Ihe ọkaiwu Nnamdi Kanu kwuru maka akụkọ sị na o sila n'ụlọ nga DSS rie mbọmbọ ọsọ

Aloy Ejimakor na Nnamdi Kanu ka ha nọ n'ụlọikpe

Ebe foto si, Aloy Ejimakor

Aloy Ejimakor bụ onye ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na akụkọ ahụ na-efegharị nke kwuru na Kanu esila n’ụlọmkpọrọ ndi DSS gbaa ọsọ bụ asị ọcha.

Ejimakor kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ya banyere akụkọ ahụ na-efegharị, mana kwuru na akụkọ dịka ọ bụ asị bụ ihe ihe ndị mmadụ chọrọ iji bịnyụọ oku a na-akpọ sị ka a tọhapụ ya.

O kwuru na Kanu bụ onye aka ya kwụụ ọtọ na-achọ nwereonwe mmadụ na-atụghị egwu ọbụla.

“Kanu ekpebiela ịkwụrụ ọtọ ka dimkpa ma lụọ ọgụ megide mkpagbu nke ọ si n’aka gọọmentị.

“Ọ karịala itinye uche isi n’ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ ọkachasị dịka ebubo mpụ niile e boro ya achịtaghị aja.”

Nke a na-abịa dịka akụkọ a na-amaghi ebe o si bidoro na-efesasị na soshal midia na Nnamdi Kanu esila n’ụlọmkpọrọ gbaa ọsọ.

Akụkọ na-efegharị akọwaghị mgbe na etu Kanu si gbaa ya bụ ọsọ.

Cheta na Kanu nọ n’ụlọmkpọro ndị DSS kamgba afọ 2021 mgbe gọọmentị Naịjirịa nwuchiri ya ma kpọlata ya na Naịjirịa.

Ha kpụpụrụ ya n’ụlọikpe maka ebubo ime mpụ megide ọchịchị Naịjirịa bụ ebe ikpe ya ka na-aga n’ihu rute ugbua.

Ọtụtụ ndị nakwa otu a ma ama gụnyere Ohanaeze Ndigbo, Pan Niger Delta Forum (PANDEF) akpọọla oku ka Onyeisiala Tinubu were ụzọ mkparịtaụka udo tọhapụ Kanu.

Akụkọ ndị ọzọ banyere Nnamdi Kanu