O doro m anya na ndị omekome ahụ chọrọ ịgbagbu Peter Obi n'Edo Steeti – Yunusa Tanko

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
Yunusa Tanko bụ onye ndụmọdụ Peter Obi agwala BBC Igbo etu ndị omekome ji egbe si wakpoo Peter Obi na ndị pati African Democratic Congress (ADC) ndị ọzọ oge ha gara mmemme iji nabata Olumide Akpata na osote na pati ha n'Edo steeti ma kwuo na o doro ya anya na ndị omekome ahụ chọrọ ịgbagbu Peter Obi.
Na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ụbọchị Wenezde 25 Febụwarị, 2026, Tanko kwuru na Peter Obi rutere n'ọdọụgbọelu dị n'Edo steeti oge ọ kụrụ elekere asatọ nke ụtụtụ n'ụbọchị Tuzde maka mmemme ahụ.
"Peter Obi gara ụlọọgwụ Philomina Catholic Hospital ebe ndị ụmụakwụkwọ nọọsụ na ndị orụ nabatara ya".
Tanko kwuru na Obi ji ohere ahụ mezuo nkwa o kwere ụlọọgwụ ahụ oge a na-arụ ya.
"Oge anyị hapụrụ ebe ahụ, anyị gara n'isiụlọọrụ pati ADC iji nabata Olumide Akpata na pati anyị, ọtụtụ ndị nkwado anyị jupụtara n'igwe ma nabata anyị n'ebe ahụ".

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
O kwuru na ọ bụ oge ha nọ ebe ahụ ka ha nwetere ozi na ndị omekome chọrọ iwakpo isiụlọọrụ ADC ahụ, nke mere ka ha mee mmemme ahụ ngwangwa ma pụọ gawa n'ụlọ John Odigie-Oyegun.
Tanko kọwara na ọ bụ oge Peter Obi, Ọkammụta Oserheimen Aigberaodion Osunbor bụbu Gọvanọ Edo steeti na ndị ọzọ so ha mee njem ahụ chọrọ ịhapụ ụlọ Oyegun gawa ọdọụgbọelu, ka ndị ojiegbe wakporo ụlọ Oyegun ma malite ịgba ha egbe.
"Ngwangwa ndị omokome ahụ malitere ịgba egbe ma mebie ọtụtụ ụgbọala, Peter Obi na ndị ọzọ laghachiri n'ime ụlọ Oyegun iji chekwaa onwe ha".
"Nke bụ eziokwu bụ na o doro anyị anya na ọ bụ Peter Obi na ndịisi pati ADC ndị ọzọ ka ndị omekome ahụ chọrọ igbu site na mwakpo ahụ ha mere".
Ka ọ dị ugbua, Tanko kwuru na ụfọdụ ndị nkwado pati ADC merụrụ ahụ site na mwakpo ahụ nọ n'ụlọọgwụ dị iche iche eweta nleta.
N'aka nke ọzọ, Peter Obi katọrọ mwakpo ahụ ma kwuo na ọ bụ ihe ịma aka nye ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjirịa.

Ebe foto si, Yunusa Tanko/X
Ihe gọọmenti Edo steeti kwuru maka mwakpo ahụ

Ebe foto si, Monday Okpebholo/X
Gọvanọ Monday Okpebholo na-achị Edo steeti akatọọla mwakpo ahụ ndị omekome wakporo Peter Obi na ndị otu pati ADC steeti ya.
Gọvanọ Okpebholo kọwara mwakpo ahụ dịka mpụtara nsogbu pati ADC na-enwe n'ime onwe ha.
N'okwu ya "Dịka aka na-achị Edo steeti, ekwerenye m na a kpọbatara ndị omekome ahụ iji tee Edo steeti unyi n'ihu".
"Agaghị m ekwe ka ndị mmadụ kpọbata ndị omekome na steeti ya iji metọọ, tinye ọgbaghara ma gbochie mbọ gọọmenti m na-agba iweta udo na steeti anyị".
Gọvanọ Okpebholo kwuru na o doghị anya ihe bụ ebumnobi ndị omekome ahụ mana gọọmeti ya ga-egbochi ndị maọbụ otu ọbụla chọrọ itisa udo dị n'Edo steeti.
Ọ kpọrọ oku ka pati ADC ghara ị na-atụ gọọmenti ya aka banyere mwakpo ahụ ma mee ka o doo anya na gọọmenti ya ga-egbochi nkata ọbụla pati chọrọ iwere ọchịchị na-akpa iji metọọ gọọmenti ya.






























