Aga m akpụpụ Bayo Onanuga n'ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ rịọghị m mgbaghara - Peter Obi

Ebe foto si, Bayo Onanuga/Peter Obi/X
Onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntụliaka afọ 2023 bụ Peter Obi ekwuola na ọ ga-akpụpụ onye ndụmọdụ Onyeisiala Bola Tinubu na mgbasaozi bụ Bayo Onanuga n'ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ rịọghị ya mgbaghara maka ebubo na ọ bụ ya na-akwado ngagharịiwe ndị ntorobịa na-akwado ime maka ihe isiike na ajọ ọnọdụ akaụnaụba Naịjirịa.
Peter Obi kwuru nke a n'ozi ndị ọkaiwu ya wepụtara taa bụ Tuzde, Julaị 23.
Ọ gwara Bayo Onanuga ka ọ gaa n'ihu kwugharị okwu ahụ o kwuru ma rịọ ya mgbaghara.
Akwụkwọ ozi ahụ gara n'ihu kwuputa na ebubo ahụ Bayo Onanuga boro ya metọrọ ezi aha ma mee ka ndị mmadụ na-ahụta ya dịka ajọ mmadụ.
O nyere Bayo Onanuga awa 72 ka ọ rịọ ya mgbaghara.
Akwụkwọ ozi ahụ kwuru na ọ bụrụ na Bayo Onanuga emeghị nke a, ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe.

Ebe foto si, Peter Obi/Tanko Mohammed
Cheta na Bayo Onanuga nọrọ ụbọchị Satode Julaị 20 depụta nnukwu ozi n'akara soshal midia X ya nke kwuru na ọ bụ Peter Obi na ndị nkwado ya chọrọ ibute ọgbaghara na Naịjirịa site na ngagharịiwe ahụ.





