BBC Igbo Town Hall Meeting: Tinubu akala nka ịzọ ọkwa onyesiala- Pete Edochie, Uche Nworah na ndị ọzọ

Ebe foto si, Uche Nworah, Peter Edochie
Onye ihe ejije a ma ama bụ Pete Edochie ekwuola na Tinubu na ụfọdụ ndị ọzọ pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 akala nka ịzọ ọkwa ahụ.
Edochie kwuru nke a n'abalị Wenezde dịka ọ nọ na-agbakọ ogbe nke BBC Igbo haziri a kpọrọ "BBC Igbo Townhall Meeting' na Bekee nwere n'ikuku, nke isi okwu ya bụ "Gịnị mere onye Igbo ịbụ onyeisiala Naijirịa ji ewu ugbua?
N'ajụjụ ihe o chere maka ndị dịka Bola Ahmed Tinubu pụtara ịzọ ọkwa onyeisiala afọ 2023, Edochie sị, "Ọtụtụ ndị dịka Tinubu akaala nka, ahụ adịghịzịkwa ha ịzọ ọkwa onyeisiala."
"O teela ọchịchị a gụwara ya (Tinubu) agụ, rue oge e mere ya onye ndu APC. O nwere ka e si nwee nghọta na ọbụrụ na Buhari chịchaa o rutu ya."
"Mana ndị a katara ahụ, ahụ adịghịzịkwa ha, ka anyị kwuo eziokwu."
"Taa adị m afọ 75. E nwere ike na-ele m anya m bụrụ sọ mma mana m gwa gị ọgwụ m na-aṅụ i mere m ebere."
N'okwu ihe mere Igbo ịbụ ọ bụ nkata a kpara akpa mere na ọkwa onyeisiala erutebeghị ndị Igbo aka na Naijiria.
Na nzaghachị onụ na-ekwuru pati APC na Legọs bụ Joe Igbokwe asaala ụfọdụ okwu ndị mmadụ na-ekwu nke sị na ahụ adịghị onye ndu APC bụ Bola Ahmed Tinubu.

Igbokwe mgbe ọ na-aza BBC Igbo ajụjụ banyere ahụike Tinubu, sị na ahụ ka siri Tinubu ike dịka nwokoroọbịa.
Ọ sị na "Tinubu dị ka agụ abụọ na ọ bụghi otu, na ọ dị naanị afọ iri asaa ebe Biden nke Amerịka dị afọ iri asatọ na atọ".
Igbokwe sị na ọ bụ asịrị ka ndị mmadụ na-akọ sị na ahụ adịghị Tinubu kama na ọ dị ka ehi gbara abụba.
Edochie,onye kwuru na"onye Igbo ikpeazụ chịrịla Naịjirịa bụ Aguiyi Ironsi, ndị niile so ya bụzị ndị ugwu na ndị Yoruba"sị na ọ bụ nsị Chukwuma Nzeogwu nyụrụ n'ụlọụka butere Igbo mkpachapụ a na-eme Igbo.

Ebe foto si, Pete Edochie
Ọ sị, "Ọ bụ nkata akpara akpa kemgbe iwegharị ọchịchị nke a sị Chukwuma Nzeogwu nọ n'isi ya bụ ihe kpapụrụ ndị Igbo n'ọchịchị ọkachasị nke onyeisiala Naịjirịa."

Edochie, onye kwuru na o ruola ka ọkwa onyeisiala rute onye Igbo aka sị na ha zuru ka eme n'ụdị ọbụla.
"Ndị Igbo na-etinye aka n'ọrụ mmepe obodo dị ịcheịche na Naịjirịa nakwa mba ofesi nke bụ na anyị tozuru etozu n'ọrụ ọchịchị. Anyị nwere akọ na uche e ji achị nakwa emepee obodo" "I lee anya n'ọrụ egwuregwu, ime ejije, ide akwụkwọ, na ihe ndị ọzo, ndị Igbo pụrụiche ma bụrụ ndị na-emesi ihe ike."
Ike ọkwa Onyeisiala adịghị n'iwu Naijiria mana...-Chinwendu Ndụka Edede

