhọpụta ahụ mere Simon Ekpa jiri nwee ndị na-eso ya, nke mere ọtụtụ na ndị na-eso nnamdị Kanu jiri gbanwee ma na-eso Simon Ekpa dịka onye ndu ha.

Nke a mere IPOB jiri tịwaa maka na Ekpa anaghị ege ntị maọbụ nụ ndụmọdụ onye ọzọ n’otu ahụ; nke a mere IPOB jiri kwapụ ya. Ekpa guzobere otu nke ya n’ọnwa August 2022 ma kpọo otu ya “Biafra Republic Government In Exile (BRGIE).

Dịka ihe Ekpa dere na soshal midịa, ọ bụ BRGIE na-akwado ndịagha ha nke ọ kpọrọ Biafra Liberation Army.

Ndị IPOB nwere ndịagha nke ha bụ nke Nnamdi Kanu kpọrọ Eastern Security Network (ESN).

Mana kemgbe ndị IPOB na Ekpa kewara, IPOB gwara Ekpa ka ọ ghara iji aha na foto Nnamdị Kanu mee ihe ọbụla na soshal midịa mana Ekpa ekweghị.

Ekpa sitere n’ime egwuruegwu bụrụzie onye na-azọ nnwereonwe

Simon Ekpa bụ onye na-eme egwuruegwu na-anọchite anya Naịjirịa na mbaụwa.

Ekpa nọchitere anya Naịjirịa na ‘2003 Africa U20 Championships’ gbaa ọsọ 100m, ma wụọ jọọmpụ dị icheiche bụ nke o jiri nweta ọlaọcha.

Ọ bụ egwuruegwu kpọgara Simon Ekpa n’obodo onyibo. Ọ mechara nwee njirimara mba Finland ma nọchịta mba Finland n’egwuregwu n’afọ 2009.

Mana nsogbu o nwere n’ikpere ụkwụ ya mere o ji kwụsị ime egwuruegwu.

Ọ gara biri na Lahti bụ ebe o nwetara Marianne Säkäjärvi. Ha mụrụ otu nwa nwoke tupu ha abụọ ekewaa.

N’afọ 2012 ka Simon Ekpa bidoro ịbanye na ndọrọndọrọ ọchịchị dịka o sị gwa ndị mmadụ n’ọnwa Maachị afọ a.

Ka Ekpa si kwalite ọgbaaghara

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa / x

Ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa na-ebo Simon Ekpa ebubo na ọ na-agbasa ozi na-akwalịte ọgbaaghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

N’ọnwa Juun afọ a ka onyeisi ndị ọrụ nchekwa bụ Christopher Musa boro ndị mba Fịnland ebubo na ha na-enye Simon Ekpa nkwado o ji eme ihe ọ na-eme.

“Ọ bụ ihe niile Simon Ekpa na-ekwu na soshal midịa mere e ji egbu ndị mmadụ."

Nnyocha BBC mere n’afọ 2022 gosiri ka ndị ojiegbe siri gbagbuo otu onye ndu ụmụ ntorobịa bụ Ogoegbunam Ifeanyi n’Ogidi dị n’Anambra steeti ka Simon Ekpa yichara ya egwu na soshal midịa.

Simon Ekpa na onye e gburu egbu

Ebe foto si, screen grab

Ekpa dọrọ Ifeanyị aka na ntị maka ime ngagharịiwe megide iwu onye apụtakwala ezi bụ “Sit-at-Home”. E gburu Ogoegbunam Ifeanyi n’izuụka ole ma ole ka Ekpa dọchara ya aka na ntị ahụ.

Mgbe ọbụla ndị omekome ọ kpọrọ ‘Biafra Liberation Army’ gburu ndị ọrụ nchekwa n'ọwụwa anyawụ, Ekpa na-eji soshal midịa ya na-enwe aṅụrị.

“Anyị ga na-egbu ha ruo n’ụbọchị ikpeazụ anyị ga-anọ na Naịjirịa”.

Ekpa dịka onye na-eṅomi ndị ọkaiwu

Simon Ekpa

Ebe foto si, Screengrab from Ekpa and Co Oy website

Nkọwa foto, Simon Ekpa

Na mba Fịnland ihe ndị ọzọ Ekpa na-eme bụ inye ndị batara mba ahụ ọhụrụ ndụmọdụ gbasara iwu obodo ahụ nakwa ka e si anọ n’obodo ahụ dịka onye na-agba ọsọ ndụ.

Ekpa guzobere ụlọọrụ ọkaiwu ọ kpọrọ Ekpa & Co Oy n’afọ 2015. Dịka ndekọ dị n’akara Linkedin ụlọọrụ ahụ, ihe ọ na-eme gụnyere ikpe gbasara ekperima, ikpe ezinaụlọ na ụmụaka, ikike dịịrị mmadụ na ihe ndị ọzọ.

Mana ndị niile na-abịa na nke ya amaghị na o nweghị ikike dịka ọkaiwu ịnọchịte anya mmadụ n’ụlọikpe.

Mana ọ bụ nwaanyị ahụ bụbu nwunye ya bụ Marianne Säkäjärvi na-ahụ maka ikpe niile ha wegaara Ekpa dịka nnyocha ndị ụlọọrụ mgbasaozi mere n’ime Fịnland.

Rahman bụ otu onye na ndị gara hụ Ekpa kwuru na ya amaghị na Ekpa abụghị onye Ọkaiwu.

O kwuru na mgbe ya gara hụ Ekpa naanị ihe ọ gwara ya bụ na ya “ga-enye aka hazie ihe niile”.

Akụkọ ahụ na-ekwu na Ekpa gosirị ndị ntaakụkọ ahụ asambodo gosiri na ọ gụrụ akwụkwọ Ọkaiwu na mahadum Aberystwyth n'ọnwa Disemba 2015 mana asambodo ahụ enyeghị ikike ịnọchịte anya mmadụ n’ụlọikpe.

“Ana m agwa ndị mmadụ na m bụ onye ndụmọdụ onye Ọkaiwu mana mgbe ụfọdụ, ha na-enwe nghọtahie maka ya”.