N'Italị, a nwụchiela onye gbara ndị mbịarambịara si Afrịka egbe

Ebe foto si, EPA
Ndị uwe ojii nke mba Italy anwụchiela otu nwoke a kpọrọ, Luca Traini, nke e chere na ọ bụ ya gbara ndị mbiarambiara ndị Afrịka egbe n'obodo Macerata, ụbọchị Satọde atọ nke ọnwa Febụwarị.
Ndị ntaakụkọ kọwara na mmadụ isii merụrụ ahụ, ebe otu n'ime ha merụrụ ajọ ahụ.

Ebe foto si, EPA
A na eche na- agbamegbe ahụ metụtara ikpaoke agbụ n'ihi na a nwụchiburu otu nwafọ Naijiria maka ọnwụ 29-year-old Nigerian maka ọnwụ otu agbọghọ dị afọ ịrị na-asatọ akpọrọ Pamela Mastropietro n'otu ọbodo ahụ.
Ọtụtụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị kpọrọ ọkụ mmekwara ọnwụ ya na mgbasa ozi ntụliaka na abịa nso tupu mkpampka ahụ mere n'ụbọchị Satọde.
Ndị uwe ọjii kwuru n' igwe okwu Twita sị: "A gbara egbe na obodo Macerata. Ndị mmadụ merụrụ ahụ. Ndị uweojii na-eleba ya anya. Pụọ na ụzọ ma gbara ebe ọbụla sara mbara ọsọ."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ha mechara kwuo n'aka akparala otu nwoke echere na ọ bụ ya gbara egbe ahụ onye ha nwetara egbe n'ụgbọala ya.
Onye na-achị obodo ahụ gwakwara ndị madụ onye nọrọ be ya oge a na-agba egbe ahụ nke mere na ọtụtụ ebe na obodo ahụ.
A kpara egbe na Via Spalato na Via dei Velini bụcha mpaghara obodo ahụ ebe a na-eme nyocha ogbugbu e gburu Pamela, onye a hụrụ ozu ya n'ime igbe akwa abụọ,









