Buhari: Kedu ka Ị ga-esi nyere Naijiria aka?

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Naịjirịa si na gọọmenti ya

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari, akpọkuola ndị Naịjirịa niile, ọkachasị ndi ọnụ na-eru n'okwu, ka ha dị nkwado ichụ aja nke ga-enye aka mee ka Naịjiria too.

Buhari kwuru okwu a na Daura n'ụbọchị ụka mgbe ya na ndị a kpọrọ "Katsina Senior Citizens" nwere nzukọ.

Ọ gakwara n'ihu wee kwuo na ndụ mba ọbụla, a na-enwe mgbe ndị mmadụ kwesiri ịchụ aja ma ha chọ ka obodo ga n'ihu.

Onyeisiala gwara ndị otu ndị gọvanọ nke a kpọrọ "Governors Forum" na bekee nke Gọvanọ Katsina steeti bụ Aminu Masari duru bịa si: "Naịjiria nke oge anyị chọrọ ka ndị be anyi niile were gbaputa ya n'ime mpụ na aghụghọ, ọkpa na-agaghi n'iru."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Buhari kwere otu ndị gọvanọ nkwa na nchekwa mmadụ na akụnụba ndị Naịjirịa niile ga na-enweta mgbado anya ya ọfụma.

Ka ọ na-asa ya, Govanọ Masari sị na ndi otu ya bịara be Buhari mgbaru maka mmadụ abụọ nwụrụ na be ya.

Ha kenekwara onyeisiala maka mberede okporoụzọ metụtara nwa ya nwoke bụ Yusuf.