Ihe mere mụ na Ejiofor abụghịzi ndị okaiwu Nnamdi Kanu - Mike Ozekhome

Ozekhome Ejiofor na Nnamdi Kanu

Mike Ozekhome akụwaala akụoyibo nsugbe gbasara ihe mere o ji kwụsi ịnọchi anya Nnamdi Kanu n'ụlọikpe dịka okaiwu ya.

Ozekhome gwara BBC na ọ bụ n'aka Kanu ka ọ dị ịhọpụta okaiwu ga-anọchi anya ya.

"Iwu Naịjirịa nyere mmadụ niile ikike ịhọpụta onye ga-anọchi anya ha nke mere na Kanu họpụta onye ọzọ ịnọchi anya ya, ọ gbasaghi ndị mmadụ" ka o zara n'ozi ekwentị.

Cheta na kepu kepu na-efegharịbu na Nnamdi Kanu achụbuola Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor dịka ndị okaiwu ya nke ha gọrọ.

Ozekhome gara n'ihu kwuo sị "mana ọrụ niile m rụrụ n'ikpe Nnamdi Kanu doro ụwa niile anya, ị chọọ ya na Google, ị ga-ahụ ya ebe ahụ".

Ejiofor n'onwe ya azabeghi ekwentị ya rue ug

Nkọwa Aloy Ejimakor nyere

Aloy Ejimakor

Aloy Ejimakor zakwara BBC Igbo ajụjụ banyere ihe mere Ejiofor na Ozekhome ejighi soro na ndị okaiwu Kanu.

Ọ sị. "ọ bụ ịtụ anya nke onye a na-anọchite ka e ji agbanwe okaiwu. Ọ gaghị emebi maọbụ dozie ikpe" ka o kwuru.

Ejimakor gara n'ihu kwuo na ọ bụghị ihe ọjọọ ma agbanwee okaiwu dịka o kwuru na kemgbe ikpe Kanu na gọọmentị Naijiria malitere na e nweela ọtụtụ ndị mmadụ nọchitere Kanu n'ụlọikpe dị icheiche.

"Ọ nweghị ihe pụrụiche dị na ya" ka o kwuru. 

E bugala ikpe Nnamdi Kanu rue ụbọchị Maachị 19

Nnamdi Kanu

Ụlọikpe etinyela ụbọchị 19 nke ọnwa Maachị dịka ụbọchị ọzọ a ga-anụrụ ikpe mgbapụta Kanu.

Ụlọikpe nyere DSS iwu ka ha gbanwee uwe Kanu ma nye ya akwa ọzọ.

Ụlọikpe kwuru na ọ gaghị eyi uwe njirimara agbụrụ ọbụla maọbụ ika mana ha kwuru ka e nye Kanu uwe ọzọ hoo haa.

Ifeanyi Ejiofor na Mike Ozekhome esoghizi na ndị Okaiwu Kanu

Nnamdi Kanu na Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook

Akụkọ si ụlọikpe apụta ugbua na-ekwu na agbanweela ndị okaiwu Kanu ma wepụ Ifeanyi Ejiofor nakwa Mike Ozekhome.

Nke a pụtara ihe mgbe ndị okaiwu na-anọchite anya Kanu biliri n'ụlọikpe ịkpọpụta aha ndị so ha.

Akpọghị aha Ejiofor na Ozekhome nke mere na ahụghị ha anya chaa chaa na ya bụ ụlọikpe

Onye ntaakụkọ anyị ghọtara na Ejiofor n'onwe ya kwenyere na ya bụ ihe bụ eziokwu okwu

Ọ sị "ọ bụ aka ọrụ ndị anya ọkụ" ka o kwuru n'ekwentị.

E nwekwara mgbanwe na nke ndị gọọmenti etiti dịka Adegboyega Awomolo na-eduzi otu ndị okaiwu ha.

Etu ikpe Nnamdi Kanu si a gaa n'Abuja taa

Nnamdi Kanu na Okaiwu ya bu Aloy Ejimakor

Nnamdi Kanu bu onyeisi otu Indigenous people of Biafra (Ipob) agbaala n'ihu okaikpe Binta Nyako n'ụlọikpe dị n'Abuja taa.

Ikpe ya maka ebubo gọọmenti Naijiria boro ya ịgba mgba okpuru nakwa ihe ndị ọzọ ka na-aga n'ihu.

Cheta na ụlọikpe kachasị kagburu mkpebi nke ụlọikpe mkpegharị nyere gbasara ikpe ya.

Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ụlọikpe taa hụrụ na o nweghị onye nkwado Kanu so bịa ụlọikpe taa dịka ha si abịabu.

Otu onye Ukochukwu na-agozi Kanu n'ime uloikpe