Allen Onyema tụkwasịrị m asị - Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị mmadụ ka na-etinye ọnụ n'ihe dakwasịrị onyeisi ụlọọrụ ụgbọelu bụ Allen Onyema dịka mba Amerịka boro ya ebubo nrụrụaka.

Agbanyeghi na Maazị Onyema ekwuola na aka ya dị ọcha, Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ ka ekewa Naịjirịa akpọrọ Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) sị na ihe mere ya si ya n'aka.

Maazị Kanu kwuru okwu n'ụbọchị ụka bụ nke 25 nke ọnwa Nọvemba n'ime gbasaozi ọ na-ezigara ndị otu ya were sị na ọ bụ eziokwu na Maazị Onyema Bịafra be ya.

Ọ sị ọ bụ maka ikwu okwu banyere Naịjirịa ka Onyema jir bịa.

Aha onyonyo, Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche

"Maazị Onyema kwuru okwu banyere ihe nwereike iso atụmatụ kwara pụọ ndị ntoroọbịa Arewa kpụ n'ọnụ mgbe ahụ.

"Anyị kwuru maka ọtụtụ ihe mana otu ihe o chefuru bụ na a bụ m onye Biafra izizi, nke mere na agaghị m erinwu aka azụ."

Kanu gara n'ihu kwuo na Maazị Onyema sị na ya chọrọ ịhụ ka udo ga-adị ka aghara igbu ndị Igbo n'ugwu awụsa.

"A sị m ya ihe ọbụla ọchọrọ ime ya gaa n'ihu mee maka mu onwe m chọrọ udo."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Kanu sị na Onyema sị ka ya na ndị ya na ha so bịa see foto,.

"Asịghị m ha mba, maka dịka onye Igbo toro n'ụlọ, anyị anaghị asị ndị ọbịa anyị mba."

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Maazị Kanu kwuru maka ihe Maazị Onyema gwara BBC Igbo na mkaprịtaụka ha nwere. Ọ sị na ọ tụkwasara ya asị ma chuo ya ihu.

Mana, ihe Maazị Onyema kwuru na ya bụ mkparịtaụka bụ na Kanu nabatara ya na ndị ha na ya so mgbe ọ gara be ya.

Aha onyonyo, Ihe asatọ Allen Onyema sị na Igbo ga-ejide n’aka iji gaa n’ihu

Ọ kwukwara na Kanu nabatara atụmatụ udo ya jiri bịa ma kpọnye ya nwanne ya nwoke ka o soro ga njem mmụta etu a ga-eji hibe udo na Naijirịa.

Kanu agbaghaghi ihe Onyema kwuru na-abụghị ị sị na ọtụrụ asị.

Lee ihe Onyema kwuru na mkparịtaụka ahụ ebe a: Ihe 5 Allen Onyema gwara Nnamdi Kanu.

Lekwa ihe ndị ọzọ o kwuru na ya bụ mkaprịtaụka:

Kanu sị na ọ bụ okwu ya kwuru maka Allen Onyema mere ndị Amerịka ji nyochawa ha, mana ihe BBC ma maka ya bu okwu gosiri na ọ bụghị njem taa nke ojrii bụrụ nke ọnwa ole maọbụ ole.

Ọ sịkwa na Maazị Onyema mere ezigbote mmeghi n'itinye onwe ya n'ihe ọ sị ka ya aka.

"Onyema chọrọ ịmasị ndị Fulani site na-ịgwa ha na ya na Nnamdị Kanu nwere mkparịta ụka. Ọ bụ ezigbote mmeghi."

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu na BBC Igbo

Ọ sị na ihe mere Onyema bụ na ndị na-achụ ya mara na ndi Ipob agaghị akwụ onye katọro ha n'azụ.

Agbanyeghi ihe ndị a okwuru, Kanu gakwara n'ihu sị na ndị na-achụ Onyema adịghị achụ ọtụtụ ndị ọzọ ọ sị aka ha dị na nrụrụaka.

Cheta na mba Amerịka boro Maazị Onyema ebubo n'aka ya dị na mpụ na nrụruaka.

Maazi Onyema sị n'aka ya dị ọcha n'ebubo a niile a na-ebo ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, "Ego dị n'ịzụ ọkụkọ Bekee"