Were ikike gị kwụsị ikpe ọbụla a na-ekpe Nnamdi Kanu - Ihe ọkaiwu Kanu gwara AGF

Aha onyonyo, Were ikike gị kwụsị ikpe ọbụla a na-ekpe Nnmadi Kanu - Ihe ọkaiwu Kanu gwara AGF

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu, onyendu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) agwaala ọkaiwu ukwu nke gọọmentị etiti bụ Lateef O. Fagbemi ka o weere ikike ya kwụsị ikpe ọbụla a na-ekpe Kanu.

Ọkaiwu Kanu bụ Nnaemeka Ejiofor kpọrọ oku a n’Abuja mgbe ha degaara ọkaiwu ukwu gọọmentị akwụkwọ iji kọwaara ya ọtụtụ ikpe e kpebirila n’isi Nnamdi Kanu nakwa gọọmentị etiti.

Ọ gara n’ihu kwuo na ụlọikpe ukwu dị n’Enugwu ekwuola na Ipob abụghị otu na-eyi ndụ egwu na nwụchi a nwụchiri Nnamdi Kanu megidere iwu.

O kwukwara na ụlọikpe kachasị na Naịjirịa kwuru na ọ bụ agwa ohi na mpụ isi na mba Kenya ‘tọọrọ’ Nnamdi Kanu ma kpọlata ya na Naịjirịa.

Ejiofor kpọkuru ọkaikpe Binta Nyako ji ikpe Kanu ka ọ rubeisi n’iwu ụlọikpe kachasị nyere ma tọhapụ Kanu.

Akwụkwọ mkpesa e degaara ọkaiwu ukwu Naịjirịa

Ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi ikpe Nnamdi Kanu – Okaiwu ukwu Naịjirịa

Foto Ọkaiwu ukwu Naịjirịa na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, GETTY IMAGES/Lateef Fagbemi X

Nkọwa foto, Foto Ọkaiwu ukwu Naịjirịa Lateef Fagbemi na Nnamdi Kanu

Okaiwu ukwu gọọmentị etiti na Mịnịsta na-ahụ maka ikpe bụ Lateef Fagbemi, e kwuola na ọ bụ naanị ụlọikpe nwere ike ikpebi okwu onye ndu ndị Indigenous People of Biafra (IPOB) Nnamdi Kanu.

Fagbemi kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na n’Abuja taa.

N’okwu ya “Ọ ka mma ka a hapụ ụlọikpe ka o soro usoro iwu kwadoro wee kpe ikpe Nnamdi Kanu”

Ọ kọwakwara na e nwere nnukwu ihe dị iche n'etiti okwu Nnamdi Kanu na nke Omoyele Sowore.

Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ ka Binta Nyako sepụ aka n’ikpe ya

Nnamdi Kanu na Binta Nyako

Onye ndu Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu agbaala akwụkwọ iji gbaa ụkwụ megide ebubo e boro ya gbasara ịgba Naịjirịa mgba okpuru.

N’ozi ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako bipụtara n’ọbaozi X ya n’ụbọchị Tuzde 21 Mee 2024, ọ sịrị na ha gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ukwu etiti dị n’Abuja iji gwa Ọkaikpe Binta Nyako ka o kwupụta na ya enweghị ikikere ileba anya n’ikpe Nnamdi Kanu.

Cheta na Binta Nyako nọọrọ n’ụbọchị Mọnde jụ ịnabata arịrịọ Nnamdi kanu ka enye ya beelụ ma kpọpụtakwa ya n’aka ndị DSS.

Na nchabi ikpe ya, Binta Nyako kwuru na ya chọpụtara na Nnamdi Kanu gbara ọsọ n’oge mbụ enyere ya beelụ ma gbagaa mba ofesi.

Ọkaikpe ahụ kwukwara na mmadụ ndị nara ya n’akaebe n’oge mbụ arịọla ka ewezuga ha dịkwa ka ewezugara ha n’ihi na ha enweghị ike chọpụta ebe Kanu tinyere isi n’oge ahụ.

Ihe Nnamdi Kanu kwuru gbasara iwu Naịjirịa bụ eziokwu - Ọkaiwu

Nnamdi Kanu

Otu onye ọkaiwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya ekwuola na Nnamdi Kanu kwuru eziokwu banyere mpaghara iwu Naịjirịa ọ rụtụrụ aka.

Ọ sịrị na Gọọmenti Naịjirịa agbasoghị usoro kwesịrị ekwesị nwuchie Nnamdi kanu.

Dịka o siri kwuo, omume Naịjirịa bụ nke megidere nkwekọrịta ya na mba ndị ọzọ nwere.

Cheta na Nnamdi Kanu kwuru mgbe e kpechara ya ikpe n’ụbọchị Mọnde na Gọọmenti Naịjirịa enweghị ikikere ọbụla ikpe ya ikpe ma rụtụ aka na mpaghara 2, ahịrịokwu 3(f) nke iwu megidere akparamaagwa mpụ.

Gọọmentị Naịjirịa enweghi ikike ikpe m ikpe - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu na ndị okenye bịara ikpe ya

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob abaala mba maka mpụtara ikpe ya n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja taa.

Kanu n'ihe onyonyo kwuru na gọọmentị etiti enweghi ikike ikpe ya ikpe maka na ọ pụtara ịda iwu dị n'ime Terrorism Prevention and Prohibition Act 2022.

Kanu sị "Ị nweghi ikike ikpe m ikpe! Iwu kwuru na akụkụ abụọ nke atọ n'iwu Terrorism Prevention Act kwuru na onye ọbụla kpere mmadụ ikpe megide nkwenye ọbụla Naịjiria so na ya, bụ onye na-eyi ndụ egwu"

"A nọọla m na nwụchi afọ atọ, maka gịnị"? ka o kwuru.

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor

Nnamdi Kanu: Ụlọikpe agbajọọla mkpesa ya ịpụta n'aka DSS

Nnamdi Kanu, onyeisi Ipob n'ụlọikpe 20-05-2024

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja agbajọọla mkpesa nke Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Ipob ị si n'aka ndị uweojii pụrụiche bụ DSS pụọ gaa ụlọ mkpọrọ nkịtị.

Ọkaikpe Binta Nyako nyere ikpe a kọwara na ọ dịla ugboro ugboro a na-eweta ikpe a n'ihu ya ma kwusike ike na ọ gaghị agbanwe uche ya.

"Ọnwụnwa ọzọ ịme mkpesa a ga-aghọzị ịmebi usoro ikpe ikpe, ihe fọzịrị ime bụ ibugara ụlọikpe mkpesa okwu a" ka Nyako kwuru.

Ọ sịkwa na n'aka DSS bụ ebe kachasị dịrị Kanu mma ị nọ ma siri na-abịa ikpe ya.

"Ịweta okwu a n'ihu m ọzọ enweghi isi. O mee ọzọ, ọ ga-aghọzi imebi usoro ụlọikpe".

Nnamdi Kanu
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

A ga-anọ n’ụbọchị taa bụ Mọnde 20 Mee 2024 kpebie ma a ga-etinye onye ndụ Indigenous People of Biafra (IPOB) bụ Nnamdi Kanu n’ụlọmkpọrọ ọhanaeze.

N’ụbọchị ikpeazụ e lebara anya n’okwu Nnamdi Kanu, ọkaiwụ ya bụ Aloy Ejimakor gwara ụlọikpe na enyebeghị ha ezigbo ohere ịga zute Kanu n’aka DSS.

O kwuru na ọ bụ naanị nkeji iri atọ ka ha na Kanu na-eji ezukọ nwee mkparịtaụka tinyekwara na e ji ihe onyonyo ese mkparịtaụka ha na-enwe.

Ọ gwara ọkaikpe ka o weghachịte iwu ahụ o nyere n’afọ 2017 bụ nke sị ka a gbapụta Kanu.

Ka osiladị, n’ozi Ejimakor zipụrụ n’akara ọbaozi X ya, o kwupụtara na ikpe Nnamdi Kanu ga-adị n’ụbọchị taa bụ Mọnde mgbe ọ ga-akụ elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị (12:00pm).

Cheta na nwunye Nnamdi Kanu bụ Uchechukwu Okwu Kanu gara leta di ya na nso nso a n’aka ndị DSS.

N’oge ọ gachara njem ahụ, o kwupụtara n’akara ọbaozi ya na nke ahụ mbụ ya ịhụ di ya anya kemgbe afọ 2021 bụ mgbe gọọmenti Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya.