Plateau Steeti: 'Baba oyoyo' ọ pụtara Buhari bịa chịa anyị ọzọ?

Muhammadụ Buhari

Ebe foto si, @bashirahmed.

Nkọwa foto, Muhammadụ Buhari kpọpere trakụtọ nari anọ oge o mere njem na Plateau steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị mmadụ nupụtara n'igwe ịnabata onyeisiala bụ Muhammed Buharị oge ọ gara njem nleta na Plateau steeti na nsonso.

Ọtụtụ ha pụtara n'ezi dị n'ụzọ ebe ewumewu ndị Buhari gara imepe dị na-eti, 'Baba oyoyo,' na-efere ya aka.

Agwa ha kpasara Buhari tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ na anya dịka e nwerela ọtụtụ ndị ọnụ na-eru na okwu dịka Olusegun Obasanjo na Ibrahim Babangida na Naijiria ndị katọrọ Buhari maka etu akụnaụba na nchekwa ala Naijiria siri kụọ afọ n'ala, ma gwa ya ka ọ hapụ ịzọ ọchịchị ọzọ n' afọ 2019.

Mana ụdị nnabata e nyere ya na Plateau steeti palitere ndọrịtaụka n'etiti ndị mmadụ. Ndị hụrụ Buhari n'anya na-ekwu na ogosiri na Buhari ka bụ mmadụ oha, onye a hụrụ na-anya nke ukwu nke na ọ zọ ọkwa ọchịchị na afọ 2019, a ga-atụnyere ya akwụkwọ.

Ha sị na o nwere ezi ohere inweta ọkwa onyeisiala ọzọ.

Lee ihe ndị hụrụ Buhari n'anya na-ekwu n'igwe okwu Twitter:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana ndị ọzọ na-ekwu na ịpụta n'ụzọ na-eti mkpu,efe aka abụghị ụzọ e ji ama onye ọha hụrụ n'anya, kama ọ bụ ntụliaka ga-ekwu onye bụ onye.

Nwafọ Igbo ma bụrụkwa onye otu pati UPP bụ Chekwas Okorie sịrị na ihe ọtụtụ ndị mmadụ ji pụta bụ na ndị mmadụ na-apụtakarị ịbịa hụ ndị ọchịchị.

O kwukwara na e nwe ọbịa pụrụiche, na gọọmenti ụfọdụ na-emechi ahia, ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Okorie gara n'hu kwuo na nke a apụtaghị na onye ahụ ga-emerị na ntuliaka.

" Ọ bụghị ikwụ n'ụzọ na-efe aka ka a ga-eji mara onye a ga-etinyere akwụkwọ na ntụliaka, ọ bụ nkwa e kwere ekwe nke e meghị ka a ga-atụle."

Ndị na-agba mbọ ka ndị mmadụ nweta ikike dịrị ha kwenyere n'ihe Okorie kwuru.

Otu onye n'ime ha bụ Jude Ohanele sị na ndị na-apụtakarị ma ndị ọchịchị bịa njem bụ ndị enweghị ọrụ.

"Onye ọbụla bụ onye ọchịchị gara n'obodo dịka Naijiria obodo ndị mmadụ na-enweghị ọrụ, ndị mmadụ ga-apụta. Ọ bụrụ na ndị mmadụ nwere ọrụ, ha agaghị apụta. Oke ndị mmadụ pụtaranụ na-egosi ndị anamachọọrụ."

David Anyaele kwuru na ọ bụ n'oge ntuliaka ka e ji ama onye ọha hụrụ n'anya n'ezie.

N'okwu ya, "Agaghị eji etu ndị mmadụ siri gbapụta kele onye ọchịchị mara onye ga-atunyere ya n'ihi na ihe ndị a niile e nwere ike ịzụta ha n'ahịa."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