Nnamdi Kanu ekwughị na ọ gaghị apụta maka ikpe ya maọbụrụ na e meghị ihe ọ chọrọ- Ejimakor

Ọkaiwu Aloy Ejimakor

Ọkaiwu Nnamdi Kanu, onye ndu otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenious People Of Biafra(Ipob) bụ Aloy Ejimakor ekwuola na akụkọ nke ụfọdụ ụlọntaakụkọ buru nke kwuru na Nnamdi Kanu nyere ọnọdụ o ga-eji kweta ka a gaa n'ihu n'ikpe ya abụghị ihe o kwuru.

N'ozi nke o wepụtara n'ụtụtụ Fraide, Ejimakor kwuru na ikpe e kpere ụbọchị 17 nke ọnwa Eprelu, afọ 2024, na ha rịọrọ ụlọikpe ka a tọhapụ Kanu ka o nwee ike isi n'ụlọ abịa ikpe ya ji nye ohere ka o nweta nkwado zuru oke dịka ọ dị n'iwu, si na ọnọdụ ọ nọ n'mkpọrọ ndị DSS agaghị enye ya ohere inweta nke a.

"O nweghị mgbe anyị sị na ọ bụ ọnọdụ a ka Kanu ga-eji kwe pụta maka ikpe ya."

"Anyị enweghị ụdị ikike ịmanye ụlọikpe mee ihe."

"Ịdọrịta okwu n'ụlọikpe na inye ụlọikpe iwu ihe ha ga-eme abụghị otu."

" Anyị kwuru na inye Kanu ohere isi n'ụlọ abịa ikpe dịka e nyeburu ya bụ ụzọ kachasị mma iweta ọnọdụ ga-eme ka e kpee ikpe a ngwangwa dịka ụlọikpe si nye n'iwu, maka na ọ ga-eweta na njedebe ọnọdụ tara akpụ nke dị na nga DSS bụ nke megidere ohere Kanu nwere inweta ikpe nkwụmọtọ dịka ọ dị n'iwu."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

A kpụrụ Kanu ụlọikpe maka ebubo metụtara ịkpa nkata ịkwadu gọọmentị Naijiria.

Nnamdi Kanu Case: Lee mgbe ụlọikpe ga-ekpebi ma a ga-ebuga ya na mkpọrọ imeụlọ

Nnamdi Kanu, onyendu Ipob

Ọkaikpe Binta Nyako nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja ga-anọ n’ụbọchị 20 nke ọnwa Mee kpebie ma ọ ga-etinye Nnamdi Kanu bụ onyendu Indigenous People of Biafra (Ipob) mkpọrọ ime ụlọ.

N’ikpe Kanu na gọọmentị na-aga n’ihu taa, ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor gwara ụlọikpe na e nyebeghi ha ezi ohere izute Kanu n’aka ndị DSS.

O kwuru na ọ bụ naanị nkeji iri atọ ka ha na Kanu na-eji ezukọ nwee mkparịtaụka, bụ nke ọtụtụ n’ime anaghị ekwe ha were akwụkwọ na mkpịsị e ji ede ihe, tinyekwara na e ji ihe onyonyo ese mkparịtaụka ha na-enwe.

Ọ gwara ọkaikpe ka o weghachịte iwu ahụ o nyere n’afọ 2017 bụ nke sị ka agbapụta Kanu, ọkachasị ka ụlọikpe kwuru na Kanu agbaghị ọsọ ọbụla.

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu

Mana ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Adegboyega Awomolo jụrụ ịnabata arịrịọ a Ejimakor rịọrọ ma kwuo na ụlọikpe ekpebiela nke ahụ na mbụ.

Ọkaikpe Nyako kwuru na ọ bụ n’ụbọchị 20 Mee ka ọ ga-eleba anya na nke ahụ ma kwuo na ikpe ahụ ga-aga n’ihu taa ma kpọọ oku ka ndị ọkaiwu gọomentị ka ha kpọọ ndị akaebe ha.

Ejimakor kwuru na ha akwadoghi ọfụma maka ikpe Kanu ikpe taa maka na ha e nweghi ohere ịnọ n’ebe ndị mma nwee mkparịtaụka.

Ọkaikpe Nyako were iwe megide Ejimakor ma yie ekwu kwuo na ọ ga-ebuga ikpe ahụ ruo oge a na-amaghị mgbe ọ ga-abụ, tinyekwara na Kanu ga-anọ na mkpọrọ ruo mgbe ahụ.

O nyere nkeji iri ka Kanu na ndị ọkaiwu ya nwee mkparịtaụka ma laghachị ka a malite ikpe ya ikpe.

Dịka ọ dị ugbua, e burula ikpe ahụ gawa n'ụbọchị 20 nke ọnwa Mee, bụ mgbe a ga-ekpebi maka ibuga ya na mkpọrọ imeụlọ nakwa ikpe ahụ ịga n'ihu.

Mgbe Kanu wụchiri n'ụlọikpe

Mgbe Nnamdi Kanu wuchiri n'ụlọikpe

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu onyendu Indigenous People of Biafra (Ipob) awụchiela n'ụlọuikpe dị n'Abuja maka ikpe n'ụbọchị 17 Eprel 2024 n'ileba anya n'ikpe dị n'etiti ya na gọọmentị Naịjirịa.

Kanu n'onwe ya awụchiela n'ụlọikpe ịzara ọnụ ya n'ebubo ndị e boro ya. Ụfọdụ ndị nkwado ya gụnyere ndịisi ụlọụka nakwa ndị ọzọ bịara ịdọnyere ukwu.

Ikpe a ga-amalite n'elekere iri na abụọ nke ehihie ga-agbakwasị ụkwụ n'ebubo asaa gọọmentị boro Kanu nke gụnyere iyi ndụ egwu nke ọkaikpe Binta Nyako ga-eleba anya na ya.

Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu

Cheta na mgbe ikpeazụ a nụrụ ikpe Kanu n'ụbọchị 19 Maachị 2023, ụlọikpe kachapụrụ arịrịọ nke ndị ọkaiwu Kanu rịọrọ ka a agbapụta ya maọbụ tọghapụ ya n'aka ndị uweojii pụrụiche ji ya bụ DSS ma tinye ya n'ụlọmkporo ndị nkịtị.

Ọkaikpe Nyako jụrụ ime nke a kama nye iwu ka e nye Kanu ohere ịhụ ndị dọkịta nke ya n'ihi ọnọdụ ahụike ya.

Ndị ọkaiwu Kanu nke Aloy Ejimakor nọ n'isi ya kwuru na ọ bụ eziokwu na mkpebi ahụ wutere ha kama na obi agaghị ada ha mba.

Ndịisi ụlọakụ bịara ịdọnyere Kanu ukwu

Kedụ ihe ndị a na-atụ anya

Kanu na ndị ọkaiwu ya mgbe ikpeazụ ọ pụtara n'ụlọikpe n'ọnwa Maachị
Nkọwa foto, Kanu na ndị ọkaiwu ya mgbe ikpeazụ ọ pụtara n'ụlọikpe n'ọnwa Maachị

N'ikpe nke taa ga-amalite n'elekere itoolu nke ụtụtụ, a na-atụ anya na ọkaikpe Binta Nyako nọ n'isi ikpe ahụ ga-enye ndị ọkaiwu gọọmentị ka ha gụpụta ebubo asaa ndị ahụ ha tụkwasịrị n'isi Nnamdi kanu.

N'otu aka ahụ, ọ ga-enyekwa ohere ka ndị ọkaiwu Kanu nke Aloy Ejimakor nọ n'isi ha kwuo ihe ha maara banyere ebubo ndị ahụ - ma ha ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.

N'otu aka ahụ, a na-atụkwa anya na Kanu n'onwe ya ga-awụchi n'ụlọikpe a maka iji ọnụ ya zaa ajụjụ banyere ebubo ndị ahụ.

Ka o si na dị, BBC Igbo kwụchịm iwetara unu ka ikpe ahụ ga-esi gaa n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja.

Akụkọ ka na-abịa...