'Anyị na-enyocha onye nwe ngwa agha a'- Kọstọm

Ọdọ ụgbọmmiri Lagos ebe ejichiri ngwa agha a

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọdọ ụgbọmmiri Lagos ebe ejichiri ngwa agha a

Joseph Attah bụ onye na-ekwuchitere ndị Kọstọm sị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ha jichiri n'ọdọ ụgbọ mmiri Lagos.

Ọ gwara BBC n'elu ekwentị na ha achọpụtala onye bubatara ya bụ ngwa agha ma sị ya jee weta akwụkwọ dị mkpa akpọrọ 'End-User Certificate.'

Ha nyere ya ụbọchị ịrị atọ iji weta akwụkwọ ahụ n'aka ụlọọrụ na ahụ maka nchekwa n'ala niile bụ 'National Security Adviser' n'olu bekee tupu enyeghachi ya ngwa ya.

Ka BBC gbara ya ajụjụọnụ, Attah kwuru n'onwebeghị ihe gosiri na ọ bụ gọọmnetị Kogi steeti tụbatara ahịa ahụ ka onye ọrụ sineti Dino Melaye si kwuo.

Foto na-egosi mgbo

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mgbọ n'ọtụtụ ngwa ndị agha so n'ihe ejichiri

Ihe butere okwu a bụ ebubo Sinatọ Dino Melaye boro onye na-achị Kogi steeti bụ Yahaya Bello bụ ya bubatara ngwa agha ahụ.

Ọ sị na otu onye enyemaka Bello maka ihe gbasara nchekwa bụ Jerry Omadara gara n'ụlọọrụ ndị Kọstọm mgbe ọ pụtara ihe na ha jichiri ngwa agha ahụ were gwa ha na ọ bụ ndị Kogi nwe ngwa agha ahụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