Onyeisiala Buharị ga-aga Taraba Steeti na ndị ọzọ

Ebe foto si, Carl Court
Onye nkwuchite ọnụ onyeisiala Naịjirịa bụ Femi Adesina ekwuola na onyeisiala Muhammadu Buhari ga-aga Taraba Steeti taa.
Nke a bụ maka ọgbaghara ndị na-eyi ndụ egwu butere nakwa mkpamkpa ndị omekome na-akpa na steeti ahụ gunyekwara ọgbaghara dị n'etiti obodo dị icheiche nke butere ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ nakwa ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ruru otu narị na iri a tọrọ.
Onyeisiala Buhari gwara ndị agha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ka ha dekọọ akwụkwọ gbasara mberede ndị a merenụ.
Dịka ọ natara akwụkwọ a ma gụkwa ya nkeọma, Onyeisiala Buhari ekpebiela ị ga jiri aka ya hụ etu ihe si mee nakwa ikasi obodo na ndị o metụtara obi.
Bido taa bụ ụbọchị 5 nke ọnwa Maachị, Onyeisiala Buhari ga-aga Taraba ebe ọ ga-esi gaa Benue, Yobe, Zamfara na Rivers steeti.
Onyeisiala Buhari na-anabata nkọwa gbasara steeti ndị a kwa ụbọchị ebe ya na ndị gọvanọ na-achị steeti ndị ahụ na-akpakọrịta gbasara etu ihe si aga na steeti ha.
Onyeisiala Buhari na-akpọku ụmụ Naịjirịa niile ọkachasị ndị ọgbaghara ndị a metụtara ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka iji chụọ mpụ na ọgbaghara ọsọ ụkwụ eruala ma nwuchikwa ndị omekome ndị na-ebute ọgbaghara ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:





