Nigerian Army couple beheading: IPOB/ESN anaghị echekwa ndị Igbo - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, AFP- Linus Audu
Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agọọla na aka ha adịghị n'ogbugbu e gburu ma bepụ ndịagha abụọ isi n'Imo Steeti na nso nso a.
E gburu ma bepu Linus Audu bụ onye agha lara ezumike nka na nwaanyị ya bụkwa onye agha (Private) bụ Gloria Matthew isi, dịka ha na-aga ịgba nkwụ ha n'Imo steeti, n'ụbọchị Satọde 30 Eprel 2022.
Dịka Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ maka ndị mere ihe a, ndị agha Naijiria wepụtara ozu wee na-ebo ebubo na ọ bụ Ipob na ESN gburu ndị ndịa.
Mana n'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu Ipob bụ Emma Powerful binyere ma wepụta n'ụbọchị Wenezde, out ahụ kwuru na ọ bụ "ihe na-atọ ọchị" ebubo ndị agha Naijiria na-ebo ha.
Ipob kwuru na ọ bụ arụ megidere omenala Igbo igbu nwada maọbụ ọgọ.
" Anyị chọrọ ikwu ya gbowam na aka Ipob adịghị n'ụdị ajọ ihe nke bụ arụ n'omenala Igbo".
O kwuru sị, " tupu ndị agha amapụta kwuo na ọ bụ ndị Ipob mere arụ ahụ, kedụ nchọpụta ha mere iji kwado ihe ha kwuru."
" Oge ndị bu egbe maọbụ ndị omekome nke ndị ajọ ndọrọndọrọ ọchịchị kpara nkata ha na ndị ọrụ nchekwa chọrọ inye Ipob ajọ aha.
" Ndị agha Naijiria hapụnụ Ipob aka, anyị abụghị ndị o bu egbe. "
Ha kwuru na "ebubo ọhụrụ a bụ ozi ụgha ha na-ezisasị iji mebie ezi aha Ipob nwere n'ụwa mana ụwa maara na ha na-atụ asị."
Ha gara n'ihu na-ebo ebubo na ndị omekome Fulani na ndị oyindu egwu na-akpagharị na -egbusị ndị mmadụ ọkachasị na Kaduna na Plateau Steeti. O nweghi ihe e mere ha mana ha abịa n'Ọwụwa Anyanwụ na-egosi ike ha ebe ndị Ipob na ndị nkiti bi"
IPOB/ESN anaghị echekwa ndị Igbo - Ndịagha Naịjirịa - Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Audu M Linus/ Gloria Matthew
Ndịagha Naịjirịa akatọọla ogbugbu ha sị na ndị otu ndị IPOB/ESN gburu ndị ndị otu ha abụọ gara ịgbankwụ ha n'Imo Steetị na nsonso a, sị na agwa ahụ gosiri na ndị otu Ipob anaghị echekwa ndị Igbo.
Indigenous People of Biafra (Ipob) na alaka ọgụ ha bụ Eastern Security Network (ESN) bụ otu na-agba mbọ ka e kewapụta mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie na Naịjiria ka ọ bụrụ ebe a ma dịka Biafra.
Ndị bu egbe gbagburu Linus Audu, onyeagha lara ezumike nka na nwaanyị ya bụkwa onye agha(private) bụ Gloria Matthew, onye Ọkpuru Ọchịchị Nkwerre n'Imo steeti, ka ha na-aga ịgba nkwụ onwe ha n'Imo steeti, n'ụbọchị Satọde 30 Eprel 2022.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Onyema Nwachukwu wepụtara n'ụbọchị Tuzde, o kwuru na ọ bụ ihe mgbagwojuanya igbu onyeagha nke nwaanyị n'agbanyeghị na ọ bụ onye si Ọwụwa Anyanwụ.
"Na Gloria Matthew, onye bụ onye Okpuru Ọchịchị Nkwere Imo Steeti si n'Ọwụwa Anynawnụ emetụghị ndị omekome a aka n'obi ịhapụ ya."
"Arụ a a kpara, dịka ndị ọzọ yiri ya, gosiri oke akpọmasị, nnụpụ isi n'iwu na egwu otu Ipob na-eyizi ndị Igbo bụ ndị ha sị na ha na-echekwa ma bịa ịgbapụta maọbụ ndị Naijiria ndị ọzọ aka ha dị ọcha na-agafe Ọwụwa Anyanwụ."
