Ntuliaka Italy: Etu osi gbasa gị

Ebe foto si, AFP/Getty
Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke pụtara ọhụrụ a na-akpọ 'M5' maọbụ 'Five Star Party' bụ ndị jisike na-enwe ntuliaka kachasị.
Ihe nke a tụrụ ndị mmadụ na-anya maka na ha bụ party ọhụrụ onyeisi ha bụ onye na-akpa ọchị a kpọrọ Guiseppe 'Beppe' Grillo.
Odinihu mba Italy nọ n'ajụjụ ugbu a maka na ihe pụtara na ntuliaka nke a egosighị onye mmeri.
Ndị otu ndọrọndọrọ dị ịcheịche dịka Lega Nord, Five Star na League ka ọ dịziri ị kpakọrịta etu ha ga-esi kekọrịta n'ọchịchị.
Ndị ọkachamara na ihe gbasara ndọrọndọrọ kwuru na nke a ga-ewe ihe ruru ọtụtụ izuụka maọbụ ọnwa tupu e nwe nkwekọrịta.
Dọkịta Prince Ndụka Alum onye Igbo bị n'Italy gwara BBC Igbo ọtụtụ ihe n'ekwentị.
Ọ sị na ihe pụtara na ntuliaka nke a agaghị agbanwe obibi ka ndị mmadụ siri chee. Ọ sị na ọ chere n'ihe ga na-aga etu o sị aga ugbu a.
Ọ gwara BBC na ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị mmadụ achọghị ndị mbiara mbiara mana iwe ndị ahụ abụghị maka ndị sị na mba Afrịka.
Alum kwuru na ọ bụ egwu ndị na-eyi ndụ egwu kachasị ndị mbịara mbịara ala Asia na-atụ ndị mmadụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










