Akwasi Frimpong
- Afọ: Iri atọ na otu (31)
- Mba: Ghana
- Egwuregwu: Skeleton
Akwasi Frimpong malitere otu Bobsled na Skeleton Federation nke Ghana (BSF-Ghana) n’afọ 2016.
Frimpong na-agbabu ọsọ mana ahụ ọmerụrụ n’ụkwụ mere ya ka o bido mewe egwuregwu ọzọ.
Ọ na-ewe ihe ruru afọ anọ na isii iji bụrụ onye nwereike ịsọmpi ọfụma ma mụta egwuregwu a, maka na ọ na-aga ọsọọsọ nke ga-eme ka ọ raa ụbụrụ gị ahụ ichukwute ya
Sabrina Simader
- Afọ: Iri na itoolu (19)
- Mba: Kenya
- Egwuregwu: Alpine Skiing
Simader onye ezinaụlọ ya kwagara mba Austrịa oge ọ dị nanị afọ atọ, bụ onye mbụ ga-anọchite anya Kenya na wịnta olimpiks.
N’afọ 2016, ọnọchitere anya ndị mba East Africa na wịnta olimpiks nke ndị ntorobịa emere na Norway.
Ọdịrị mmetụta na-eso ịnọ n’elu ski, ịgasi ọdịrị ike ahụ, ọ dịka ikopula. Ahụ a na-akpalite gị, ọ dị ka i nwerela onwe gị. Ọ bụ oge gị
Mialitiana Clerc
- Afọ: Iri na isii (16)
- Mba: Madagascar
- Egwuregwu: Alpine Skiing
Mialitiana Clerc mụtara etu esi eme ski oge ọ dị afọ atọ, na mba France. Ọ gbara afọ iri na isii n’ụbọchị iri na isii nke ọnwa Nọvemba 2016, nke mere o ji bụrụ otu n’ime ndị kachasị na nwata n’asọmpi a.
Samir Azzimani
- Afọ: Iri anọ (40)
- Mba: Morocco
- Egwuregwu: Cross-Country Skiing
Samir Azzimani asọbuola mpi alpine skiing tupu ọ gafee cross-country skiing.
Adam Lamhamedi
- Afọ: Iri abụọ na abụọ (22)
- Mba: Morocco
- Egwuregwu: Alpine Skiing
Adam Lamhamedi bụ onye nwere agbụrụ na Morocco na Canada, mere ihe a na-agaghị echefu echefu oge ọ bụ onye Africa mbụ nwetere ihe nrite ọlaedo na wịnta olimpiks ndị ntorobịa emere na Austria n’afọ 2012.
Moriam Seun Adigun
- Afọ: Iri atọ na otu (31)
- Mba: Nigeria
- Egwuregwu: Bobsleigh
Seun Adigun malitere otu Bobsleigh mbụ nke Nigeria. Ọ bụ ọkwọụgbọ nke otu Nigeria.
Ọ nọchiburu anya Nigeria n’ịgbaọsọ 100m hurdles n’asọmpi sọma olimpiks emere n’London n’afọ 2012.
Ọ dị egwu... Enwetubeghị onye nọchitere anya Nigeria na wịnta olimpiks ya mere o ji eme ha obi ụtọ ịhụ ka ọ na-emezu.
Akuoma Omeoga
- Afọ: Iri abuọ na ise(25)
- Mba: Nigeria
- Egwuregwu: Bobsleigh
Akuoma bụ onye ‘brakewoman’ nke otu bobsleigh Nigeria nke mbụ.
Ọ na-arụkwa n’ebe a na-ewe n’ọrụ n’ihe gbasara ahụike.
Ngozi Onwumere
- Afọ: Iri abụọ na isii (26)
- Mba: Nigeria
- Egwuregwu: Bobsleigh
Ngozi Onwumere bụ ọgbaọsọ nọchiteburu anya Nigeria na egwuregwu ‘all African games’ emere na 2015.
Simidele Adeagbo
- Afọ: Iri atọ na isii (36)
- Mba: Nigeria
- Egwuregwu: Skeleton
Ka ọ rụchara afọ itoolu ọ hapụrụ asọmpi nke egwuregwu, Simidele Adeagbo nwetere mbuteuche n’aka ndị otu bobsleigh Nigeria wee kpebie ịbụ onye asọmpi skeleton.
Adeagbo bụ onye mbụ ga-esi Nigeria asọmpị egwuregwu a na wịnta olimpiks.
Connor Wilson
- Afọ: Iri abụọ na otu(21)
- Mba: South Africa
- Egwuregwu: Alpine skiing
Connor Wilson gụrụ akwụkwọ ịbụ dọkịta na-elekọta ụmụanụmanụ na Mahadum nke Vermont dị na mba America.
Mathilde-Amivi Petitjean
- Afọ: Iri abụọ na atọ (23)
- Mba: Togo
- Egwuregwu: Cross-Country Skiing
Mathilde-Amivi Petitjean bụbụ onye otu cross-country ski nta nke ndị mba France tupu ọ gafee ma bido ịnọchite anya Togo, mba ebe amụrụ ya.
Alessia Afi Dipol
- Afọ: Iri abụọ na abụọ (22)
- Mba: Togo
- Egwuregwu: Alpine Skiing
N’agbanyeghị na onweghị agbụrụ jikọrọ ya na Togo, Alessia Afi Dipol bụ onye amụrụ ma zụọ na mba Italy, họrọla ịnọchite anya mba West Africa a.
Ọ bu ụzọ nọchite anya Togo n’asọmpi egwuregwu a oge emere wịnta olimpiks n’Sochi n’afọ 2014.
Shannon-Ogbani Abeda
- Afọ: Iri abụọ na otu (21)
- Mba: Eritrea
- Egwuregwu: Alpine skiing
Abeda toro na Canada ma chọbuo ịbụ onye egwuregwu họkị, mana nne na nna ya chere na ime ski ga-akara ya mma.
Ọ bụ onye mbụ ga-anọchite anya Eritrea na winta olimpiks.
Amam na ọ bụghị ihe na-eme oge ọbụla na onye dịka m si Eritrea nwereike ịbụ onye na-eme ski, mana ndị Eritrea ma etu esi ahụ mba ha n’anya. Ha hụ onye na-anọchite Eritrea n’anya ọma, ọ na-eme ha obi aṅụrị
Ebe e si nweta foto:
Matthias Hangst/Getty Images, Dimitar Dilkoff/AFP/Getty Images, Francois Xavier Marit/AFP/Getty Images, Shaun Botterill/Getty Images, Christophe Pallot/Agence Zoom/Getty Images, Alexander Hassenstein/Getty Images, ALEXANDER KLEIN/AFP/Getty Images, Dean Mouhtaropoulos/Getty Images, Courtney Hoffos