DSS amachiela Nnamdi Kanu ịhụ onye ọbụla ọzọ - Aloy Ejimakor

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor ekwuola na ụlọọrụ Department of State Service (DSS) erupula isi n’iwu ụlọikpe nyere ma gbochie Nnamdi Kanu ịhụ ndị ọkaiwu ya.
Ọkaiwu Aloy Ejimakor kwuru na ụlọikpe nyere iwu ka Nnamdi Kanu nwee ohere ịhụ ndị ọkaiwu ya mana ndị ọrụ DSS gbochiri ya ịhụ Nnamdi Kanu oge ọ gara ịhụ ya n’isi ụlọọrụ ha dị n’Abuja.
Ejiofor kwuru na ndị ọrụ DSS ekwebeghị ka Nnamdi Kanu hụ onye ọbụla kemgbe ọ gara ụlọikpe ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 nwee gwa ọkaikpe Binta Nyako ka o wezuga onwe ya n’ikpe ya.
Ọ katọrọ agwa ndị ọrụ DSS na-akpa ma kwuo na nnupu isi ha n’iwu ụlọikpe nyere gosịrị na ha na-echere iwu Naịjirịa aka mgba. O kwuru na ihe mere ụlọikpe ji nye iwu ahụ bụ iji nye ezinaụlọ Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya ohere ịhụ ya kwa mgbe kwa mgbe.
Cheta na Nnamdi Kanu kpọrọ oku ka Ọkaikpe Binta Nyako wezuga onwe ya n'ikpe ya.
N'agbanyeghi na ọkaikpe Nyako kwetara iwezuga onwe ya n'ikpe ahụ, Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa bụ Kudirat Kekere-Ekun nyeghachiri ya ikpe Nnamdi Kanu.
Binta Nyako: Ọkaikpe kachasị na Naịjirịa enyeghachịla ya ikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Nnamdi Kanu/Binta Nyako
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Nnaemaka Ejiofor kọwarala BBC Igbo na "etu ọ dị ugbua, o nwebeghị onye gwara ha kpọmkwem, na Ọkaikpe Nyako anabataghachịla ikpe a, mana ha gara ụlọikpe n'ụbọchị 10 n'ọnwa Ọktoba wee ghọta na ya bụ ihe emeela."
Ọ gara n'ihu kọwarala anyị na ha ekpesala ụfọdụ mkpebi ya, ha na-atụanya n'ụbọchị 17 n'ọnwa Ọktoba mgbe ha ga-enwe ohere kpee ikpe ha.
Anyị gara n'ihu jụọ ya ma ikpe a ọ ga-esizi isi bidokwa ọzọ, ọ sị anyị mba, maka na Ọkaipe Nyako bụ onye ha nọ n'aka ya kamgbe, na ọ baghị uru isi n'isi bido.
Kedụ ka ikpe Nnamdi Kanu maka beelụ ya si ga n'ụbọchị asatọ n'ọnwa Ọktober 2024 si gaa?

Na ngwụcha ụbọchị ikpe a, ụlọikpe mkpegharị Naịjirịa tinyerela Tọzde 17 Ọktoba, 2024 dịka ụbọchị ha ga-anụ mkpesa ikpe ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara banyere ụlọikpe ukwu etiti nke jụrụ inye onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB) ntọhapụ beelụ.
Mkpebi ụlọikpe ahụ nke ndị ọkaikpe atọ nọ n'isi ya pụtara ihe taa.
Ọkaiwu gọọmenti etiti bụ Adegboyega Awomolo gwara ụlọikpe ahụ na akụwkwọ ntọhapụ beelu ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara abịaghị n'oge maka oge ha kwsịrị itinye ya agafeela.
N'ikpe ha, onyeisi ndị ọkaikpe ahụ kwuru na ha chọrọ inwere oge tulee akwụkwọ ahụ ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara tupu ha enye mkpebi ha.
Ka ọ dị ugbua, ikpe ahụ ga-aga n'ihu ụbọchị Tọzde 17 Ọktoba, 2024 n'ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọikpe mkpegharị (Appeal Court) dị n'Abuja ga-anọ n'ụbọchị Tuzde 8 Ọktoba 2024 lebaanya n'akwụkwọ ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara.
Ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu gbara akwụkwọ ahụ dịka Ọkaikpe Binta Nyako nke Ụlọikpe ukwu etiti jụchara inye onyendu Indigenous People of Biafra (IPOB) ntọhapụ beelụ.
Ọzọkwa bụ n'ihi mkpebi ụlọikpe ahụ ịga n'ihu n'ikpe Nnamdi Kanu n'agbanyeghị mkpesa ndị ọkaiwu ya nyere gbasara mgbochi ndị ọrụ nchekwa DSS.
Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nọọrọ n’ụbọchị Tuzde 24 Septemba 2024 wezuga onwe ya n’ikpe Nnamdi Kanu oge nwaamadị ahụ kwuru na ya enwezighị ntụkwasịobi na ọ ga-ekpe ikpe ziri ezi.
Cheta na Gọọmenti Naịjirịa na-ebo Nnamdi Kanụ ebubo ịkwado iyi ndụ egwu, ịgba Naịjirịa mgba okpuru na ịkpalite ọgbaaghara na nnupụisi.
BBC Igbo ga-aga ụlọikpe isonye akụkọ a n'ike.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nnamdi 'Nwannekaenyi' Okwu Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.
Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.
Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.
Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.
N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.
Nnamdi Kanu kọwaa etu i si gbalarị Egwu Eke - Uwazuruike
Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.
Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum Naịjirịa na Nsukka.
A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.
Aha nne na nna Eze Israel Kanu, Ugoeze Nnenne Kanu. Ha bụ ndị Afara-Ukwu n'Umuahia, n'Abia steeti.
Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ. Nwụnye Nnamdi Kanu bụ Uchechi Okwu Kanu, ya na ụmụ ha bi na Yurope.
Nnamdi Kanu kwenyere na ma bụrụ onye ofufe 'Judaism'.









