Thousand Oaks Shooting: Ekwuola aha onye ji egbe gbuo mmadụ 12 na California

Ụmụnwaanyị abụọ na-amakọ onwe ha ebe a egburu mmadụ

Ebe foto si, EPA

Nkwafụ ọbara enweghi isi na ọdụ ataala isi mmadụ iri na abụọ n'obodo California dị na mba Amerịka.

Ndị uweojii sị na ihe mgbawa obi a mere n'ebe a na-ere mmanya na mpaghara akpọrọ Thousand Oaks.

Ndị uweojii kwuru na onye mere ihe a bụ nwoke dị afọ 28 aha ya bụ Ian David Long.

Nkọwa ndị uweojii bụ na onye a nwere ihe a na-eche na ọ bụ isi mgbaka.

Onye a bụbụ onye agha Amerịka gburu onwe ya ka ọ kpachara ike a.

Ked etu ihe si mee?

Ndị uweojii sị na Long yi akwa ojii wakpoo ime ebe a na-ere mmanya ka ọ gbagbuchara onye nọ ọrụ nchekwa ebe ahụ.

Ndị mahadum nọ n'akụkụ na-agba egwu mgbe nwoke a tụrụ ihe Bekee kpọrọ "Smoke Grenade" tupu ọ gbanyewe egbe n'etiti igwe mmadụ.

ndi ntoroọbịa na ndi uweojii na Thousand Oaks

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ebe a egbụrụ mmadu bụ ebe ndị mmadụ na-anọkarị

Amerịka na iji egbe egbu mmadụ

Igbu mmadụ dị ka ewu ịta nri n'Amerịka bụ mba onye ọbụla tozuru etozu nwereike ibanye ahịa egbe goro ụdịrị egbe ọ chọrọ.

Ọtụtụ mmadụ, ọkachasị ndị otu pati Demokrat, chọrọ ka e mee ka ọrịa ahụ ndị isi mgbaka maọbụ ndị eji ajọ ntị ike mara, ghara iwe ohere metụ egbe aka, mana ọtụtụ ndị ọzọ achọghị nke a.

Ndị nọ n'isi ndị achọghị ka e nwee mgbochi ọbụla bụ ọtụtụ n'ime ndị otu pati Repọblịkan na ndị otu NR - bụ 'National Rifle Association', otu ndị hụru egbe n'anya.

N'ime izuụka abụọ gara aga, otu nwoke wakporo ebe a na-eme ihe Bekee kpọrọ "yoga" na Florida, ka onye ọzọ wakporo ụlọụka ndị ofufe Jew gbuo mmadụ iri na abụọ.

Akụkọ ga-amasị gị