"Ọgbụgbụ a nke ha emereghị ọbụladị nwa ha ebere, gọsịrị ka obi ọjọọ ha, mmụọ enweghị nchegharị na arụ 'iyi ndụ egwu nke IPOB/ESN na-akpa."
Kedụ ka o si mee?
Nwachukwu sị na nke a mere mgbe ha na-aga n'obodo Gloria bụ Nkwere dị n'Imo Steetị ịga kwụọ ụgwọ isi ya dịka omenala Igbo siri dị.
N'ọnụ okwu ya, "Anyị natara ozi gbasara etu ndị IPOB na ndị ọgụ ga bụ Eastern Security Network si gbuo ndịagha anyị abụọ ma hapụ ha n'ime ọbara ha mgbe ha na-eme njem ị ga gbaa nkwụ ha."

Ebe foto si, Getty Images
Ọ sị na ndị IPOB/ESN eleghi anya na Gloria bụ nwanne ha nwaanyị mana ha gara n'ihu gbuo ya na di ya.
Ọ sị na arụ a ndị IPOB na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ gosiri ihe ọjọọ niile ha na-eme megide ndị mmadụ ha sị na ha chọrọ ichekwa nakwa ndị ọzọ na-eme njem aga na mpaghara ahụ.
"Ihe a jọgburu onwe ya, ndịagha Naịjirịa amalitela nyocha ịchọpụta etu na ndị kpara mkpa mkpa a ma taa ha ahụhụ dịrị ha." bụ ihe Nwachukwu depụtara.
BBC Igbo ezigarala ọnụ na-ekwuru IPOB bụ Emma Powerful ka o tinye ọnụ n'okwu a, mana o nyebeghị anyị ọsịsa dịka akụkọ a na-apụta.
Ihe a merenụ na-abịa dịka anụchara akụkọ na ndị omekome wakporo ebe ndị uweojii na-anọ n'Agulu dị n'okpuruọchịchị Anaocha, Anambra steeti n'ụbọchị Satọde bụ April 30, 2022.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ọ natazubeghị ozi ihe mere ebe ahụ kpọmkwem.
Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

Ebe foto si, Screen grab
Etu ndị ntaakụkọ ndị ọzọ si kọọ akụkọ a n'elu soshal midia
Akụkọ na-ewu na soshal midia kwuru na ọ bụ mgbe ndị agha abụọ Naịjirịa na-aga Imo steeti ị gaa mee agbamakwụkwọ ha, ka ndị omekome ahụ jidere ha, gbaa ha egbe ma bepu ha isi.
Akụkọ ahụ kwuru na ndị omekome ahụ wakporo onye agha nke nwaanyị tupu ha bepụ ya isi.
Ndị omekome ahụ were ekwenti ha kpọwa ndị bee ha, ma na-agwa ha na ha bụ ndị omekome ememilana ndị agha abụọ bụ ndị bee ha.
Mkparịtaụka ebe ndị ahụ si na bụ unknown gunmen nakwa otu nwaanyị bụ ọyị onye agha nke nwaanyị na-akpa gbakwara na soshal midia, nke anyị ka na-enyo ka anyị mara ebe o si, mana ihe ndị ekwuru n'ime ya yitere ihe a merenụ.
Kedụ ka okwu "unuknown gunmen" si malite
Cheta na oke ogbugbu mmadụ arị erị elu kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
Nke a na-eso nhiwe otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob hiwere alaka ọgụ ha a kpọrọ Eastern Security Network n'ọnwa Disemba afọ 2020.
Ha kwuru na ESN bụ maka ihe ha kpọrọ "ibu agha megide ndị ọchịehi" ha kwuru ma egbusisi ndị mmadụ, na-awakpo ụmụnwaanyị n'Ọwụwa Anyanwụ.
Kemgbe ahụ, e gbuola ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị uweojii, ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị Igbo welitere isi.
Ndị ọrụ nchekwa na-ebo ndị Ipob na alaka ọgụ ha bụ ESN ebubo aka ha ịdị na tigbuo-zọgbu na-akpọtụ n'Ọwụịwa Anyanwụ.
Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.









