PDP Presidential ticket: Ihe Ezeife, Ohaneze na ndị ozọ kwuru maka PDP ịjụ inye Igbo ohere n'ịzọ ọkwa onyesiala

George Obiozor na Chukwuemeka Ezeife

Ebe foto si, George Obiozor /BBC

Aka chịburu Anambara steeti mabụrụkwa onye Igbo welitere isi n'otu PDP bụ Chukwuemeka Ezife akatọọla mkpebi Komitii pati PDP kpebiri ịhapụ ọkwa onyeisala ka ọ bụrụ onye zọta o were.

Komiti mmadụ 37 nke PDP hiwere ka ha nyocha ma tụnye ha alọ maka ịhọpụtta onye ga-efe ọkọlọtọ pati ha n'afọ 2023 nke Gọvanọ Sam Ortom nke Benue steeti nọ n'isi ya gwara ndị isi pati ahụ ụbọchị Wednezde ka ha hapụ ike ọkwa ahụ kenye ya mpaghara ọbụla dịka pati ahụ n nnmnnn.

Mana Ezeife kwuru na nzọpụ ụkwụ ndị pati ahụ bụ "arụ" kwọ nwa,

O kwuru na PDP na-elufu ohere isonye na ndị ga-enye ọha ụmụ Naijtia Naijria ọhụrụ..

Okwu inye Igbo ohere iwepụta onye ga-azọ ọkwa onyeisiala bụ ihe a kpụ n'ọnụ ugbua.

Ka ọdị ugbua, pati nọ n'ọchịchị bụ APC ekpebiela na ọ bụ mpaghara Ọdịda Anyanwu ga-anye ha onye ga-azọ n'aha pati ha.

Chukwuemeka Ezeife

N'otu aka ahụ, otu Ohaneze Ndigbo kwuru na ihe PDp mere bụ nnukwu ndahịa nakwa ' ịrara ndị igbo bụ ndị ha kwuru nyere pati ahụ nnukwu nkwado, nye.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwentị ụbọchị Tọzde, ,Ezeife sịrịa " Oge eruka Chineke chọrọ ịzọpụta Naijria , nye anyị Naijiria ọhụrụ, amaghị ma PDP o sona ya."

Aha onyonyo, Igbo Presidency 2023: 'Ihe ndị Igbo nwereike ime iji nwete ọchịchị onyeisiala - Joe Igbkwe

" Ndị nile enweghị obi ikwu eziokwu agaghị esozi chịa anyị. Ihe PDP mere gosiri na ha esonghị na ndị eziokwu."

"Anyị bụ ndị Naijiria ga-achọwa ndị obi ha dị mma. Anyị agaghị eso PDP, anyị agaghị eso APC."

"Ihe na-ekwu bụ na Chineke achọọla ịzọpụta Naijria ya mere ha ji nyụọ nsị n'ụl;ọụka na-agbanyeghị na ọ dị n'iwu PDP. Ndị PDP emeela arụ. Ha ga-ahụ ihe ga-eso ya.

PDP napụrụ Igbo ohere ịbụ onyeisiala- Ọhaneze

George Obiozor

Ebe foto si, George Obiozor/Facebook

N'aka nke ọzọ, Onyeisi Ọhaneze bụ George Obiozotr kwuru na ihe PDP mere bụ "ịkwụ ụdọ" nakwa ịrara ndị Igbo nye" site na ịgbanwe ka o siri dị n'iwu ha oge o rutere oke ndị Ọwụwa Anyanwụ..

O kwuru na ihe PDP mere bụ ibughar iwu egwuregwu n'etiti oge egwuregwu.

N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnannịa binyere aka, Obiọzọ rụtụrụ aka na ọbụ ụzọ ịnapụ ndị Ọwụị̀a Anyanwụ ohere inweta ọkwa onyeisiala.

" Iwu PDP nke afọ 2009 isi nke Asaa, akụkụ nke Abụọ kwuru na 'Iji kwado ikpenmkwụmọtọ, nhatanha na ime nwa ka e mere ibe ya, pati a ga-eso usoro ị na-ebugharị ọkwa pati nakwa ọkwa ọchịchị na mpaghara na mpaghara.'"

"Ị na-eke ọkwa onyeisiala eke ma na-ebugharịkwa ya ya ma o ruo oge ọ ga-erute ndị Ọwụwa Anyanwụ, ha kwuwe ihe ọzọ bụ ịnapụ ndị Ọwụị̀a Anyanwụ ohere onyeisiala."

Gịnị bụdị 'zoning'?

'Zoning' bụ nkwekọrịta ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị nwere ike ọkwa ọchịchị nakwa nke pati ha na mpaghar isi dị na Na Naijiria iji hụ na a na-eme onye ka emere ibe ya.

Ya bụ nkwekọrịta gbadoro ụkwụ na ijikọta ihe karịrị agbụrụ karịrị narị atọ na iri ise enwere na Naijiria nakwa okpukperechi dị iche iche.