Benue a kagbuola ịjị otu afọ efe Naịjirịa a na-kpo NYSC

Ebe foto si, Getty Images
Otu Gọọmenti etiti guzobere na achikaọta ịjị otu afọ efe ala nna akagbuola agbata nke bụ n'ihi nsogbu a na-ada na ya bụ obodo Benue.
Ha kwuru na ụbọchị ọhụrụ a ga-eji mee mmemme bụ nke ha ga-ekwupụta ma ekwekorita na ya.
Gọọmenti etịtị gwakwara ndị niile nke a metụtara ka ha nwee ndidi chere obere oge ka a hazie otu ha ga-esi nweta ya bụ ọzụzụ na enweghi nsogbu ọbụla.
Cheta na ndị ọchụ ehi na ndị ọkọ ugbo na-enwe nghọtaghịonwe na Benue, nke butere igbu mmadụ na imebisi ihe ndị mmadụ na steetị ahụ.
Anyị ga-ewetakwuru ụnụ akụkọ maka ihe a mgbe anyị nwetela ya.





