Ihe asaa nwoke Igbo chọrọ na nwaanyị ọ ga-alụ

Ebe foto si, Clarisbay/Instagram
A gbacha alabanko, oru oge ịlụ nwaanyị, nwoke bụ nwa afọ Igbo na-etinye anya na mmiri ịhọrọ nwaanyị ọ ga edulara nne ya.
BBC Igbo na ụmụnwoke Igbo agba ọhụrụ ụfọdụ nwere mkparịtaụka banyere ihe ndị ha chọrọ na nwaanyị ha ga-alụ.
Lee okwu gbara ọkpụrụkpụ pụtara ugboro ugboro n'ihe ha kwuru:
1. Nkwanye ugwu
Ọtụmadị ka nwoke Igbo nwere mmasị ebe nwaanyị chara anya dị, ọ chọghị nwaanyị ya na ya ga-na-azọ isi ezinaụlọ ya.
Nwa afọ Igbo chọrọ nwaanyị ga-akwanyere ya ugwu n'ime ụlọ ma na mbara, kwanyere nne na nna ya na ndị ezinaụlọ ya ugwu site n'okwu na omume.

Ebe foto si, Mazi Nwonwu
2. Ezi agwa
Ilu Igbo na-ekwụ sị, 'Ezi agwa ka ego'. Nwoke bụ nwa afọ na-akwado ịlụ nwaanyị, otu n'ime ihe ọ na-ajụ banyere onye ọ ga-alụ bụ o nwekwara ezi omume? Ọ bụkwa nwata nwaanyị a zụrụ azụ?
Dịka otu nwa afọ a kpọrọ Emeka Ejere si kọwaa ya, ihe e jiri mara nwaagbọghọ nwere ezi agwa na "ọ na-erube isi; mara ihe kwesịrị ime na mgbe e kwesịrị ime ya; na-ekele ekene ma na-anabatakwa ekele nke mmadụ".
3. Ntụkwasị obi
Otu n'ime ihe dịkachasịrị nwoke Igbo chọrọ nwaanyị mkpa bụ nwanyị ọ ga-atụkwasị obi.
Nwaanyị na-agba n'ezi bụ ajọọ ahịa onweghị nwoke Igbo ọ ga-amasị ịzụ.

Ebe foto si, AFP
4. Nwaanyị na-adị ọcha
Nwoke agbọ ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị na-adị ọcha ma na-edobekwa gburugburu ya ọcha.
Nwaanyị na-erụ unyi bụ agbawa-aghara ebe ndị ụmụokoroọbịa nọ.
5 Nwaanyị gụrụ akwụkwọ/na-agba mbọ
Obodo bụ igwe ugbua n'ala anyị. Onye agbasighị ike agaghị azọta onwe ya n'ihi na akụnaụba ala anyị na-agba egwu 'onye-chụta-o-rie.'
Nke a mere na ọtụtụ okorobia Igbo dịka Chinedu Uzoegbu na-achọzị ụmụnwaanyị gụrụ akwụkwọ maọbụ onye nwe ezi aka ọrụ - nwanyị na-agba mbọ.
Uzoegbu gwara BBC, "A chọrọ m nwaanyị gụrụ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ọ gụghị akwụkwọ ọ ga-adị nnjikere ịgụ akwụkwọ."
Dịka ihe siri kwụrụ ugbua, ọ bụsị onye weta, ibe ya eweta.
Oge nwaanyị ga-adịka 'Oriaku' aga-ala!

Ebe foto si, Getty Images
6 Nwaanyị nwere ọgụgụ isi
Nwoke agba ọhụrụ chọrọ nwaanyị ma ihe, onye ya na ya ga na-atụkọ alọ maka ọganihu ezinaụlọ ha.
7. Nwaanyị mara mma
E tere ogiri, etere ụgba, nwaokorobịa agba ọhụrụ Igbo chọrọ nwaanyị mara mma.
Dịka Nonso Akosa si kwuo ya, "onye ị ga-akpọ gaa ihe."









