Etu ndị 'unknown gunmen' si gbuo ụmụnne abụọ, onye uweojii na onye ndị ọzọ n'Ozubulu,Ukpor

Ebe foto si, Screengrab/Getty images
Ndị uweojii Anambra steeti ekwuola na ha na-enyocha ogbugbu e gburu mmadụ anọ gụnyere otu onye uweojii n'Ozubulu nakwa Ukpor dị na steeti ahụ, n'ụbọchị Monde.
Nke a na-abịa dịka ọ gachara otu abalị ndị omekome wakporo Agulu na Osumenyi dịkwa n'Anambra steeti ebe ha gburu ọtụtụ ndị mmadụ.
Mmadụ abụọ n'ime ndị e gburu bụ ụmụnne abụọ Godwin Ikechukwu Modobi na Nnajiofor Modobi bụ ndị Ukpor dị na Nnewi South.
Akụkọ kwuru na ndị omekome wakporo ndị Modobi n'ụlọ ha, gbuo Godwin Modobi ma kpụrụ Nnajiofor pụọ.
E mechara hụụ ozu Nnajiofor ebe ha tọgbọrọ ya n'Utuh Junction.
N'aka nke ọzọ, e gburu mmadụ abụọ ndị ọzọ n'okporoụzọ Udorji dị n'Ozubulu.
Otu onye Ozubulu a chọghị ka a kpọọ aha ya gwara BBC sị, "Anyị tetara n'ụra n'ụtụtụ nụ na e gburu mmadụ abụọ n'okporoụzọ Udorji dị nso na St Mary's Anglican Church, Ozubulu."
"Ndị uweojii mechara bịa buru ozu ha."
Ihe ndị uweojii kwuru
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga, onye gwara BBC Igbo n'ekwentị n'ụbọchị Tuzde na ọdachi ahụ mere n'ezie kwuru na 'ndị bu egbe "gburu Inspector Benjamin Ejeh nke na-arụ ọrụ ebe e nwere okporọ mmanụ n'Ụtụ".
Ọ sịrị:" Ejeh so na ndị uweojii na-ebu agha megide ndị ohi mmanụ agbidi"
"Ya na onye ọrụ anyị ọzọ nọ n'ụzọ oge ha zutere ndị omekome a ebe na-akpa ike, ha gbagbuo ha mana onye nke ọzọ gbapụrụ ọsọ ndụ."
Tigbuo-zọgbuo na-arị elu n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria kemgbe ọnwa Jenụwarị afọ 2021 dịka ndị omekome malitere ịwakpo ogige ndị uweojii, na-egbusị ha nakwa ndị ọrụ nchekwa.
Ha na-awakpokwa ndị ọrụ gọọmentị na ọtụtụ ndị Igbo nwere agba.
Ndị ọrụ nchekwa boro otu Ipob na ngalaba nchekwa ha bụ Easter Security Network ebubo na aka ha dị n'ịchọ aka ọbara ndị a.
Mana otu Ipob agọọla ugboro ugboro na ha amaghị maka n'ọnọdụ nchekwa ọjọọ ndị a nakwa mwakpo ogige ndị uweojii.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Etu emume ụzọ iyi nke Uke n'Anambara steeti nke afọ 2022 si chakee
- Etu Chinedu Bernard, Chima Precious ndị ejije Nollywood si laa mụọ
- Ọrịa ise ị nwereike ibute maọbụrụ na gị na anụmanụ nwee aramara
- Yul Edochie second wife: 'Anyị gwara Yul alụla nwaanyị nke abụọ mana o kweghị' - Uche Edochie, nwanne Yul









