2019:Ndị Igbo akwadoghị Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị ndu n'ala Igbo akatọọla akụkọ sịrị na ọ bụ ma Onyeisiala Mohammadu Buhari o were ọchịchị n'afọ 2019 ga-eme ka onye Igbo nwe ike ịchị n'afọ 2023 kwuo na ọ bụ okwu ọnụ ụtọ.
Onyeisi otu pati United Progressive Party (UPP) bụ Chekwas Okorie gwara BBC Igbo na mkpebi a abụghị maka otu pati, na ọ bụ dịka ụmụ afọ Igbo ha bụ.
O kwuru na onweghị etu pati na-ama ọchịchị aka n'ihu ga-eji hapụ otu nke ya bịa na-akwado ọchịchị ọ na-ama aka n'ihu.
Okorie kwuru na ọ na-ekwuputa uche nke ya, mana ebe ọ bụ na ndị ọzọ na-ekwu otu ihe ahụ, ọ pụtara otu ihe a metụtara onye ọbụla dịka ndị Igbo.
Gee ihe Chekwas Okorie kwuru ebe a;
Ndị ndu n'ala Igbo ndị ọzọ katọrọ atụmatụ ahụ gunyere; onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ahụike bụ ABC Nwosu, onyeisi ọhanaeze ndị Igbo n'oge gara aga bụ Dọkịta Dozie Ikedife, onyeisi ndị Sịnetị mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Enyinnaya Abaribe nakwa onyeisi ndị Eastern Consultative Forum(ECA) bụ Elliot Ugochukwu-Uko.
Cheta n'oge gara aga, otu onye na-agbasa ozi maka onyeisiala na mpaghara ọwụwa-anyanwụ bụ Osita Okechukwu kwuru na Buhari bụ otu ụzọ pụtara ihe ndị Igbo ga-eji nweta ọchịchị onyeisiala.
O kwuru na Buhari e merela ndị Igbo oke ihe kwesiri iji rita mkpụrụobi ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











