Debe Odumegwu Ojukwu: Ihe ị kwesịrị ịma banyere ya

Ebe foto si, Voice of the East
Oru na Igbo bere oke akwa ụnyaahụ bụ Satọde mgbe akụkọ pụtara na Debe Sylvester Odumegwu Ojukwu bụ nwa nwa ọchịagha ndị Igbo bụ Dim Odumegwu Ojukwu nwụrụ.
Akụkọ kọrọ na ahụ siri ya ike ụbọchị Fraịdee rue mgbe shuga ya rịrị n'ike
Ihe ndị i kwesiri ịma banyere Debe Ojukwu

Ebe foto si, Voice of the East
- Debe Sylvester Ojukwu bụ ọkpara dike Biafra bụ Emeka Odumegwu Ojukwu.
- A mụrụ ya n'abalị atọ nke ọnwa Ọgọstụ afọ 1956.
- Ọ gara ụlọakwụkwọ St. Marys dị n'Uwani, Gọọmentị Sekọndịrị dị n'Afikpo, Mahadum ESUT dị n'Enugwu nakwa Madadum nke Naịjirịa dị na Nsukka.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onye Uweojii ma bụrụ kwa onye ọkaiwu.
- O so n'ime ndị uweojii mbụ Naịjirịa zụpụtara ma bụrụ onye uweojii mbụ nwetara ntụrụugo onyeisiala.
- Ọ nwụrụ n'abalị n'abalị abụọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2018 site n'ọrịa shuga dịka ọ gbara afọ ihe ruru afọ iri isii.
E bugara ya ụlọọgwụ na Legọs bụ ebe ọ nọrọ laa mmụọ.
Anyị nụkwara na mgbe adịghị anya ka akwụkwọ o ji lele ọbara ịjị mata ka ọ bụ nwa Ojukwu pụtara.
Ya bụ akwụkwọ gosiri na ya bụ dimkpa bụ ọbara dike Igbo n'ezie.
Osote Eze bụ okaikpe Obi Orizu kwuru na ọnwụ nwaamadị a bịara na mberede.
Ọrizu kwuru n'agbanyeghị na ihe gburu Debe edochabeghị anya, mana ọ dị mkpa onye ọbụla ị na-eme nnyocha ahụ kwamgbe kwamgbe."
Ojikwa ohere ahụ dụọ ndị be Ojukwu ọdụ ka ha biwe n'udo maka na "iwe anaghị eru n'ọnwụ".
N'aka ọzọ, Ugochukwu Udemezue bụ onyeisi Nnewi Town Union sị na ọ bụ Ọrịa shuga gburu Dede Ojukwu.
Udemezue gbara ama na onwere ka Dede is kwuo na ya nwere ọrịa Shuga n'izu gara aga.
Okwuru na Debe bụ nwa ha, na mgbe oge bịara onye ọbụla ga eso kwaa ya.











