Etu ‘sit at home’ siri metụta ndị Abia na Imo steeti
Ndị bi na mpaghara ala Igbo apụtaghị ezi n’ụbọchị Mọnde 21 Ọktoba na Tuzde 22 Ọktoba 2024 n’ihi iwu onye apụtakwala ezi a maara nke ọma dịka ‘sit at home’ ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nyere.
Ọnọdụ ahụ metụtara steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa gụnyere Abịa, Anambra, Ebonyi, Enugwu na Imo steeti.
Oge ndị ntaakụkọ BBC Igbo gagharịrị n’ụfọdụ obodo a ma ama na steeti ndị ahụ, ha chọpụtara na ndị mmadụ rubere isi n’iwu ahụ nke ọma n’ihi na ọtụtụ ụlọahịa, ụlọakwụkwọ na ụlọorụ mechiri emechi ebe okporoụzọ niile tọgbọrọ chakoo.
Ụfọdụ ndị a gbara ajụjụ kwuru na ọnọdụ ahụ na-emetụta ha n’ụzọ ọjọọ ma kpọọ gọọmenti oku ka ha gbata ọsọ enyemaaka iji hụ na a kwụsịrị ya.
Cheta na IPOB nyere iwu ka ndị bi n'ala Igbo hara ịpụta ezi n'ụbọchị Mọnde na Tuzde iji gosi iwe ha maka onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu gọọmenti Naịjirịa jichiri kemgbe ihe ruru afọ atọ.
Ndị Imo achịbala ụkwụ n'ụlọ n'ihi 'sit at home'

Ndị Imo steeti ewerela ụjọ rube isi n’iwu onye apụtakwala ezi IPOB nyere ndị bi n’ala Igbo iji zere ndụ.
Ozi anyị nwetara n’isi obodo steeti ahụ bụ Owerri kwuru na ndị mmadụ gbasoro ntụziaka ahụ IPOB nyere n’ụbọchị Mọnde nakwa Tuzde.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo kpagharịrị na mpaghara Egbu Road, Fire Service Junction, Wetheral Road, Mbaise Road, Bank Road, Port Harcourt Road, Amakohia-Akwakuma Road, Onitsha Road, World Bank Road, Naze-Aba Road nakwa ebe ndị ọzọ a ma ama wee chọpụta na ebe niile tọgbọrọ chakoo dịka ọ hụrụ naanị mmadụ ole na ole.
Ka o siladị, ọ sịrị na ndị ọrụ nchekwa kwụchiri ụzọ n’ụfọdụ ogbe dịka na Fire Service Junction, Onitsha Road, Naze-Aba Road na ebe ndị ọzọ iji hụ na enweghị mbibi iwu maọbụ ndụ na ngwongwo ndị mmadụ.



Aba na Onitsha dịzịkwa ka ebe a gbara ọsọ agha maka iwu 'Sit at home' IPOB nyere
Egwu ekweghịzikwa ka ndị bi na mpaghara Onitsha, Anambra steeti na ndị bị n'Aba, Abia steeti pụta gaa mkpa ha taa.
Nke a bụ maka iwu otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nyere maka ọnọdụ abalị abụọ onye apụla ezi na mpaghara ọdịda anyanwụ Naịjirịa.
BBC Igbo gagharịrị na steeti abụọ ahụ ma chọpụta na ọdụ azụmahịa, ụlọakwụkwọ, ọdụ ndị ọkwọ ụgbọala kpọchiri akpọchi iji rube isi nye iwu ahụ otu IPOB nyere.




Ebonyi, Umuahia erubela isi n’iwu 'Sit at home' IPOB nyere

Ebe foto si, Mmeregini Chidi
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
E nwere ụjọ n’isi obodo Ebonyi steeti bụ Abakaliki n’ihi iwu onye apụtakwala ezi mkpụrụ ụbọchị abụọ otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nyere.
Ọnọdụ ahụ mere ka ọtụtụ mmadụ rube isi n’iwu ahụ n’ụbọchị Mọnde 21 Ọktoba 2024.
Onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara na ọtụtụ ahịa, ụlọakụ, ọdọ mmanụ ụgbọala na ụlọọrụ ndị nkịtị agbapeghị n’ụtụtụ Mọnde n’Abakaliki.
Ọ chọpụtara na ọtụtụ okporoụzọ tọgbọrọ chakoo mgbe ọ kụrụ ihe dịka elekere asatọ nke ụtụtụ iji gosi na ọtụtụ mmadụ rubere isi na ntụziaka IPOB.
Ụfọdụ ndị a jụrụ ajụjụ chọrọ ka gọọmenti weta ọnọdụ ahụ n’isi njedebe n’ihi na ọ na-akụnyere akụnaụba ndị Igbo ụkwụ ọjọọ.
Ka o siladị, ọ hụrụ ndị uweojii ka ha na-akpagharị n’okporoụzọ ndị a ma ama n’isi obodo steeti ahụ iji hụ na e chekwara ndụ na ngwongwo ndị mmadụ.
Otu ihe ahụ ka a hụkwara n'isi obodo Abịa steeti bụ Umuahia dịka okporoụzọ na ụlọọrụ dị iche iche tọgbọrọ chakoo oge onye ntaakụkọ BBC Igbo gagharịrị ebe ahụ.
Cheta na IPOB nyere iwu ka ndị bi n'ala Igbo hara ịpụta ezi n'ụbọchị Mọnde na Tuzde iji gosi iwe ha maka onyendu IPOB bụ Nnamdi Kanu gọọmenti Naịjirịa jichiri kemgbe ihe ruru afọ atọ.

Ebe foto si, Mmeregini Chidi
Umuahia tọgbọrọ chakoo n'ihi iwu IPOB















