Peter Obi:Ihe ndị mere ọtụtụ ụmụ Naijiria ji hụ aka chịburu Anambra steeti n'anya

Ihe ndị mere ọtụtụ ụmụ Naijiria ji hụ aka chịburu Anambra steeti n'anya

Ebe foto si, Peter Obi/Twitter

Nkọwa foto, Ihe ndị mere ọtụtụ ụmụ Naijiria ji hụ aka chịburu Anambra steeti n'anya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Dịka aka chịbụru Anambara steeti bụ Peter Obi kwupụtara taa bụ Tọzde, abalị 24 nke ọnwa Maachị, afọ 2022, mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa, ebe nile malitere ịzụwa ka ahịa na soshal midia.

Nke a bụ n'ihi oke ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nwere na nwa amadị ahụ.

Obi, onye chịrị Anambra steeti malite 2007-2014 kwupụtara mmasị ya ịzọ mgbe ọ gara njem nleta hụ ndị Eze ọdinala Anambra steeti n'ọgbakọ ha.

Peter Obi

Ebe foto si, Peter Obi-Facebook

Aha nkeananụānụ, Peter Obi: 'E nweghị m obi nkoropụ ọbụla'

"Dịka ndị na-anọchite ndị obodo ụnụ dị iche iche, ihe m jiri bịa bụ ịgwa ụnụ bụ ndị nọ dịka nna m bụ na m chọrọ ịga-azọ ọkwa onyeisiala Naijiria."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Dịka aka daara n'ọgbakọ ndị Eze ọdịnala ahụ na--ege ya ntị oge o kwuru ya, aka dakwara na soshal midia ebe aha Peter Obi malitere fịọwa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@IamHenryUC sị na obi na-atọ ya rịkpọ na Peter Obi kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@Yusuf gwara ndị Igbo sị, onye amaghjị asụ, ọ sụọ n'ụkwụ ya.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Lee ihe ndị mmadụ ụfọdụ ndị mmadụ ji hụ ya n'anya:

1. Ọ bụ onye gụrụ akwụkwọmarakwa maka nkwalite akụnaụba

Peter obi bụ onye gụwara isi n'akwụkwọ.

Ọ gụrụ 'Philosophy' na Mahadum 'University of Nigeria, Nsukka n'afọ 1984.

O mechara gakwa akwụkwọ na mahadum kajara akaja n'ihe gbasara akụnaụba gụnyere Harvard Business School, Boston, USA; London School of Economics, Institute for Management and Development, Switzerland wdg.

Tupu ọ banye na ndọrọndọrọ ọchịchị, Obi bụ ojiegoachụego. Ọ rụkwara ọrụ n'ụlọakụ bụ ebe ọ rịruru ọkwa welitere isi.

2. A na-ahụta ya dịka onye na-akwụwa aka ọtụ

Otu n'ime ihe ụfọdụ ji ekwupuru Obi bụ nkwenye n' onweghị anyaukwu.

Otu onye nọ na Twitter kpọrọ onwe ya Arinze Odira kwuru na ụlọ Obi n'obodo ya bụ Agulụ adịghị ka nke ọgranya ma ya fọdụ nke onye bụbu gọvanọ.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Dịka e ji ịgbawa akpaego gọọmentị mara ndị nọọrọla n'ọkwa ọchịchị mara ndị ndọrọndọọ ọchịchị , oge ọ hapụrụ ọkwa gọvanọ Anambra steeti, o gosiri na ya pụrụ iche site n'ịhapụ ego dị njeri Naira iri asatọ na isii(86 bn)

3. Ihe gbasara ọchịchị obodo were ya anya

Ọtụtụ ma Peter Obi dịka onye anaghị emefu ego oge ọ nọ n'ọchịchị.

O kwutula na mkparịtaụka sị, " Ọ bụrụ n m hie n'ụlọ oriri na nkwari a sị m kwụọ N250, 000 maka otu abalị, ụra agaghị ekwe atụ m n'ihi na ọ ga-adị m ka ha e zuru m ohi."

E wezụga nke a, ndị Anambra agaghị echefu Peter Obi maka ọrụ mmepe obodo o wetara na steeti ha bụ ebe ọ rụrụ ọtụtụ okporoụzọ.

Obi mekwara ka ọnọdụ agụmakwụkwọ Anambra steeti kawanye mma dịka o were ụlọakwụwọ nyeghachi n'aka ndị ụka nwebu ha na mbụ ma na na-enyekwa ha ego nkwado kwamgbe kwamgbe.

Anambra steeti bụ ebe ụmụaka nwoke na-ajọbụ ụjọ akwụkwọ malitere mewe ọfụma n'ule Waec(site n'ogogo iri abụọ na isii gaa ogogo atọ na ndị kachasị eme ọfụma na Naijiria) nakwa ule e ji aba mahadum.

Obi gbanwekwara ọnọdụ ahụike na steeti, ma kpọbatakwa ndị mba ofesi itinye ego steeti ahụ.

Aha onyonyo, Ihe ndị ma Peter Obi nwere ikwu maka ya
  • A mụrụ Peter Gregory Obi n'Ọnịcha na 19 July 1961.
  • Ọ gara ụlọakwụkwọ Praịmarị Sancta Maria Primary School Onitsha nakwa ụlọakwụkwọ sekọndịrị Christ the King College, Onitsha.
  • O nwere ụmụnne anọ.
  • Ọ gara mahadum University of Nigeria, Nsukka (B.A), Lagos Business School, Nigeria, Harvard Business School, Boston, London School of Economics, Columbia Business School, New York nakwa Institute for Management Development, Switzerland
  • A ma ya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị na onye oji ego achụ ego.
  • Ọ bụ osote Atiku Abubakar na ntuliaka 2019 n'okpuru otu patị People's Democratic Party PDP.
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Ododziakụ Margaret Brownson Usen n'afọ 1992. Ha mụrụ ụmụ abụọ.