Ebe foto si, Ókaiwu Chinwendu Edede
N'okwu ihe iwu Naijiria kwuru maka ọchịchị irute ndị Igbo, Ọkaiwu Chinwendu Ndụka Edede sịrị na ike ọkwa onyeisiala eke n'etiti agbụrụ na ibe ya dị na Naijiria adịghị n'Iwu Naijiria 1999,
"Mana nke bụ eziokwu bụ na ndị Ugwu anọọla ogologo oge nke na ọ dịzị ka ọ bụ oke nke naanị ha site n'afọ nne ha."
" E nwere ndị Igbo tozuru ịchị nke bụ na n'ezie o ruola ka e ekewe ọkwa onye ga-achị nke mere ka ọtụtụ na-eti mgbu onyeisiala onye Igbo mana Iwu Naijiria ekweghị maka ya.
A na-emegbu ndị Igbo n'ezie mana ndị Igbo nwere agba mechiri ọnụ- Uche Nworah

Ebe foto si, Uche Nworah
N'okwu ya, dị ọzọ tinyekwara ọnụ n'okwu dịka Uche Nworah bụbụ onyeisi ụlọrụ Ntaakụkọ Anambra State Broadcasting Service(ABS) bụ Uche Nworahahụ kwadoro Edochie.
Nworah, onye kwuru na a na-akpagbu ndị Igbo na Naijiria mana ndị Igbo welitere isi mechiri ọnụ, kwuru na ''Ihe mere anyị ji achọ ọchịchị onye Igbo na ntuliaka 2023 bụ maka okwu ikpo oke."
"Ndị Igbo sị "E mee nwata ka e mere ibe ya obi a dị ya mma", ya mere okwu ọchịọchị onye Igbo ji dị mkpa."
"Ndị Igbo na-eme ezigbo ihe na Naịjirịa, ndị Igbo na-arụpụata ọrụ ọma, anyị nwere ihe e ji eme ọchịọchịm anyị nwere ndị mmadụ tozuru ịchị Naịjirịa ugbua."
Nnwuchi a nwuchiri Nnamdi Kanu so na mmegbu a na-emegbu Igbo- Ọkamuta Anthony Ejiofor
Onyeisi otu World Igbo Congress bụ Ọkammụta Anthony Ejiofor sịrị bụ onye ji nnwuchi a nwuchiri Nnamdi Kanu were maa atụ kwuru na a na-emegbu ndị Igbo emegbu.
"Nke bụ eziokwu bụ na ana-akpapụ ndị Igbo, " "I lee anya, enweghị ihe m hụrụ Nnamdi Kanu mere, naanị okwu ọnụ ka o kwuru mana anwụchịe ya".
Gịnị mere onye Igbo ịbụ onyeisiala Naijirịa ji ewu ugbua?

Otu n'ime okwu akpụ n'ọnụ ọkachasị n'ọwụwa anyanwụ Naijirịa bụ maka onye Igbo ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa nke 2023.
Ọ bụ n'elekere asaa nke abalị taa ka ya bụ nrụrịta ụka ga-ebiri ọkụ.
BBC Igbo kpọtara ndị ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara ndị Igbo ka ha tinye ọnụ na ya bụ ọkwụ.
Kedụ ihe ndịa ga-ekwu maka ya?
Ndị a ga-etinye ọnụ n'ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ gbasra isi okwu nrụrita ụka nke bụ" Gịnị mere onye Igbo ịbụ onyeisiala Naijirịa ji ewu Ugbua?".
Ndị ga-eme nrụrịta ụka ga-etinye ọnụ n'ihe a kpọrọ Zoning, nke pụtara na ọchịchị kwesịrị ka ebugharịa ya ka o rute mmadụ niile aka.
A na-atụanya na ndịa ga-ekwukwa ihe mere o ji dị mkpa na ọ bụị ugbua ka e kwesịrị ịhọpụta onye Igbo dịka onyeisiala Naijirịa.
Kedụ ndị ga-eme nrụrịta ụka a?
Ndị a na-atụanya na ha ga-eso mee ya bụ nrụrịta ụka gụnyere -
- Pete Edochie
- Chinwendu Nduka Edede
- Uche Nworah
- Emeka Amakeze
- Rita DAniel
- James Ogbuka Umekwe









