Ipob: Nnamdi Kanu kwetere ka m zụọ ndị otu ya

Onye nwe ụlọọrụ Air Peace bụ Allen Onyeama agwala BBC Igbo etu o si dozi nsogbu kwarapụ (quit notice) nke ndị Ugwu nyere ndị Igbo bi na be ha n'afọ 2017.
O jikwa ohere a wee kọọ ka o si kpọrọ Mohammed Danjuma (Onyeisi Arewa Transformation and Empowerment Initiative) gaa ị ga-kpe udo na be Nnamdi Kanu maka ya bụ kwarapụ.
- Onyema kwuru na ya na Danjuma natara ohere n'aka onyeisiala Muhammadu Buhari tupu ha agawa ị gwa Kanu ka o medalata obi.
- O kwurukwara na Kanu nabatara ha ma kwete ka ọ zụọ ndị otu ya makana ọ chọghị ka ndị otu ya were mkpari na-eso etu esi achọ ihe ha na-achọ.
- O kwuru na Nnamdi Kanu gwara ya na ọ hụrụ ka o si zụọ ndị nọ na Niger Delta, ma kwuo na ọ ga-anụrụ okwu ya bụ Onyema.
- Ọ gara n'ihu kwuo na Nnamdi Kanu kpọpụtara nwanne ya nwoke nke nta ka o nye aka chịkọta ndị Ipob maka ndị America ọ kpọtara ka ha nye ha ọzụzụ.
- Allen kwuru na ọ gaghị ekwucha ihe niile ya na Kanu kpara.
Lee ka ọ ha ya n'ọnụ ebe a
Ejidela otu na-agba mgbere nwa ọhụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na Legọs anwụchiela ụmụ nwaanyị abụọ na-ere nwa ọhụrụ na mpaghara Ejigbo na steeti ahụ.
Ha napụkwara ụmụ nwaanyị ahụ otu nwa nwoke ọhụrụ ma kuga ya n'ụlọọgwụ maka inyocha ya ahụ.
E nyere aha nwaanyị abụọ ahụ dịka Gift Michael na Florence Nkem Douglas.
Ha kọwara na ha na-ere ụmụ aka site na puku narị ise rue otu nde site maọbụ nwa nwoke ka nwa nwaanyị.
Ebe ọzọ na Naịjirịa

Mmadụ abụọ anwụọla ebe mmadụ isii ndị ọzọ merụrụ ahụ mgbe ndị omekome wakporo otu obodo di na Adamawa steeti
Ndị uweojii ekwuola na ọ bụ ndị ohi ehi kpara ya bụ mkpamkpa n'okpuruọchịchị Numan na steeti ahụ
N'ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ndị mmadụ na mba Ijipt emeela ngagharịiwe nke ụbọchị abụọ megide onyeisiala ha bu Abdul Fattah Al-Sisi nke ha sị ritue n'ọchịchị.
Ndị uweojii gbara ha anwụrụ anya mmiri iji chụsasịa ha ma nwụchie ụfọdụ n'ime ha.
Gee Nkeji ebe a
Soyinka akatọla gọọmenti etiti

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook/Getty Images
Ọ bụ ihe mere ede ji bee nwii dịka ode akwụkwọ a ma ama bụ Wole Soyinka chịrịla wunyere gọọmenti Naijịrịa.
Soyinka kwuru na ebubo ọhụrụ e boro onye nchịkọta 'RevolutionNow' bụ Omoyele Sowore metụtara imegide ọchịchị obodo, mpụ ego nakwa ihe ndị ọzọ adabaghị ma ncha.
O kwuru na agwa a yiri agwa onye isi kopuru ekopu.
Soyinka katọrọ ebubo a n'akwụkwọ ozi o degaara ụlọ mgbasaozi 'Channels' n'ụbọchị Satọde.
Cheta na ka Omoyele Sowore ka nọ n'aka ngalaba nchekwa Naịjirịa akpọrọ "Department of State Security" (DSS) kamgbe a nwụchiri ya ihe karịrị abalị iri anọ gara aga.
Gọọmenti etiti kpụpụrụ Sowore ụlọikpe ebe ha boro ya ebubo ruru asaa.
DSS sịbụ ka enye ha ohere ijide Sowore ruo abalị iri itoolu mana ụlọikpe nyere ha ohere ijide ya ruo abalị iri anọ n'ise.
Sowore bụ onyeisi ụlọọrụ mgbasa ozi 'Sahara Reporters' ma bụrụkwa onye ji ọkọlọtọ 'African Action Congress' wee zọọ oche onyeisiala na ntuliaka 2019.
'Mmeri Ihedioha sị n'aka Chineke' -Onye enyemaka ya

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook
Ọṅụ juru elu na ala n'Imo Steetị n'ụbọchị Satọdee dịka ụlọikpe ntuliaka weliri aka Emeka Ihedioha dịka onye tuuru ugo n'ezie na ntuliaka gọvanọ e mere n'ọnwa Maach afọ a.
Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka Ihedioha gwara BBC Igbo na mmeri a kwesiri ịbụ ohere mmadụ niile ga-eji bịakọta ọnụ ka e dozie Imo steeti.
Uche Nwosu, Ifeanyi Ararume na Hope Uzodimma bụ ndị wepụrụ okwu ntuliaka ahụ n'ụlọikpe na-arịọ ka a kagbuo mmeri Ihedioha.
Ha boro ebubo na mmeri Ihedioha dara iwu na-achịkọta mmeri ntuliaka na Naijirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ekwuola na ịkwalite ịdịkọnotu n'ime ndịiche bụ ụzọ kacha mfe Naịjiria ga-esi nweta ọganihu.
N'okwu ya na mahadum Osun steeti n'ụbọchị Satọdee, Osinbajo kwuru na ihe mmụta pụrụ iche juru na ndụ Nnamdi Azikiwe, Ahmadu Bello, na Obafemi Awolowo bụ ndị ndu Naịjiria n'oge gboo.
O kwuru na mmadụ atọ ndị ahụ si mpaghara dị icheiche mana ha na-ekwekọrịta mgbe ọbụla okwu maka Naịjirịa malitere.

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, Ọgbakọ mbaụwa bụ 'United Nations' anabatala atụmatụ udo nke ndị otu oyi egwu a kpọrọ Houthi Rebels na mba Iran wepụtara.
Ndị otu a na-ekwu na ha ga-akwụsi imebisi akụrụngwa e ji amịpụta mmanụ agbidi na Saụdi Arebia ma ọ bụrụ na mba Saudi kwụsị itụ ha ogbunigwe.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu David meriri Goliath ọzọ mgbe ndị otu bọọlụ Granad nke mba Spen ji ọkpụ goolu abụọ dụkpọọ ndị Barcelona anya n'abalị Satọdee.
Nwaafọ Naịjiria bụ Ramon Azeez so na ndị nyere goolu na asọmpi ahụ.
Lionel Messi na Suarez emenwughị ihe ọbụla iji zọpụta oyu ha bụ Barcelona.
Akụkọ ndị ga-amasị gị
Ihe nkiri ga-amasị gị:











