Nnamdi Kanu: Ihe Emma Kanu, Ipob, Okaiwu ya kwuru maka mkpebi Ụlọikpe Kachasị

Onyeisi ndị ọkaiwu na-anọchite Nnamdi Kanu bụ Ọkaiwu Kanu Agabi ekwuola na -agbanyeghị na ikpe Onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ụbọchị Fraide abalị 15, nke ọnwa Disemba agaghị ka ha tụrụ anya, o kwuru na 'anyị nwere olileanya".
"Ihe nke pụtara na anyị ga-alaghachị n'Ụlọikpe Ukwu nke Etiti."
"Mana ihe Ụlọikpe kwuru kasiri m obi; ụlọikpe kwuru na o kwesịghị ka a kpasa ya agwa etu e siri kpaso ya agwa;wakpoo ụlọ ya (Kanu)."
Nwanne Nnamdi Kanu bụ Emma Kanu agbarụọla ihu na mkpebi nke Ụlọikpe Kachasị nyere n'ikpe e kpere megide onye ndu otu Ipob.
N'ikpe e kpere n'Abuja ụbọchị Fraide, Ụlọikpe Kachasị kpebiri ka Kanu gaa zara n'ọnụ ya n'ebubo e boro ya nke dịbụ n'ụlọikpe Ukwu nke Etiti tupu ọ gbaa ọsọ n'afọ 2017.
Kanu bụ onye kpọrọ ya "ikpe ezighị ezi" kpọkuru ọ handị mmadụ ka ha kwugide ya.
Ọ sịrị,“Ọ tụrụ m n’anya na ha(ụlọikpekachasị) guzogidere na ndahịe nke Gọọmentị Etiti.”
“ Kedụ ka ị ga-esi eweghachi ikpe n’Ụlọikpe Ukwu nke Etiti? I were ndahie ịtụkwasa na ndehie.”
“ Ana m atụ anya n’ụwa nile ga-ekuli ma kwugide ya. "
"Ikpe ezighị ezi megide Nnamdi Kanu bụ ikpe Ezighị ezi megide onye ọbụla.”
N'aka nke ọzọ, otu Ipob kwuru na mkpebui ahụ bụ "egwuregwu ịkpa ọchị."
N'ozi ha nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful binyere aka ma wepụta, ha kwuru na Ụlọikpe Kachasị na ndị ọkaikpe ya egosila na "ha agaghị enye ikpe ziri ezi."
Nnamdi Kanu: "Ikpe a bụ nke obi mgbawa" - Aloy Ejimakor
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor ekwuola na ikpe Nnamdi Kanu nke ụlọikpe kpebiri agaghị etu ha tụrụ anya ya.
Ụlọikpe kpebiri ka Kanu gaa zara ikpe dịrị ya n'ụlọikpe etiti bụ High Court nke ọ mafere n'afọ 2017. Ha kwuru na etu e siri kpọlata ya Naịjirịa agaghị akwụsị ya ịzara ikpe dị n'isi ya.
Ebubo ndị e boro ya nke ikpe ya dị na High Court gụnyere iyi ndụ egwu na ihe ndị ọzọ.
Nnamdi Kanu: "Etu e siri nwụchie mmadụ agaghị akwụsị ikpe ya ikpe" - Ụlọikpe kachasị

