Ihe ị kwesiri ịma maka okpueze ala Igbo
Igwe

Onye a kpọrọ Igwe bụ eze na-achị obodo. Onye a ga-abụ onye chiri echichi dịka onye ọzọ maọbụ nze.
Ebe o bidoro
Ọ bụ ndị ọcha bụ ndị bidoro itunye ndị mmadụ ugo dịka Igwe na-ala Igbo.
N'oge gboo, ọ bụ nzụkọ ụmụnwoke a kporọ 'Ndị Ichie' bụ ndị na-achị obodo dị iche iche n'ala Igbo.
Ebe ọ kachasị
Ndị obodo dị iche iche n'Imo, Anambara, Abia na Enugwu steeti kachasị echi ndị mmadụ Igwe.
Onye na-echi Igwe
Onye ga-abụ Igwe n'ala Igbo ọbụla ga-abụ Amadi. Ọ ga-abụkwa onye chiri echichi dịka onye ọzọ maọbụ nze n'obodo ya.
Obi

Obi dịka Igwe bụ aha onye na-achị obodo ahụ n'ala Igbo. Mana ọ bụghị ọtụtụ obodo n'ala Igbo na-echi ndị mmadụ dịka obi.
Ebe aha a pụtara
O nweghi onye ga-enwe ike ikwusi ike ebe aha a pụtara, O nwere akụkọ mgbe gboo na-akọwa na aha Obi sị ala Bini n'ime Edo steeti bata n'ala Igbo.
Ebe ọ kachasị
N'ala Igbo ugbua, ọ bụ obodo dị iche iche n'ime Delta steeti na-enwekarị ndị Obi dịka ndị na-achị ha, mana obodo dịka Onitsha n'ime Anambara steeti nwekwara Obi nke ha.
Onye ka a na-echi Obi
Ọtụtụ obodo na-echi Obi na-agba mbọ hụ na ọ bụ onye sị agbụrụ ezinaụlọ Obi puta. Mana o nwere ndị obodo ọzọ na-echi onye ọbụla bụ nwaamadi obodo ahụ.
Eze

Aha Eze pụtara n'aha ugo nke a kpọrọ nze maọbụ ọzọ n'ala Igbo. A na-akpọkwa ya Ezedike, ihe aha a pụtara bụ na mmụọ ndị ichie obodo ahụ biri n'ime onye ahu bụ Eze.
Ebe ọ kachasị
Ochichi Eze bụ nke a kacha ahụ n'ala Igbo karị ochichi ndi ọzọ anyị kpọrọ aha n'ime akụkọ a.
N'ala Igbo, n'oge gboo ruo ugbua, obodo dịka Arochukwu n'ime Awka, Anambra steeti, Nri-Igbo n'ime Owere, Nsukka. Enugu-Ezike na Ovoko na Iheakpu n'ime Awka bụ ala dị iche iche ama ama ka na-echi Eze.
Dịọkpa

Ọ bụ sọọsọ ụfọdụ obodo n'ala Igbo ka na-enwe ndị Diokpa dịka ndị na-achị ha ruo ugbua. N'ime obodo dị iche iche na Delta steeti onya tokasịrị n'obodo ahụ bụ onye na-achị obodo ahu.
Ebe aha a pụtara
Ọ bụ ndị anịọma na Delta steeti kachasị echi ochichi a. Akụkọ ihe mere mgbe gboo kọwara na aha a pụtara na Akwukwu n'ime Delta Steeti, Odaigbo n'ime Ọgwashi-Uku na Delta steeti nakwa Ibuzor n'ime Delta steeti.
Onye ka ha na-akpọ Diọkpa
Ha anaghị echi 'Diọkpa'echi. Ọ bụ nwoke bụ nwa nke mbụ bụ Diọkpa ezinaụlọ ọbụla n'ala Igbo.
Onye na-achị ogbe ọbula dịka Diọkpa bụ onye kachasị n'oche n'ogbe ahụ.









