Sowore: DSS ekwuola na ọ bụ ha nwuchiri ya n'ezie
Akụkọ dị mkpa:
DSS sị na ọ bụ ha ji Sowore

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook
Ụlọọrụ nchekwa DSS ekwuola n'eziokwu na ọ bụ ha nwụchiri Omoleye Sowore n'isi ụtụtụ Satọde abalị anọ nke ọnwa Ọgọstụ 2019.
Sowore bụ onye ji aha Pati African Action Congress zọọ ọkwa onyeisiala na 2019 ma na-achọ ịhazi ngagharịiwe a kpọrọ 'RevolutionNow'.
Ozi a si n'ọnụ onye na-ekwuru ụlọọrụ a bụ Peter Afunanya dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Abụja n'ụbọchị Sọnde.
Ọ sị na ọ bụ maka na Sowore na-achọ ime ngagharịiwe maka mgbanwe ọchịchị gọọmentị Naịjirịa dị ugbua.
Cheta na otu kpọrọ onwe ha Third Force Movement esiela ọnwụ na ngagharịiwe nke ha kwadoro ga-eme n'ụbọchị Monde ga aga n'ihu n'agbaneyghị na anwụchiri Omoyele Sowore so na ndị hibere ya.
N'otu aka ahụ otu na-elekọta ikike ruru ndị alakụba bụ MURIC n'aha ịchafụ kpọrọ oku ka DSS tọghapụ Sowore n'emetụghị ntutu dị ya n'isi aka
Nwoke ọzọ agbagbuola ndị mmadụ n'Amerịka

Ebe foto si, CBS NEWS
Otu nwoke ọzọ nọrọ n'ime otu nkeji gbagbuola mmadụ itoolu ma merụọ mmadụ iri abụọ na isii ahụ n'obod o Dayton, Ohio nke mba Amerịka.
Ndị uweojii sị ha gbagburu nwoke a ngwa ngwa ọ kpachara arụ a. Nke a ga-abụ ugboro abụọ a na-agbagbu ndị mmadụ n'Amerịka n'otu ụbọchị.

Ebe foto si, AFP
Mmadụ iri abụọ anwụọla ebe mmadụ iri abụọ na isii ọzọ merụrụ ahụ mgbe otu nwoke bu egbe wakporo ụlọahịa Walmart n'obodo El Paso na mba Amerịka.
Onyeisiala mba ahụ bụ Donald Trump akatọọla ya bụ ọdachi ma zigara ndị ọ metụtara ozi itiakan'obi.
Ndị uweojii na-arịọkwa ndị mmadụ ha gbata bịa nye ọbara maka ndị merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Manchester City a maburula Iko Community Shield dịka ha ji penariti ọkpụ ise asatara anọ merie Liverpool.
Iko a bụ nke Man City ji gbaa aka ahịa dịka ha na-akwado ịmalite asọmpi Premier League afọ ọhụrụ.
Nkeji:
"Ọnwu Fr Paul Offu jọgburu onwe ya" - Atiku
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Onye zọrọ ọchịchị ala Naịjirịa n'okpuru otu PDP bụ Atiku Abubaar akatọọla ogbugbu egburu Fada Paul Offu n'Enugwu steeti .
O jikwe ohere ahụ zigara ezinaụlọ ya nakwa ụlọụka Katọlịk na Naịjirịa ozi iti aka n'obi










