Ụmụ Igbo chị ọkụ n'asompi Commonwealth na irite ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images
Agbanyeghị na ọ dịka ụkwụ mara ndị Naịjirịa gara egwuregwu Commonwealth jijiji na mbido, ụfọdụ n'ime ha na-awapụ ka ọnwa dịka ha nweterela Naịjirịa ọtụtụ ihe nrite n'egwuregwu ahụ.
Esther Oyema gbawara ndekọ ụwa wee weta nturuugo ya nke atọ n'egwuregwu ụmụnwaanyị ọlụsị na-ebuli ihe ike.
N'aka nke ọzọ, onye otu ya Roland Ezuruike tukwara ugo nke ya n'akụkụ nke ụmụnwoke.
Oyema buliri ihe dị kg131 were nweta akara 141.6 nke karịsịrị na ndekọ egwuregwu ahụ n'ụwa niile wee turuugo ọlaedo ebe nwanne ya bụ Lucy EJike nwetara ọla sịlịva.
Onye wetara ọlaedo nke atọ bụ nwafọ Igbo ọzọ bụ Ndidi Nwosu.
Mana na ngalaba ụmụnwoke, Ezuruike buliri ihe kg194 iji nweta akara 224.3, nke a ka o ji bulie ihe nrite sịlịva o nwetara na Glasgow rue ọlaedo.

Ebe foto si, Getty Images
Abdulazeez Ibrahim ritekwara ọlaedo ọzọ n'agba nke ikpeazụ ibuli ihe ike nke ụmụnwoke. O buru kg 220, nweta akara 191.9
Ndị na-echekwa ọlaedo ha dịka Paul Kehinde nwetara sịlịva.
Ihe Naịjirịa nwetarala bụ ọlaedo anọ na sịlịva anọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











