Etu e si lie Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) bụbu Gọvanọ Anambra Steeti

Ebe foto si, Uche Nworah
E liela onye aka chịburu Anambra steeti bụ Dọkịta Chukwuemeka Ezeife (Okwadike) n'ụlọ ya n'Igboukwu dị n'okpuruọchịchị Aguata nke steeti ahụ n’ụbọchị Satọde 20 Eprel, 2024.
Ezeife nwụrụ n’ụlọọgwụ FMC dị n’Abuja n’ụbọchị Tuzde 14 Disemba 2023 dịka ọ rịachara ọrịa.
N'oge olili ozu ya, Onyeisiala Bola Tinubu kọwara Ezeife dịka "ezi nwa ala" gbakwara mbọ maka udo na ịdịnotu nke Naịjirịa.
Gọvanọ Anambra bụ Chukwuma Soludo kwuru “dịka anyị na-efere ya aka ikpeazụ, ọ dị mma ka anyị cheta nzọmụkwụ ndị zọrọ n’ala maka ọdịmma ndị obodo anyị.”
Ndị a ma ama bịara olili ahụ gụnyere; Gọvanọ steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo, Gọvanọ Imo steeti bụ Sinetọ Hope Uzodimma nọchitereanya Onyeisiala Bola Tinubu, ndị aka chịburu steeti ahụ bụ Sinetọ Chris Ngige na Peter Obi.
Ndị ọzọ bụ aka na-achị Ebonyi steeti bụ Gọvanọ Francis Nwifuru, onye osote ya bụ Oriakụ Patricia Obila nọchitereanya ya, Sinetọ Victor Umeh, Sinetọ Ben Ndi-Obi, Sinetọ Uche Ekwunife, ndị eze ọdịnala, na ọtụtụ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Uche Nworah

Ebe foto si, Uche Nworah

Ebe foto si, Uche Nworah
Ihe ndị ị maghị maka Okwadike

Oke osisi adaala na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijirịa dịka Chukwuemeka Ezeife bụ aka chịburu steeti Anambara laarala mmụọ.
Nke a pụtara ihe dịka ozi nwa ya nwoke bụ Rob Ezeife tinyere aka n’aha ezinaụlọ ya ma wepụta ụbọchị Fraide.
Ozi ahụ kwuru na Ezeife nwụrụ n’ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị n’Abuja n’ụbọchị Tọzde abalị 15 ọnwa Disemba afọ 2023.
Mmalite ndụ Chukwuemeka Ezeife

A mụrụ Chukwuemeka Ezeife n’abalị 20 nke ọnwa Nọvemba, 1938 n’Igboukwu dị n’okpuru ọchịchị Agụata nke Steeti Anambra.
Ọ gaghị ụlọakwụkwọ sekọndrị kama o jiri aka ya kụziere onwe ya nke a kpọrọ “correspondence courses” n’olu bekee bụ nke mere ka o tozuo oke inweta ohere agụmaakwụkwọ na mahadum.
Ezeife nwetara nzere BSc n’ihe ọmụmụ Economics na mahadum Ibadan ma sizie ebe ahụ gawa mahadum Havard ebe ọ nọrọ nweta nzere Masters na PhD n’afọ 1972 site n’ohere agụmaakwụkwọ n’efu nke otu 'Rockefeller Foundation.
Ọ banyere n’ọrụ Bekee dịka onye 'Administrative Officer' ma gbagoo n’ogogo odeakwụkwọ ukwu.
Ọ bụrụ onyeisi ụlọakwụkwọ ọtaakara ma mechaa bụrụ onye nkụzi na mahadum Makarare ụniversity College Kampala nke mba Uganda.
Ọ bụụrụ oso-akụzi na mahadum Havard ma bụrụkwa onye a na-akpọtụrụ (consultant) nke Arthur D. Little na mahadum Cambridge, Massachusetts.

Oge ndọrọndọrọ ọchịchị Ezeife
Ọ malitere ịzụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ma mechaa bụrụ onye a họpụtara dịka gọvanọ Steeti Anambra n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị Social Democratic Party malite n’ọnwa Jenụwarị, 1992 ruo n’ọnwa Nọvemba, 1993.
Ọ bụkwaara onye ndụmọdụ onyeisiala n’okwu ndị metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị n’okpuru ọchịchị Olusegun Obasanjo.
Dịka gọvanọ, o nyefere mahadum Nnamdi Azikiwe University na ụlọakwụkwọ nkanụụzụ Federal Polytechnic Oko n’aka gọọmenti etiti bụ nke nyere aka ịhụ na ha nyara ndụ n’oge ọchịchị ndị agha.
Ezeife nwụrụ n’ụbọchị Tọzde, abalị 14 nke ọnwa Dizemba, 2023 dịka ọ gbachara afọ 85.
Ihe Ohaneze Ndigbo kwuru maka ọnwụ Ezeife
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu jịkọrọ ndị Igbo bu Ohaneze Ndigbo kọwara onwu Gọvanọ chịburu Anambara Steeti bụ Chukwuemeka Ezeife dịka "ịhe mmapụ obi.
Ezeife nwụrụ n’ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre' dị n’Abuja n’ụbọchị Tọzde abalị 15 ọnwa Disemba afọ 2023.
Ohanaeze Ndigbo n' akwụkwọ ozi nke ọn u na ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia binyere aka ma wepụta kọwara Ezeife dịka otu onye ndị Igbo ji eme ọnu ma buru onye ọganịrụ obodo na-amasị.
Ha sịrị na Ezeife bụ "nwaafọ adighị akpa oke agbụrụ bụ onye na-eti mgbu na ọ bụụ na ekegharịghị Naijiria na mpaghara , na mpaghara , na Naijiria ga-aga n'ihu na-adagharị n'ọchịchịị."
Akwukwọ ozi ahu kwuru na onye ịsị ndị Ohaneze Ndi Igbo, Emmauel Iwuanyanwu nwere ezịgbọ obi nwute mgbe ọ nụrụ maka ọnwụ Ezeife.
Ebere akwa na Chukwuemeka Ezeife nakwa ọtutu ndị Igbo jịrị bịrị dịka Ọkammuta George Obiozor, Ọkammuta Joe Irukwu, Ọkammuta Ben Nwabueze, Mbazulike Amechi, Sylvanus Olisanye Ebigwei na ndị ọzọ nwuru na ntịbị anya.
Ohaneze jịrị ohere ahu rio ezinaulọ ndị be Chukwuemeka Ezeife, ndị Igbo-Ukwu bu obodo ya na ndị Anambra nịle ka ha dibe.
Ihe ndị ọzọ a ma ama kwuru maka ọnwụ Ezeife
Ndị a ma ama dị icheiche etinyela ọnụ n'ọnwụ dike Igbo a lara mmụọ.
Gọọmentị Steeti Anambra site n'ọnụ aka na-achị ha bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludorur uju onwụ Chukwuemeka Ezeife dịka ọ kọwara na Ezeife bụ nwoke kpara ike dị egwu na Steeti Anambra nakwa n’obodo Naịjirịa.
N’otu ozi ọ wepụtara site n’aka odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Christian Aburime, Soludo kọwara na dịka onye nkịtị mbụ chịrị Steeti anambra, Ezeife jiiri ezi ọhụ na amamịihe tọọ ntọala siri ike maka Steeti Anambra nke a na-anụ aha ya taa.
Ọ kasiri ezinaụlọ Ezeife obi ma rịọkwaa ka mkpụrụobi ya zuo ike na ndokwa.












