Nnamdi Kanu: Onye ka ọ bụ?

Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kanu na uwe ndị Idoma

Ọtụtụ ndị mmadụ ma na Nnamdi Kanu bụ onye Isiama Afaraukwu, dị na Umuahia Nọt, isi obodo Abia Steeti.

Ha makwa na ọ bụ onye ndị mmadụ na-akpụkarị n'ọnụ n'ihi etu o si ama ndị nọ n'ọchịchị aka dịka ọ na-achọ nnwereonwe n'aka Naịjirịa.

Mana n'ime akụkọ a, ị ga-achọpụta onye ọ bụ n'ezie.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi 'Nwannekaenyi' Okwu Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum Naịjirịa na Nsukka.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Aha nne na nna Eze Israel Kanu, Ugoeze Nnenne Kanu. Ha bụ ndị Afara-Ukwu n'Umuahia, n'Abia steeti.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ. Nwụnye Nnamdi Kanu bụ Uchechi Okwu Kanu, ya na ụmụ ha bi na Yurope.

Nnamdi Kanu kwenyere na ma bụrụ onye ofufe 'Judaism'.

Lee ihe ndị ọzọ na-amasị Nnamdi Kanu ọtụtụ mmadụ amaghị maka ya:

Emmanuel Kanu bụ nwanne Nnamdi Kanu, gwara BBC Igbo maka ihe ndị na-amasị ya n'afọ 2018:

1) Nri Nnamdi Kanu hụrụanya karịa

Ofe Ụgụ

Ebe foto si, @ntanta.delicacies

Nwanne ya bụ Emmanuel Kanu gwara BBC Igbo na ofe a na-atọpụ Kanu isi.

O kwuru na: "Nri olulo na-adị ya mma ebe dị ukwuu. O na-eji ya eri ofe akwụkwọ nke eji ụgụ na ọkwụrụ sie, nke a na-etinye ụkpaka n'ime ya".

2) Onye egwu ọ hụrụ anya karịa

Phyno

Ebe foto si, @phynofino

BBC Igbo chọpụtara na Nnamdi Kanu hụrụ egwu Phyno n'anya nke ukwu.

Emmanuel kwuru na egwu ndị ọzọ ha tiri n'oge gara aga wuru ewu dịka egwu Osita Osadebe na nke Oriental Brothers na-eti egwu 'highlife', ha bụkwa ihe na-amasị Kanu nke ukwu.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

3) Nnamdi Kanu hụrụ otu bọọlụ Liverpool anya nke ukwuu

Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Emmanuel tiri mkpu aṅụrị oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ nke a.

O kwuru na: "Ọ naghị ekwete iri nri ọbụla maọbụrụ na otu Liverpool na-agba asọmpị ọbụla makana egwuregwu bọọlụ bụ ihe na-amasị ya nke uwku"

4) Nnamdi Kanu na-ekpu mmanwụ

Ndị kpuru Mmanwụ

Nwanne ya gwara BBC Igbo na Kanu na-ekpu mmanwụ a kpọrọ Ekpo.

N'ọnụ okwu ya: "N'oge iri ji ọhụrụ, Kanụ na-ekpu mmanwụ a kpọrọ Oke Isiekpe."

Ọ gara n'ihu kwuo na Kanu so na ndị wetere Ekpe n'ime obodo ha.

Aha onyonyo, Uchechi Kanu kwuru ihe di ya ji ego Ipob eme mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ n'afọ 2018

5) Uwe ndị obodo Idoma

Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Kanu na uwe ndị Idoma

Emmanuel kọwara na Kanu nwere nkwenye siri ezigbo ike na ya na ndị Idoma bụ otu.

O kwukwara na Kanu nwere ọtụtụ akwa ọcha na-amasị ya nke ukwu.

Emmanuel kwuru na: "Kanu nwere uwe ndị a makana o nwere nkwenye na Igbo niile bụ otu".

Nwụchi, ntọhapụ na nwụchi ya ọzọ

Gọọmentị Naịjiria nwụchiri Nnamdi Kanu n'ọnwa Ọktoba afọ 2015, jide ya ihe karịrị otu afọ tupu a tọhapụ ya n'ihe Bekee kpọrọ 'bail' n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ afọ 2017.

Kanu si Naịjiria gbapụ n'agbanyeghi na iwu e nyere ya machiri ya ime nke a. Ka ọ nọ mba ofesi ka ọ malitekwara ịgbasa ozi ya maka nnwereonwe Biafra n'ike n'ike n'elu soshal midia.

A hụrụ Nnamdi Kanu n'ihu ọha mbụ na mba Izrel, n'ụbọchị 22 nke ọnwa Ọktoba 2018, kemgbe e ji achọwa ya. Ihe nkiri bidoro fegharịwa na soshal midia ebe Nnamdi na-ekpe ekpere na mba ahụ.

Ụlọọrụ Facebook mechara machie ya iji ha agbasa ozi n'afọ 2021, mana o mepere aha ọzọ ji na-agbasa ozi ya na-aga n'ihu.

O hibere otu ndị nchekwa ọ kpọrọ Eastern Security Network (ESN), nke ọ sị bụ maka ichekwa mpaghara ala Igbo n'aka ndị ọchị ehi.

N'ọnwa Juun afọ 2021, gọọmentị Naijiria nwụchigharịrị Nnamdi Kanu ma si mba Kenya kpụlata ya Naịjiria ịbịa kpee ya ikpe.

Kemgbe ahụ, ọ pụtala n'ụlọikpe ugboro atọ gụnyere nke ọ pụtara n'abalị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.