Benue: Njem Buhari a adighị ka nke Plateau

Ebe foto si, AFP
Onyeisiala Buhari mere njem na Benue steeti maka isoro ha rue ụjụ maka ndị nwụrụ n'ọgbaghara ndị ọchịehi na ndị ọrụugbo.
Mana nnabata ya adịghị ka mgbe ọ gara Plateau steeti dịka okporoụzọ niile tọgbọ chakoo ka onyeisiala bịara n'obodo ahụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ a pụtaghị bia zute ya.
N'okwu ya o kwuru na mwakpo na-emekarị na Benue bụ ihe na-eme gọọment obi ọjọọ, ma kwe nkwa na gọọment ga akwụsi ya.
"Agaghị m eleghara gbuogbuogbuo na-eme na Benue n'akụkụ Naijria ndị ọzọ.mwakpo na-emekarị na Benue na eme m obi ọjọọ. Anyị na-agba mbọ ime ihe niile iji kwụsị ya."
Ka akụkọ a na-apụta, ndị Miyetti Allah ji ohere ahụ na-arịọ mgbaghara maka ihe mere n'etiti ha na ndị ọrụụgbo n'obodo dị iche iche na Benue steeti.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta n'ịzụka iri garaga n'ime obodo Logo na Guma ndị ji egbe ha ana-ebo na ha bụ ndị ọchịehi gburu ọtụtụ ndị ọrụụgbo n'ime obodo di iche iche na Benue steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






