"Anọ m na-ehi ụra mgbe nwaodibo ahụ kụrụ m akaọdụ mgbe ọ kugbuchara nwanne m nwoke"

Ebe foto si, BBC/Anambra News
Nwada Ogechukwu Success Nwite bụ nwanne nwaanyị nwoke ahụ nwaodibo ya ji aka ọdụ kugbuo n'Onitsha Anambra Steeti akọwaala etu ihe a siri mee.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Ogochukwu sị na ọ nọ na-ehi ụra mgbe nwaodibo ahụ a kpọrọ Chiemerie Anieka ji akaọdụ kụọ ya n'isi nke mbụọ, kụọ ya nke abụọ ma tupu ọ kụọ ya nke atọ, o jiri aka ya gbochie nwaodibo ahụ ma gbaa ọsọ ndụ ya.
"Anọ na-ehi ụra, ihe ọzọ m nụrụ bụ ihe dara n'isi ọ bụrụ akaọdụ nwaodibo ahụ kụrụ m n'isi.
"Ọ kụrụ m nke mbụ, kụọ m nke abụọ mana tupu ọ kụọ nke atọ, eji m aka m gbochie ma gbapụ ọsọ ịchọ enyemaka."

O kwuru na ọ bụ oge ahụ ka ọ chọpụtara na nwaodibo ahụ dị afọ iri abụọ na otu adịla na mbụ kugbuo nwanne ya nwoke bụ Ikechukwu Nwite bụkwa nna ukwu nwaodibo ahụ, dịka ọ hụrụ ka ọ tọgbọ n'ụlọ usekwu.
Ogochukwu bụ onye na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua kwuru na nwaodibo ahụ bi n'ụlọ ha ma na-arụrụ nwanne nwoke ọrụ kamgbe afọ atọ.
O kwuru na ọ maghị ma ọ bụrụ na nwaodibo ahụ na nwanne nwoke nwere nnukwu esemokwu, kama na ọ maara na nwanne baara nwaodibo ahụ mba maka agwa ọjọọ ọ kpara n'ụlọahịa ha.
O kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na obere nwa dị etu ahụ ga-akpa ụdịrị agwa ọjọọ a.
Mbọ niile a gbara ịnụta n'ọnụ nwunye Ikechukwu enweghi isi maka na ọtụtụ ndị mmadụ bịara iti ya aka n'obi maka ọnwụ di ya jupụtara n'ụlọ ha.
Dịka ọ dị ugbua, Chiemerie Anieka nọ n'aka ndị uweojii Anambra Steeti ugbua dịka nnyocha ka na-aga n'ihu.
Anyị anwuchiela nwaodibo a na-enyo enyo kugburu nna ya ukwu - Ndị uweojii

Ebe foto si, Anambra Police Command/Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga kwupụtara nke a n'ozi o mere ka o rute BBC aka n'ụbọchị Mọnde 16 Febụwarị 2026.
Ikenga kwuru na njinji a jiri n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Sọnde 15 Febụwarị 2026 na mpaghara Ọnịcha dị n'Anambra Steeti.
Dịka ozi ahụ Ikenga wepụtara siri kwuo, Chiemerie kụrụ nna ya ukwu akaodo n'isi ma kụgbuo ya, tupu ọ wakpoo nwunye ya.
Ka ọ dị, ndị uweojii kwuru na aka ha akparaala nwaodibo ahụ, dịka ha napụtakwara ya akaodo o jiri kpaa arụ ahụ.
"Nnyocha anyị mere kpughere na iwe were nwaodibo ahụ a na-enyo enyo n'ihi etu nna ya ukwu bụ Ikechukwu siri baara ya mba maka omume ọjọọ ya," ka ozi ahụ kwuru.
Ndị uweojii gara n'ihu kwuo, na omume ọjọọ ndị ahụ Ikechukwu jiri maka ha baara Chiemerie mba gụnyere izuru ego e mebere maka ụlọahịa ha, ịkpa ụrịrị abalị nakwa ịṅụ ọgwụike.
Ozi ahụ ndị uweojii wepụtara kwuru na a napụtara nwunye Ikechukwu ma bugaa ya ụlọọgwụ, dịka ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua.
Ikenga mere ka anyị mata na e nyefeela okwu a n'aka ngalaba ndị uweojii na-enyocha mpụ dị n'Ọka bụ State Criminal Investigation Department n'asụsụ Bekee, maka ime nnyocha n'uju iji hụ na e nwetara ikpe ziri ezi.




























