Sowore: Ụlọikpe enyela DSS ijide ya na mkpọrọ ha ruo abalị 45

Omoyele Sowore bụ onye ndu pati African Action Congress

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook

Nkọwa foto, Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja anabatala ekpere ngalaba nchekwa Naịjirịa akpọrọ "Department of State Security" (DSS) ka ha jide Omoyele Sowore ruo mgbe ha mechara nyocha ha.

Ka ikpe malitere taata, DSS wetere ihe nkiri gosiri Nnamdi Kanu na Sowore ebe ha na-eme nzukọ nakwa nke gosiri ebe ọ na-agwa ndị otu Shia ka ha sonyere atụmatụ Revolution Now iji kwatuo gọọmentị Naịjirịa.

Ọkaikpe Taiwo Taiwo sị - ka ọ nyochachara akaebe DSS nakwa ihe odidie ha wetere - na mkpụrụ okwu Bekee "May" ha tinyere gosiri usoro, nke mere o ji nye ha ohere ijide ruo Abalị 45 ahụ.

DSS sịbụ ka enye ha ohere ijide Sowore ruo abalị iri itoolu mana ụlọikpe nyere ohere abalị iri anọ n'ise.

Okwu a ga-alachite ụlọikpe n'ụbọchị 21 nke ọnwa Sepụtemba.

Cheta na Sowore hibere atụmatụ Revolution Now nke gọọmentị si na omegidere iwu ọha nke metụtara ịkpa nkata megide obodo.