Ụlọikpe kachasị akachapụla ikpe ụlọikpe mkpekwa kwuru ka a tọghapụ Nnamdi kanu mna belu nakwa mkpebi kwuru na a gaghị anwale ya maka etu e siri kpọlata ya na Naịjirịa.
Otu ndị ọkaikpe ahụ kwuru na ikpe Kanu nke o wufere n;afọ 2017 ga-agarịrị n'ihu.
Olileanya dịbu ebe dị icheiche na ikpe a ga-atọghapụ kanu mana o mezughi etu ahụ.
Nke a bụ ikpe ikpeazụ banyere ikoe Nnamdi kanu bụ one e ji kamgbe afọ 2021. Ụlọikpe mkpekwa ekpebiela ka a tọghapụ ya mana e jichiri ya. Ugbua, ụloikpe kachasị akachapụla ikpe ahụ.
E kpebiri ikpe ahụ n'Abuja ụbọchị Fraịdee, abalị 15 ọnwa Disemba 2023.
Echiche ndị mmadụ maka ikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, BBC
Ihe niile ụlọikpe kachasị kpebiri
- Ikpe Nnamdi Kanu ga-aga n'ihu - Cheta na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu rịọrọ ụlọikpe ka a kachapụ ikpe Nnamdi Kanu maka na ụzọ e siri nwụchie ya ma kpọlata ya na Naịjirịa n'afọ 2021 bụ nwuchi nke na-abụghị ụzọ ziri ezi. Ụloikpe mkpekwa kwetara ekpere ahụ ma kpebie na etu e siri kpọlata ya ezighizi ezi nke mere na o kwesighi ka e kpe ya ikpe cha cha. Mana ụlọikpe kachasị ekwetaghị nan nke ah, ha kwuru n'ezie na ụzọ e siri kpọlata ya abụghị nke ezigbo mana ọ pụtaghị na a gaghị ekpezi ya ikpe ihe o mere. Ha kwuru na Naịjirịa erubeghi ogogo dị etu ahụ.
- Ụlọikpe mkpekwa egosighi ikpe ọbụla gosiri na onye anwụchiri n'ụzọ ezighi ezi agaghị aga ikpe.
- Naịjirịa gbaa mbọ na-eme ihe n'ụzọ ziri ezi.
- Ikpe Nnamdị Kanu ga-aga n'ihu n'ụlọikpe High Court
Ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor nọrọ n'ụlọikpe taa kwuo na ikpe a bụ nke obi mgbawa.
O kwuru na n'ezie, ụlọikpe kachasị kpebiri na mwakpo a wakporo Kanu abụghị nke ziri ezi mana ụlọikpe kwuru ka ikpe ya gaa n'ihu.
Ndị ọkaiwu Kanu gụnyere Ozekhome n'ụloikpe

Nnamdi Kanu: Ihe Abaribe, Bianca Ojukwu, Ebere Okaro na ndị ọzọ kwuru maka ikpe Nnamdi Kanu echi

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Abaribe/Ebere Okaro
Ọtụtụ ndị nwere agba n'Ọwụwa Anyanwụ akpọọla oku ọzọ ka a tọhapụ onye ndu otu nnwereonwe Biafra a kpọrọ Indigenous People of Biafra(Ipob) bụ Nnamdi Kanu bụ onye ikpe ya ga-adị n'ụlọikpe ụbọchị Fraide.
Ndị a gụnyere Enyinnaya Abaribe, nwunye Emeka Ojukwu bụ Iyom Bianca Ojukwu na onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Ebere Okara kpọrọ oku ka a tọhapụ Kanu na mkparịtaụka ha na BBC nwere n'ekwentị.

Ebe foto si, Abaribe/Facebook
N'ozi ya, Abaribe bụ onyeomeiwu na-anọchite Abia -South n'Ụlọomeiwu kwu kwuru na " Anyị na-atụ anya n'Ụlọikpe Kachasị ga-ekwenye n'ihe Ụlọikpe Mkpegharị kpebiburu ma sị ka a tọhapụ ya."
Abaribe onye kwuru na ha na Gọọmentị akpaala maka ya bụ ihe kwuru na "ọ ga-enye aka ịdajụ ihe na-akpọtụ n'Ọwụwa Anyanwụ ma ma tipịa afọ ndị omekome kwanyere ahụ na ya were akwado akụnaụba Ọwụwa Anyanwụ."

Ebe foto si, Bianca Ojukwu/Facebook
N'otu aka aka ahụ, Bianca Ojukwu kwuru na "Ị ga n'ihu jichie Nnamdi Kanu bụ ikpe mara ezịokwu".
"Anyi nwere olileanya na ụloịkpe ga-ege nti ma tọhapụ Nnamdi Kanu."
Kemgbe afọ 2021 ka a nwụchịri Nnamdi Kanu, na-agbanyeghị na ụlọịkpe Mkpegharị kwụrụ ka a tọhapụ ya ma nye iwu na agaghị eji ebubo ndi eboburụ ya ekpe ya ikpe ọzọ."
Ojukwu , onye kwuru na njide e jigidere Nnamdi Kanu a bụghị ka iwu ala siri kwado gara n'ihu sị, "Anyi na-atụ anya na ndi ọkaịkpe ga-ekpe ịkpe ziri ezi echi ma gosi ụwa na gọomentị ekwesịghị ịgbagha ikpe ụlọịkpe kpere,site na ị tohapụ Nnamdi Kanu."

Ebe foto si, Ebere Okaro/Instagram
Ebele Okaro kwuru sị, "Ekpere m bụ ka a tọhapụ Maazị Nnamdi Kanu echi iji weta na njedebe nọrọnụlọ ụbọchị Monde."

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/NGR Presidency/Adoration Ministry Enugu
Ụbọchị ụlọikpe kachasị ga-ekpebi ikpe gbasara Nnamdi Kanu onyeisi otu Indigenous People of Biafra 'Ipob' na-eru n'ike n'ike. Ụlọikpe kachasị nyere ụbọchị Disemba 15 dịka ụbọchị a ga-ekpebi ikpe gbasara nwamadị ahụ nọ n'ụlọ mkpọrọ kemgbe ọnwa Juun afọ 2021.
Ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu akpọọla oku ka a toghapụ ya. Ebe ndị ahụ gbadoro ụkwụ akpọ oku a bụ n'ụlọikpe enyebuola iwu ka a toghapụ Kanu ma kwụọ ya ego itiaka n'obi.
Ndị ji Kanu kemgbe a nwuchiri ya n'ọnwa Julaị afọ 2021 bụ ndị uweojii pụrụiche bụ DSS egbeghi ntị na mkpebi ụlọikpe ndị ọzọ.
Iji gụnyere mkpebi ụlọikpe ndị ọzọ, ndị okaiwu Kanu na-ekwu na ahụ adịghị ya n'ime mkpọrọ ebe e ji ya ma kwukwaa na o kwesiri ịnata ọgwụgwọ ngwa ngwa iji zọọ ndụ ya.
Otu Ohaneze Ndigbo bu ụzọ kpọọ oku ịtọghapụ ya kpamkpam mana lee ndị ọzọ soro nzọmụkwụ ha.
1. Otu World Igbo Congress
Otu a bụ otu jikọrọ ndị agbụrụ Igbo niile bi n'ofesi.
N'ozi nke onyeisioche ha bụ Festus Okere binyere aka, ha kpọrọ oku ka a tọghapụ Kanu ngwa ngwa. Ha kọwara na o nweghịzi ihe nyere onye ọbụla ikike ijichi Kanu dịka ụlọikpe ukwu dị n'Enugwu steeti nyere mkpebi na otu Ipob nke Kanu bụ onyeisi ya abụghị otu na-eyi ndụ egwu dịka gọọmenti etiti n'ọchịchị Buhari siri kpọọ ha.
"E jichiri Kanu naanị ya na mkpọrọ na Naijiria kemgbe ọnwa Juun afọ 2021 na-agbanyeghị na ahụ esighị ya ike, ha akwụsịla ya ịga nata ọgwụgwọ zuru oke" ka ha kwuru n'ozi ahụ.
Ha rịọkwara ụlọikpe kachasị ka ha mee ihe dị mma site n'itọghapu Kanu.
2. Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, Emmanuel Iwuanyanwu/NGR Presidency
Otu Ohaneze Nd igbo akpọọla oku ka gọọmentị etiti tọghapụ Nnamdi Kanu nye ha dịka onyinye e nyere ndị ọwụwa anyanwụ n'Ekeresimesi.
Nke a pụtara ihe na mkparịtaụka osote onyeisi otu ahụ bụ Damian Okeke-Ogene na ụlọ ntaakụkọ Punch nwere.
Okeke-Ogene kwuru sị "ọ ga-abụ ekeresimesi ojii maọbụru na atọghapụghị Nnamdi Kanu.
Ọ kwukwara na ọ bụghị eziokwu na aka ụfọdụ ndị a ama dị na njichi Kanu sị "o teela aka ụlọikpe abụọ nyere iwu ka atọghapụ Kanu ma rue ugbua o nwebeghi ihe emere maka ya".
"E kwesiri ịtọghapụ Nnamdi Kanu n'ụbọchị 15 Disemba, ma emeghi ya, awụọla olileanya ndị ọwụwa anyanwụ n'ala" ka o kwuru.
3. Ejike Mbaka

Ebe foto si, Adoration Ministry Enugu
Ejike Mbaka a ma dịka Fr Mbaka bụ ụkọchukwu ụlọụka Katọlik a ma ama na Naijiịria.
Mbaka nọ n'emume ụka ya ọ na-eme kwa ụbọchị Wenzde niile kpọọ oku ka ndị nso ya kpee ekpere maka ntoghapụ Nnamdi Kanu n'ụbọchị 13 ọnwa Disemba.
Cheta na Mbaka ekwubuola n'ọnwa Febụwarị na ọ dịghị mma ka a gaa ihu na-ejichi Nnamdi Kanu n'agbayeghi na ụlọikpe kwuru ka atọghapụ ya.
O hazikwala ekpere maka otu Ipob nke Kanu bụ onyeisi ya kwa mgbe kwa mgbe.















