Egwu ndị Fulani na-achị ehi ejidela ọtụtụ

Ebe foto si, AFP
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ ASP Abimbola Oyeyemi gwara BBC na ndị uwe ojii ebidola nyocha mmadụ iri abụọ ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị Fulani na-achi ehi dị dabatara na mpaghara Opeji nke Ogun Steeti.
O kwuru na ndị Fulani ahụ si okpuru ọchịchị Kaiama nke dị na Kwara Steeti biara ịza oku nke eze obodo Opeji kpọrọ ha ka ha bịa biri ma na-achị ehi n'ala ahụ.
ASP Oyeyemi gara n'ihu gwa ọra obodo ka ha were ọbi nwayọọ gawa ihe bụ mkpa ha na atụghị egwu ọbụla n'ihi na ndị uwe ojii adịla njikere ichekwa ndụ na akụ na ụba na steeti ahụ.
Echiche ndị mmadụ
Otu onye Opeji bụ Babatunde Adesoji gwara BBC na egwu na obi mmapụ ejidela ndị obodo ha kemgbe ndị Fulani na-achị-ehi wuchiri obodo ahụ na ngwucha izu ụka.
O kwuru na mwakpọ ndị Fulani na-achị-ehi wakporo ndị nkuzị abụọ n' ụlọ akwụkwọ, Atola Primary School dị na okpuru ọchịchị Ewekoro-North ebutela egwu n' obi ndị mmadụ.
Ndị uweojii nwụchiri ụfọdụ ndị Fulani maka mwakpọ ndị nkuzi mana ha chọpụtara na ndị ha nwuchiri abụghị ndị omekaome ahụ kama ha bụ ndị bibụ n'obodo ahụ.
Cheta na n' izu atọ gara aga, ndị Fulani na-achị ehi gburu ihe karịrị mmadụ iri asaa na Benue Steeti.
Abali ole ma ole garara aga, ogbaghara dị na etiti ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo na Plateau Steeti tara isi ihe karịrị mmadụ iri.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










