Labour Strike: Ị dịla njikere?

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

Nigeria Labour Congress (NLC) na ndị ọrụ ụgbọala Tanka na ogbo ha na-ahụ maka ụgbọelu ahọrọla ụtụtụ ụbọchị 5, na ha ga-agba abụbọ-ọrụ echi bụ ụbọchị 6 n'ọnwa Nọvemba a.

Ha kwuru na ha ga-ebido abụbọ-ọrụ a ma ọ bụrụ na gọọmentị enyeghị ha ihe ha na-ana ha.

Gịnị ka ha chọrọ?

NLC sị ka gọọmentị buliere ha ụgwọ ọnwa opekatampe ruo N30,000, ebe gọmenti na-asị na ha ga-akwụ naanị N24,500.

Peter Ozo-Eson bụ odeakwụkwọ ukwu ndị NLC sị na onweghịzị ihe ọzọ ndị otu ha ga-ekwu banyere nke a, ọ gwụchaa ma a kpọrọ ha bịa tinye aka n'akwụkwọ maka inye ha ihe ha na-ana.

Ebe a ka ọ gbajuru dọrọ ugbua.

Ọtụtụ ndị ji ego amalitela igo nri na mmiri na-ebusa n'ụlọ ha iji kee nkwụcha maka ya bụ abụbọ-ọrụ na-abịa.

Ked ka ya bụ abụbọ-ọrụ ga-esi metta gị?

  • Ndị ji ụgbọala achụ ego agaghị agba n'ụzọ.
  • Mmanụ petrolu agaghị adị. Nke pụtara na ndị ọzọ nwere ụgbọala nke ha agaghị ahụ mmanụ ha ga-eji gaa mkpa ya.
  • Nri ga-akọ. Ọ bụrụ na ụgbọala agbaghị, onweghị etu a ga-esi buputa nri, mmiri na ihe ndị ọzọ n'ahịa ebe ndị mmadụ ga-egote ha.
  • Ụlọakwụkwọ ga-emechi. Ebe ndị nkuzi so na ya bụ abụbọ-ọrụ, akwụkwọ agaghị adị.
  • Ndị ọrụ mịnịstrị agaghị aga ọrụ. Nke a pụtara na o nwee ihe ị chọrọ ime n'ụlọọrụ ndị gọọmentị, chefuo ya.
  • Ụgbọelụ agaghị agba. Nke a pụtara na njem ụgbọelụ agaghị enwe isi chacha.
  • Ọkụ nyụọ, ndị mmadụ agaghị ahụ mmanụ ụgbọala ha ga-eji mụọ igwe ọkụ ha.

Akụkọ ga-amasị gị