Ụmụ Sir Louis Ojukwu nọ n'ụlọikpe maka akụnaụba ya

Ebe foto si, Getty Images
Esemokwu na-ada n'ime ezinaụlọ Sir Louis Odumegwu Ojukwu ewelitela isi ọzọ.
Ụnyaahụ bụ Orie, n'ụlọ ikpe Ọka, nke dị n'Anambra Steetị ka ya bụ ikpe bidoro n'afọ 2014 malitere ọzọ.
Ikpe ahụ nke Okaikpe Dennis Mmaduechesi nọ n'isi ya gosiri na ụmụnne Dim Odumegwu Ojukwu na-azọ akụnaụba nna ha bụ Sir Louis Odumegwu Ojukwu.
Ikemefuna Ojukwu na Chukwuma Ojukwu bụ ụmụnne Dim Chukwuema Ojukwu kpụpụrụ nwanne nna ha bụ Joseph Ojukwu, Ike Ojukwu, Lotana Ojukwu nakwa Bianca Ojukwu bụ nwunye Dim Odumegwu Ojukwu ụlọikpe.
Gịnị ka Ikemefuna na Chukwuma na-azọ?
Ha na-arịọ ụlọikpe ka e kenye ha pasentị iri abụọ na ise (25%) n'ụlọ nna ha dị na 73 owerri road, Nnewi.
Ha na arịọkwa ụlọikpe ahụ ka e kenye ha pasentị iri abụọ na ise (25%) nke ụlọọrụ ụgboala nna ha bụ Ojukwu Transport Company.

Ebe foto si, AFP
Ha rịọrọ ụlọikpe ka e mee ka ndị ahụ eboro ebubo bịa kọwaa ka ha na akụnaụba nna ha siri gaa kamgbe ọ nwụrụ.
Ọ bụkwa mkpesa ha kpesara ụlọikpe ahụ mere ka ndị ahụ wepụta akwụkwọ nna ha jiri kee akụnaụba ya tụpụ ọnwụọ.
Akụkọ kwuru na ndị nọchitere anya Joeseph bụ Okwuchukwu Ugolo (SAN), ebe Ebuka Ogwu na Christopher Ezeoka nọchitere anya Lotanna Ojukwu nakwa Ojukwu Transport Company.
Dịka ihe siri gaa unyaahụ, o doro anya na ndị biara ya bụ ikpe akwadochaghị nke ọma.
Maka nke a, ọkaikpe ukwu na-ahụ maka ya bụ ikpe bụ Dennis Mmadụechesi yigharịrị ya bụ ikpe iji nye ohere ka onye ọbụla kwado nke ọma.
Mana akwụkwọ akụkọ e kwekọrịtaghị n'ụbọchị e yigharịrị ya bụ ikpe.
Chetanụ na Dim Odumegwu Ojukwu hapụrụ tigbuo zọgbuo sochiri ya azu maka ndọrọndọro akụnaụba nna kemgbe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











