Timothy nwa George Weah ebidola ịsompi na PSG

Ebe foto si, AFP
Nwa onyeisiala Liberia bụ George Weah a na-akpọ Timothy Weah ebidola ịgba bọọlụ n'otu egwuruegwu PSG, ebe nna ya gbaburu bọọlụ na mbụ.
Timothy pụtara n'ọgbọ ụnyahụ ka PSG na Troyes sọọrọ mpi.
Ka Neymar na Kylian Mbappe anọghị n'ọgbọ maka ahụ ha merụrụ, Angel di Maria na Christopher Nkunku bụ ndị nyere goolu PSG ji nwete mmeri n'asọmpi a.
Neymar na Mbappe n'anọghị ya so nye Weah ohere ịgba n'asọmpi a.

Ebe foto si, Getty Images
Nna Timothy bụ George Weah gbaara ndị PSG bọọlụ tupu n'afọ 23 gara aga, tupu ọ gawa AC Milan.
PSG nwere asọmpi 10 n'ihu, n'ime nke ha kwesịrị inweta ọnụọgụgụ 17 ma ọ bụrụ na ha ga-ebuli iko 'French League' nke afọ a.
Ha na Real Madrid ga-ezukọ na Tusde ịgba agba Champions League nke abụọ ha. N'agba nke mbụ, Real Madrid ji 3-1 merie ha.
Onye egwu ha bụ Neymar agaghị asọmpi ọzọ n'ime 'season' a maka ahụ ọ merụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










