Obiano ga-eme ụlọ agha Ojukwu ebe nkiri

Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ojukwu bidoro Biafra n'ọnwa May 1967

Gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano na-akwado ikwanyere dike Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ugwu n'ụzọ pụrụiche.

O kwuru na ọ ga-eme ụlọ dị n'okpuruala ebe Ojukwu nọ n'oge agha (bekee kpọrọ ya Bunker) nke dị na Amorka n'okpuruọchịchị obodo Ịhiala dị na steeti ahụ ebe ndị mmadụ ga na-abịa njem nkiri.

Obiano kwuru na ọ ga-emezi ya bụ ụlọ agha ka ọ dị mma maka njem nkiri.

O sị n'ọnụ onyeisi ndị na-ekwuputara ya okwu bụ James Eze, ka e mechara nzụkọ mgbasa ozi kwuo na gọọmentị ya ekwetala ịwepụta ebe nkiri dị icheiche n'Anambara.

Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ojukwu chiliri aka elu nye gọọmentị etiti na Jenụwarị 1970 ị ji kwụsị ọgụ Biafra.

Gọvanọ Obiano kpọpụtara ụfọdụ ebe ndị a dika Ọgba Ogbunike dị n'okpuru ọchịchị Oyi nakwa ọgbaukwu na nsụda mmiri dị n'obodo Owerre Ezukala dị n'okpuru ọchịchị Orumba Saụt.

Eze kwukwara na n'ime ụbọchị otu narị Gọvanọ obiano nọgoro n'ọchịchị, ọ ga-eme ihe pụrụiche n'ihe gbasara ebe nkiri ka steeti ya wee nwetacha uru dị na ya.

N'ọnụ ya, "anyị na-agba mbọ ịhụ na anyị webatara uche ndị mbaụwa niile n'ịhe mgbe gboo, ihe okwukwe na omenaala ndị Anambra steeti."

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