Labour Strike: Ị dịla njikere?

Ebe foto si, AFP
Nigeria Labour Congress (NLC) na ndị ọrụ ụgbọala Tanka na ogbo ha na-ahụ maka ụgbọelu ahọrọla ụtụtụ ụbọchị 5, na ha ga-agba abụbọ-ọrụ echi bụ ụbọchị 6 n'ọnwa Nọvemba a.
Ha kwuru na ha ga-ebido abụbọ-ọrụ a ma ọ bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ihe ha na-ana ha.
Gịnị ka ha chọrọ?
NLC sị ka gọọmentị buliere ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruo N30,000, ebe gọmenti na-asị na ha ga-akwụ naanị N24,500.
Peter Ozo-Eson bụ odeakwụkwọ ukwu ndị NLC sị na onweghịzị ihe ọzọ ndị otu ha ga-ekwu banyere nke a, ọ gwụchaa ma a kpọrọ ha bịa tinye aka n'akwụkwọ maka inye ha ihe ha na-ana.
Ebe a ka ọ gbajuru dọrọ ugbua.
Ọtụtụ ndị ji ego amalitela igo nri na mmiri na-ebusa n'ụlọ ha iji kee nkwụcha maka ya bụ abụbọ-ọrụ na-abịa.
Kedụ ka ya bụ abụbọ-ọrụ ga-esi metụta gị?
- Ndị ji ụgbọala achụ ego agaghị agba n'ụzọ.
- Mmanụ petrolu agaghị adị. Nke pụtara na ndị ọzọ nwere ụgbọala nke ha agaghị ahụ mmanụ ha ga-eji gaa mkpa ya.
- Nri ga-akọ. Ọ bụrụ na ụgbọala agbaghị, onweghị etu a ga-esi buputa nri, mmiri na ihe ndị ọzọ n'ahịa ebe ndị mmadụ ga-egote ha.
- Ụlọakwụkwọ ga-emechi. Ebe ndị nkuzi so na ya bụ abụbọ-ọrụ, akwụkwọ agaghị adị.
- Ndị ọrụ mịnịstrị agaghị aga ọrụ. Nke a pụtara na o nwee ihe ị chọrọ ime n'ụlọọrụ ndị gọọmentị, chefuo ya.
- Ụgbọelụ agaghị agba. Nke a pụtara na njem ụgbọelụ agaghị enwe isi chacha.
- Ọkụ nyụọ, ndị mmadụ agaghị ahụ mmanụ ụgbọala ha ga-eji mụọ igwe ọkụ ha.







