'A ghọrọm nwụnye mmadụ na mkpụrụ ụbọchị isii'

Ebe foto si, Chidimma Amedu
Mmadụ ole na achota dị m'ọbụ nwụnye na "social media"? Mmadụ ole na-achọta di m'ọbụ nwunye ma lụ kwa ya n'ime ụbọchị isii?
Nke a bụ kwa akụkọ mere eme n'etiti otu nwanyị a na-akpọ Sophy Ijoma na Chidimma Amedụ hụtara onwe ha na Facebook.
Ọ bụ mgbe Disemba gbara ụbochị iri atọ n'otu ka Chidimma tinyere ozi o ji achọ nwunye Facebook.
Nwa agbọghọ a na-akpọ Sophy zakwara ya ozi a si Chidimma zitere ya ozi ka ha jiri ga iru.

Ebe foto si, Chidimma Amedu
Chidimma sị na ha kwuru okwu n'ekwenti tupu ya esi Abuja gawa Enugu ị ga hụrụ nwata nwanyị a.
Ọ sị kwa na otu ụbọchị ahụ orutere Enugu, ka o nwetara nkwado nke ndi be nwannyi na kwa ndi nke ya maka iga niru ịme omenala ndị ọzọ.
"ije a bidoro dịka egwuregwu maka na ozi m gbasara n'elụ igwe okwu Facebook bụ egwuregwu na mbụ," dika Chidimma sị kwuo.
Na aka ya, Sophy si na ha bụ ihe turu ya na anya.
"Ọjọ na atụm mgbe anyi gara ịhụ nnem, maka anaghịm ma o ga akwado kam lụọ nwoke m hụrụ na Facebook," Sophy gwara anyị.

Ebe foto si, Chidimma Amedu









