Obi jupụtara Gọvanọ Soludo n'aṅụrị mgbe ọ gara hụụ mmepe Onitsha Main Market

Gọvanọ Chukwuma Soludo mgbe ọ gara njem nleta n'Onitsha Main Market.

Ebe foto si, Screenshot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọvanọ na-achị Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo egosipụtala obi ụtọ ya dịka ahịa Onitsha Main Market zụrụ ahịa n'ụbọchị Mọnde 02 Febụwarị, 2026.

Nke a na-abịa dịka ọ gara njem nleta n'ahịa ahụ iji hụụ ma ha rubereisi n'iwu nkwụsị ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla o nyere.

Dịka Soludo na ndị ọrụ ya kpagharịrị n'ahịa ahụ n'ihe dịka ọkara gafee elekere abụọ nke ehihie, ọ hụrụ ka ọtụtụ ụlọahịa mepechara emepe nakwa ndị na-ere ahịa nọcha n'ụlọahịa ha.

O kwuru na obi dị ya mma n'etu ha si gaa ntị n'iwu o nyere ma pụta ịzọ ahịa n'ụbọchị Mọnde, ọ gara n'ihu kwuo ka ha na-eme nke ahụ na-aga n'ihu.

"Obi dị m ụtọ ka unu si rubeisi n'iwu a ma mepee ụlọahịa unu, nke gosiri na ahịa Onitsha Main Market emepeela.

"Dịka ahịa Onitsha mepere, Anambra na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile emepeela."

Soludo gara kelee ndị ahịa niile maka agwa a ha kpara.

"Chukwu gọzie unu niile, ahụrụ m unu n'anya nke ukwuu."

Etu 'sit at home' siri metụta ndị Abia na Imo steeti

Ndị bi na mpaghara ala Igbo apụtaghị ezi n'ụbọchị Mọnde 21 Ọktoba na Tuzde 22 Ọktoba 2024 n'ihi iwu onye apụtakwala ezi a maara nke ọma dịka 'sit at home' ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nyere.

Ahịa Onitsha Main Market amalitela ịzụ

Ndị mmadụ kpọsara ahịa ha n'ime ahịa Onitsha Main Market

Dịka otu izuụka Gọvanọ Chukwuma Soludo nke Anambra Steeti mechichara ahịa ukwu Onicha dị na steeti ahụ, a na-atụ anya na ahịa ga-amalite zụwa ọzọ.

Nke a mere onye ntaakụkọ BBC Igbo jiri gaa n'ogbe ahịa ahụ na gburu gburu ya iji chọpụta "etu eke si anya anwụ".

N'ihe dịka elekere itoolu nke ụtụtụ Mọnde ụbọchị abụọ nke ọnwa Febụwarị, 2026 mgbe onye ntaakụkọ BBC ruru n'ahịa, ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị na-ere ihe n'ahịa ahụ bịara ahịa.

Ndị mmadụ na-akpagharị n'okporoụzọ dị n'ime ahịa Onitsha Main Market.

Ụfọdụ n'ime ha ji nwaayọ na-emepesi ụlọahịa ha ebe ndị ọzọ kwụụ n'ihu ụlọahịa ha na-enyere oge tupu ha emepe.

Ọ chọpụtakwara na e nwere ụfọdụ ebe ndị ka gbara chakoo n'ahịa ahụ dịka ọtụtụ ụlọahịa ka mechiri emechi.

Cheta na Gọvanọ Soludo nyere iwu ka e mechie ahịa ahụ ruo otu izuụka maka nnupuisi ha mere n'iwu o nyere sị ka a kwụsị ịnọ n'ụlọ n'ụbọchị Mọnde ọbụla.

Mana mgbe ọ gara mkpaghara n'ahịa dị iche iche na steeti ahụ n'ụbọchị 26 Jenụwarị 2026, ọ chọpụtara ndị ahịa emepeghi n'ụbọchị ahụ, nke mere o jiri mechie ya.

Nwoke yi uwe mme mme na-akpọsa ngwaahịa ya n'ụlọahịa ya dị n'Onitsha Main Market.

Ụfọdụ ndị na-ere ahịa gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ha emepeela ahịa kama na o nwebeghi ndị bịara zụọ ha ahịa.

Ha kwuru na ha nwere olileanya na ndị na-azụ ha ahịa ga-abịa gbaa ha aka ahịa.

Otu nwaanyị na-ere ihe n'ahịa ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ahịa ahụ e mechiri kamgbe otu afọ wutere ya nke ukwuu maka na ego adịghị ya n'aka.

O kwuru na obere nke o ji azụ ahịa n'afọ ọhụrụ ka ọ bịara na-emefu n'ime otu izuụka ahụ.

Kepu kepu ọzọ BBC Igbo nwetere bụ na Gọvanọ Soludo ga-abịa n'ahịa ahụ ịmara etu ndị mmadụ si rubee isi n'iwu o nyere.

Ndị ahịa bu ngwaahịa ha na-agagharị n'ime ahịa Onitsha Main Market.

Etu mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ndị ọzọ dị

Ọgbatumtum Keke Napep jupụtara n'okporoụzọ dị n'Aba, Abia Steeti.

Dịka ahịa zụrụ n'Anambra Steeti, e nwere ụfọdụ steeti ndị ọzọ ahịa azụghị n'ụbọchị Mọnde a.

N'ebe dịka Aba dị n'Abia Steet, Ọnụụzọ e si abanye n'ọtụtụ ụlọahịa dịka Ahịa ọhụrụ, ahịa Arịarịa, Ehere shopping centre na ndị ọzọ mepere emepe, mana ndị na-azụ na-ere ma na-azụ ahịa apụtaghị.

Ụlọakụ nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ dị n'obodo ahụ gbachiri agbachi dịka ndị mmadụ na-adọrọ ego n'igwe ATM.

Mana obodo dịka Umuahia bụ isiobodo Abia Steeti, ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị ha. Ụlọahịa, ụlọakụ nakwa ụlọọrụ mepechara emepe.

Na steeti Ebonyi, o nweghi ihe ọbụla dịka ịnọ n'ụlọ, ndị ahịa, ụlọakụ, ụlọakwụkwọ mepechara emepe ebe ndị mmadụ na-aga mkpa ha.

Ụfọdụ okporoụzọ dị n'Aba gbatụrụ chakooo.